Read Jenesis Chapter 13 Online
Read Jenesis Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jenesis and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Jenesis 13
Isi 13
1. Abram we si n'Ijipt rigo, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na ihe nile ọ nwere, na Lot tiyere ya, rue Negeb.
2. Abram bu kwa ọgaranya nke-uku n'anu-ulo na n'ọla-ọcha, na n'ọla-edo.
3. O si na Negeb je na nbuli-ije-ya we rue Bet-el, rue ebe ahu ebe ulo-ikwū-ya diri site na nmalite, n'etiti Bet-el na Ai;
4. rue ọnọdu nke ebe-ichu-aja ahu nke ọ mereri n'ebe ahu na mbu: Abram we kpọkue aha Jehova n'ebe ahu.
5. Ọzọ kwa, Lot, onye ya na Abram nāyikọ je, ọ nwere igwè ewu na aturu, na igwè ehi, na ọtutu ulo-ikwū.
6. Ala ahu anagideghi ha, ibikọ n'otù: n'ihi na àkù-ha riri nne, ha apughi kwa ibikọ n'otù.
7. Ise-okwu we di n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo Abram na ndi-ọzùzù anu-ulo Lot: ndi Kenean na ndi-Perizait nēbi kwa n'ala ahu mb͕e ahu.
8. Abram we si Lot, Biko, ka ise-okwu ghara idi n'etiti mu na gi, na n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo nkem na ndi-ọzùzù anu-ulo nke gi; n'ihi na nwa-nne ka ayi bu.
9. Ala nka nile, ọ̀ dighi n'iru gi? biko, kewapu onwe-gi n'arum: ọ buru aka-ekpe, m'gēje kwa n'aka-nri: ma ọ buru aka-nri, m'gēje kwa n'aka-ekpe.
10. Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.
11. Lot we rọputara onwe-ya Gburugburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije je n'Iru-anyanwu: ha we kewapu onwe-ha otù n'aru nwa-nne-ya.
12. Abram biri n'ala kenean, ma Lot biri n'obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm.
13. Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku.
14. Ma Jehova siri Abram, mb͕e Lot kewapusiri onwe-ya n'ebe ọ nọ, Biko, welie anya-gi abua, si n'ọnọdu a, ebe gi onwe-gi nọ, le anya n'Ugwu na na Ndida na n'Iru-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu:
15. n'ihi na ala nka nile nke gi onwe-gi nāhu anya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi.
16. M'gēme kwa ka nkpuru-gi di ka ájá nke ala: ya bu na, ọ buru na madu puru iguta ájá nke ala, agāguta kwa nkpuru-gi.
17. Bilie, jegharia n'ala nka n'ogologo-ya na n'obosara-ya; n'ihi na gi ka M'gēnye ya.
18. Abram we ropu ulo-ikwū-ya, bia biri n'etiti osisi terebinth nke Mamre, nke di nime Hebron, o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu.
About Jenesis Chapter 13
Read Jenesis Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Jenesis
Chapter: 13
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jenesis. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Jenesis Chapter 13 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Jenesis Chapter 13?
Jenesis Chapter 13 is part of the Book of Jenesis in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Jenesis Chapter 13 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Emos Chapter 1
- Ilu Chapter 12
- Eklisiastis Chapter 2
- Ilu Chapter 1
Explore More from Jenesis
- Jenesis Chapter 37
- Jenesis Chapter 16
- Jenesis Chapter 5
- Jenesis Chapter 20
- Jenesis Chapter 25
- Jenesis Chapter 43
- Jenesis Chapter 48