Jenesis Chapter 37

For English

Read Jenesis Chapter 37 Online

Read Jenesis Chapter 37 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jenesis and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Jenesis 37

Isi 37

1. And Jekob we biri n'ala ọnọdu-ọbìa nile nke nna-ya, n'ala Kenean. 2 Ndia bu osuso-ọmumu Jekob. Mb͕e Josef b͕ara arọ iri na asa, ọ nāzù ìgwè ewu na aturu, ya na umu-nne-ya; ya onwe-ya bu nání nwata, ya na umu Bilha na umu Zilpa, bú ndinyom nna-ya, yikọrọ zù ewu na aturu: Josef we wetara nna-ha akukọ ihe ọjọ ha. 3 Ma Israel huru Josef n'anya kari umu-ya nile, n'ihi na nwa agadi-ya ka ọ bu: o we mere ya uwe-nwuda nwere aka. 4 Umu-nne-ya we hu na ọ bu ya onwe-ya ka nna-ha huru n'anya kari umu-nne-ya nile; ha we kpọ ya asì, ha apughi kwa igwa ya okwu n'udo. 5 Josef we rọ nrọ, gosi ya umu-nne-ya: ha we kpọ ya asì ọzọ kari. 6 Ọ si ha, Biko, nurunu nrọ a nke m'rọworo: 7 ma, le, ayi onwe-ayi nēke ùkwù-ọka n'etiti ubi, ma, le, ùkwù-ọka nkem biliri, guzo kwa onwe-ya ọtọ; ma, le, ùkwù-ọka-unu nāb͕a gburugburu, kpọ isi ala nye ùkwù-ọka nkem. 8 Umu-nne-ya we si ya, Ì gābu eze-ayi n'ezie? ma-ọbu ì gāchi ayi n'ezie? Ha we kpọ ya asì ọzọ kari n'ihi nrọ-ya nile, na n'ihi okwu-ya nile. 9 Ọ we rọ kwa nrọ ọzọ, kọrọ ya umu-nne-ya, si, Le, arọwom nrọ ọzọ; ma, le, anyanwu na ọnwa na kpakpando iri na otù nākpọ isi ala nyem. 10 Ọ we kọrọ ya nna-ya, kọkwara umu-nne-ya; nna-ya we basiere ya nba ike, si ya, Gini bu nrọ a nke i rọworo? Mu onwem na nne-gi na umu-nne-gi, àyi gābia n'ezie ikpọ isi ala nye gi? 11 Umu-nne-ya we kwo ya ekworo; ma nna-ya debere okwu ahu. 12 Umu-nne ya we je izù ìgwè ewu na aturu nke nna-ha na Shekem. 13 Israel we si Josef, Umu-nne-gi, hà adighi-azù ewu na aturu na Shekem? bia, m'gēzì kwa gi jekuru ha. Ọ si ya, Lekwam. 14 Ọ si ya, Biko, je le ma umu-nne-gi nọ n'udo, ma ìgwè ewu na aturu di kwa n'udo; weghachikwaram okwu. O si na ndagwurugwu Hebron ziga ya, o we biarue Shekem. 15 Otù nwoke we hu ya, ma, le, ọ nāwaghari n'ọhia: nwoke ahu we jua ya, si, Gini ka i nāchọ? 16 Ọ si Umu-nnem ka m'nāchọ: biko, gosim ebe ha nāzù ewu na aturu. 17 Nwoke ahu we si, Ha esiwo n'ebe a bulie ije: n'ihi na anurum ka ha nāsi, K'ayi je Dotan. Josef we so umu-nne-ya, chọta ha na Dotan. 18 Ha we hu ya n'ebe di anya, ma tutu ọ biakute ha nso, ha b͕agide ya ìzù ọjọ ime ka ọ nwua. 19 Ha we sìrita onwe-ha, Le, ọ̀kà-nrọ a nābia. 20 Ma ub͕u a, bianu, ka ayi b͕ue ya, tubà ya n'otù nime olùlù ndia, ayi gāsi kwa, Ajọ anu eriwo ya: ayi gāhu kwa ihe nrọ-ya nile gābu. 21 Reuben we nu ya, naputa ya n'aka-ha, si, Ka ayi ghara itib͕u ya. 22 Reuben we si ha, Unu awusila ọbara; tubànu ya n'olùlù a nke di n'ọzara, ma unu esetila aka imegide ya: ka o we naputa ya n'aka-ha, ime ka ọ laghachikuru nna-ya. 23 O rue, mb͕e Josef biakutere umu-nne-ya, na ha yipuru Josef uwe-ya, bú uwe-nwuda ahu nwere aka nke di n'aru ya; 24 ha kuru ya, tubà ya n'olùlù ahu: ma olùlù ahu tọb͕ọrọ n'efu, miri adighi nime ya. 25 Ha we nọdu iri nri: ha we welie anya-ha, hu, ma, le usu-ije ndi Ishmael si na Gilead nābia, camel-ha nēbu kwa uda na balm na myrrh, nēje iweda ya n'Ijipt. 26 Juda we si umu-nne-ya, Ùrù gini di ya mb͕e ayi gēb͕u nwa-nne-ayi, zo ọbara-ya? 27 Bianu, ka ayi re ya nye ndi Ishmael ndia, aka-ayi adi-kwa-la n'aru ya; n'ihi na nwa-nne-ayi, bú anu-aru-ayi, ka ọ bu. Umu-nne-ya we nu olu-ya. 28 Ndi Midian, bú ndi-ahia, we gabiga; ha we sere Josef, si n'olùlù dọlite ya, re Josef nye ndi Ishmael n'orú nkpuru-ego ọla-ọcha. Ha we kubata Josef n'Ijipt. 29 Reuben we biaghachi n'olùlù ahu; ma, le, Josef anọghi n'olùlù ahu; ọ we dọwa uwe-ya nile. 30 O we laghachikuru umu-nne-ya, si, Nwata ahu anọghi; ma mu onwem, òle ebe mu onwem gēje? 31 Ha we chiri uwe Josef, b͕u kwa nkpi, biaye uwe ahu nime ọbara-ya, 32 ziga uwe-nwuda ahu nwere aka, chita ya nye nna-ha, si, Nka ka ayi hutaworo: biko, mata ma uwe nwa-gi ka ọ bu ma-ọbu na ọ bughi ya. 33 Ọ we mata ya, si, Ọ bu uwe nwam; ajọ anu eriwo ya; anu-ọhia adọb͕uwo Josef n'ezie. 34 Jekob we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, yiri ákwà-nkpe n'úkwù-ya, ruru nwa-ya újú ọtutu ubọchi. 35 Umu-ya ndikom nile na umu-ya ndinyom nile we bilie ikasi ya obi; ma ọ juru, na agaghi-akasi ya obi; ọ si, N'ihi na m'gāridakuru nwam rue ala-mọ nēru újú. Nna-ya we kwara ya ákwá. 36 Ndi Midian we rerue ya Ijipt nye Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū.

About Jenesis Chapter 37

Read Jenesis Chapter 37 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Jenesis
Chapter: 37
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jenesis. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Jenesis Chapter 37 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Jenesis Chapter 37?

Jenesis Chapter 37 is part of the Book of Jenesis in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Jenesis Chapter 37 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Jenesis

  1. Jenesis Chapter 48
  2. Jenesis Chapter 15
  3. Jenesis Chapter 7
  4. Jenesis Chapter 33
  5. Jenesis Chapter 25
  6. Jenesis Chapter 27
  7. Jenesis Chapter 8

Related Chapters & Readings

  1. Ọpupu Chapter 32
  2. Ezikiel Chapter 48
  3. Joshua Chapter 20
  4. Ọpupu Chapter 23
  5. Abù Ọma Chapter 30
  6. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 27
  7. Ndi Rom Chapter 7
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *