Read II. Ndi Kọrint Chapter 10 Online
Read II. Ndi Kọrint Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ndi Kọrint and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
II. Ndi Kọrint 10
Isi 10
1. Ma mu onwem Pọl ji idi-nwayọ na obi-ọma nke Kraist nāriọ unu, mu onye nādi ala n'iru unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, ma mb͕e m'nānọghi enwem obi-ike n'ebe unu nọ:
2. ma ariọm unu, ka m'ghara inwe obi-ike mb͕e m'nọ n'etiti unu na ntukwasi-obi ahu nke m'nāgu na m'gēji nwe anya-ike imegide ufọdu, ndi nāgu ayi dika ndi nējeghari dika anu-aru-ayi si chọ.
3. N'ihi na ọ bu ezie na ayi nējeghari n'anu-aru, ma ayi adighi-ebu agha dika anu-aru si ebu:
4. (n'ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike);
5. ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist;
6. ayi nānọ kwa dika ndi edoziworo ikpeputa aṅaghi-nti nile n'ìhè, mb͕e ọ bula agēmezu iṅa-nti-unu.
7. Unu nēle ihe di n'iru unu anya. Ọ buru na onye ọ bula atukwasiwo obi n'onwe-ya na ya bu onye Kraist, ya gua nka ọzọ n'onwe-ya, na, dika ya onwe-ya bu onye Kraist, otú a ka ayi onwe-ayi bu kwa.
8. N'ihi na asi na ọ bu ezie na m'gānyabiga isi ókè kari bayere ike-ayi (nke Onye-nwe-ayi nyere iwuli unu elu dika ulo, ọ bughi kwa iweda unu), agaghi-eme ka ihere mem:
9. ka m'we ghara idi unu ka agāsi na ejim akwukwọ-ozim nile me ka unu tua oké egwu.
10. N'ihi na ha nāsi, Akwukwọ-ozi-ya di arọ́ di kwa ike; ma ọnunọ nke aru-ya n'etiti ayi adighi ike, okwu-ya bu kwa ihe akpọrọ ihe-efu.
11. Ka madu di otú a gua nka, na aha madu ayi ji akwukwọ-ozi buru n'okwu mb͕e ayi nānọghi n'etiti unu, madu di otú a ka ayi bu kwa n'ọlu mb͕e ayi nọ n'etiti unu.
12. N'ihi na ayi enweghi anya-ike igu onwe-ayi n'etiti ufọdu, ma-ọbu iwere onwe-ayi tule ha, bú ufọdu ndi ahu ndi ha onwe-ha nēme ka amara ha: ma ebe ha nēwere onwe-ha tù onwe-ha, were kwa onwe-ha tule onwe-ha, ha onwe-ha aghọtaghi ihe.
13. Ma ayi onwe-ayi agaghi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, kama dika ọtùtù nke ihe-ọtùtù ahu si di, bú nke Chineke keputara ayi, dika ọtùtù, ibiaru ọbuná n'ebe unu nọ.
14. N'ihi na ayi esetibigaghi onwe-ayi ókè, dika agāsi na ayi adighi-eru unu: n'ihi na ayi bu ndi buru uzọ biakute unu nime ozi ọma Kraist:
15. ayi adighi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, nke ahu bu, na ndọb͕u ndi ọzọ dọb͕uru onwe-ha n'ọlu; ma ayi nēle anya na, mb͕e okwukwe-unu nāba uba kari, agēme ka ayi di uku n'etiti unu dika ihe-ọtùtù-ayi si di rue ibabiga-ókè,
16. ka ayi we zisa ozi ọma rue ebe nile di n'ofè unu, ghara kwa inya isi bayere ihe edoziri ayi n'ihe-ọtùtù onye ọzọ.
17. Ma onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi.
18. N'ihi na onye ya onwe-ya nēme ka amara ya, ọ bughi onye ahu ka anwaputaworo, kama ọ bu onye Onye-nwe-ayi nēme ka amara ya.
About II. Ndi Kọrint Chapter 10
Read II. Ndi Kọrint Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: II. Ndi Kọrint
Chapter: 10
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ndi Kọrint. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading II. Ndi Kọrint Chapter 10 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is II. Ndi Kọrint Chapter 10?
II. Ndi Kọrint Chapter 10 is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete II. Ndi Kọrint Chapter 10 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6
Explore More from ii-ndi-kọrint
- II. Ndi Kọrint Chapter 11
- II. Ndi Kọrint Chapter 9
- II. Ndi Kọrint Chapter 2
- II. Ndi Kọrint Chapter 6
- II. Ndi Kọrint Chapter 12
- II. Ndi Kọrint Chapter 4
- II. Ndi Kọrint Chapter 3