Read Matiu Chapter 23 Online
Read Matiu Chapter 23 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Matiu and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Matiu 23
Isi 23
1. Mb͕e ahu Jisus gwara ìgwè madu nile na ndi nēso uzọ-Ya okwu,
2. si, N'oche Moses ka ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nọduru:
3. ya mere, ihe nile, ka ha ra, bú nke ha gāsi unu me, menu ihe ndia, debe kwa ha: ma unu emela dika ọlu nile ha si di; n'ihi na ha nēkwu, ma ha adighi-eme.
4. Ma ha nēke ibu di arọ́ di kwa ike obubu, tukwasi ha n'ubu madu; ma ha onwe-ha achọghi iji otù nkpisi-aka-ha wezuga ha.
5. Ma ọlu-ha nile ka ha nālu ka madu we kiri ha: n'ihi na ha nēme ka phylactery nile ha di obosara, me kwa ka ọnu-ọnu uwe-ha di uku,
6. ha nāhu kwa isi ọnọdu nile n'oriri nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ-unu,
7. na ekele n'ọma-ahia nile unu, na ka madu nākpọ ha, Rabai.
8. Ma ka aghara ikpọ unu onwe-unu, Rabai: n'ihi na otù Onye bu Onye-ozizí-unu, ma unu onwe-unu nile bu umu-nna.
9. Unu akpọ-kwa-la onye ọ bula nna-unu n'elu uwa: n'ihi na otù Onye bu Nna-unu, Ya bu Onye nke elu-igwe.
10. Ka aghara kwa ikpọ unu ndi-ndú, n'ihi na otù Onye bu Onye-ndú-unu, Ya bu Kraist ahu.
11. Ma onye dikariri uku n'etiti unu gābu onye nējere unu ozi.
12. Ma onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe-ya, agēweli ya elu.
13. Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.
14. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu unu: unu gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara okè kari ndi ọzọ.
15. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nējeghari n'oké osimiri na ala kpọrọ nku buruburu ka unu me otù onye ka o so uzọ-unu; ma mb͕e ọ ghọrọ otú ahu, unu nēme ya okpukpu abua nwa ọku ala-mọ kari onwe-unu.
16. Ahuhu gādiri unu, ndi-ndú ìsì, ndi si, Onye ọ bula nke gēji ulo nsọ Chineke ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ọla-edo nke ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ugwọ.
17. Ndi-nzuzu na ndi-ìsì: n'ihi na òle nke dikariri uku, ọla-edo ahu, ma-ọbu ulo nsọ nke doro ọla-edo ahu nsọ?
18. Unu si kwa, Onye ọ bula nke gēji ebe-ichu-àjà ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ihe-onyinye di n'elu ya ṅu iyí, o ji ugwọ.
19. Ndi-ìsì: n'ihi na òle nke ka uku, ihe-onyinye, ma-ọbu ebe-ichu-àjà nke nēdo ihe-onyinye ahu nsọ?
20. Ya mere, onye ji ebe-ichu-àjà ahu ṅu iyí, o ji ya, na ihe nile di n'elu ya, ṅu iyí.
21. Onye ji kwa ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ya, na Onye bi nime ya, ṅu iyí.
22. Onye ji kwa elu-igwe ṅu iyí, o ji oche-eze Chineke, na Onye nọduru n'elu ya, ṅu iyí.
23. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ na anise na cummin, unu arapuwo kwa ihe ka arọ́ n'iwu, bú ikpé, na ebere, na okwukwe: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.
24. Ndi-ndú ìsì, ndi nāzapu anwu ntà, ma unu nēloda camel.
25. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēme ka azu iko na afere di ọcha, ma n'ime ha juputara site n'ipunara madu ihe na ejideghi-onwe-unu.
26. Gi Farisi kpuru ìsì, buru uzọ me ka ime iko na afere di ọcha, ka azu-ha we ghọ kwa ọcha.
27. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu yiri ili eteworo nzu, nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n'ìhè, ma n'ime ha juputara n'ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adighi-ọcha nile.
28. Otú a unu onwe-unu nēgosi kwa onwe-unu nye madu n'ìhè dika ndi ezi omume, ma n'ime unu juputara n'iru-abua na ihe nēmebi iwu.
29. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēwu ílì ndi-amuma, nēdozi kwa ebe anēlì ndi ezi omume,
30. unu nāsi kwa, Ọ buru na ayi nọri n'ubọchi nna-ayi-hà, ayi agaghi-eso ha n'inwekọ ọbara ndi-amuma.
31. Ya mere unu nāb͕a àmà megide onwe-unu, na unu bu umu nke ndi b͕uru ndi-amuma.
32. Unu onwe-unu mezu kwa ihe-ọtùtù nke nna-unu-hà.
33. Unu agwọ, unu aju-ala, ùnu gēsi aṅa b͕anari ikpé nke ọku ala-mọ?
34. N'ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēb͕u, kpọgide kwa ha n'obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n'ulo-nzukọ-unu, si kwa n'otù obodo nēsob͕u ha ga obodo ọzọ:
35. ka ọbara ndi ezi omume nile awusiworo n'elu uwa we biakwasi unu, site n'ọbara Ebel onye ezi omume ahu rue ọbara Zakaraia nwa Barakaia, onye unu b͕uru n'ab͕ata ulo nsọ na ebe-ichu-àjà-unu.
36. N'ezie asim unu, ihe ndia nile gābiakwasi ọb͕ọ a.
37. Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!
38. Le, anārapuru unu ulo-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu.
39. N'ihi na asim unu, Unu agaghi-ahum ọzọ site n'ub͕u a ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi.
About Matiu Chapter 23
Read Matiu Chapter 23 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Matiu
Chapter: 23
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Matiu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Matiu Chapter 23 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Matiu Chapter 23?
Matiu Chapter 23 is part of the Book of Matiu in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Matiu Chapter 23 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Nkpugh Chapter 4
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 6
- Nkpugh Chapter 7
Explore More from matiu
- Matiu Chapter 16
- Matiu Chapter 9
- Matiu Chapter 7
- Matiu Chapter 12
- Matiu Chapter 19
- Matiu Chapter 10
- Matiu Chapter 2