Aisaia Chapter 44

For English

Read Aisaia Chapter 44 Online

Read Aisaia Chapter 44 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Aisaia and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Aisaia 44

Isi 44

1. Ma ub͕u a, nuru, Jekob, bú orùm; nuru kwa, Israel, nke M'rọputara:

2. Otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Onye kpuwo-kwa-ra gi site n'afọ nne-gi, Nke nēyere gi aka; Atula egwu, gi orùm, bú Jekob; na gi, Jeshurum, nke M'rọputara.

3. N'ihi na M'gāwukwasi miri n'aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n'ala-akọrọ: M'gāwukwasi Mọm n'aru nkpuru-gi, na ngọzim n'aru umu i muru:

4. ha ewe pue n'etiti ahihia, dika osisi willow n'akuku iyi juputara na miri.

5. Otù onye gāsi, Onye Jehova nwere ka m'bu; onye ọzọ gākpọ onwe-ya n'aha Jekob; onye ọzọ gēdekwasi n'aka-ya, Onye Jehova nwere, ọ gēji kwa aha Israel tue onwe-ya aha.

6. Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.

7. Ọ̀ bu kwa onye, dika Mu onwem, nākpọ, nēgosi ya, nēdorom ya n'usoro, site na mb͕e M'doro ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga? ihe nile nke gādi n'iru, na nke gābia, ka ha gosi ha.

8. Unu atula oké egwu, unu ama-kwa-la jijiji: ọ̀ bughi site na mb͕e gara aga ka M'meworo ka i nuru, gosi kwa gi ya? unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm. Ọ̀ di Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem? é-è, ọ dighi Oké Nkume ọ bula di; ọ dighi otù efu M'mara.

9. Ndi n-akpu arusi apiri api, ha nile bu ihe tọb͕ọrọ n'efu; ihe nile anāchọsi nke ha agaghi-aba urù: ndi-àmà-ha kwa, ha onwe-ha adighi-ahu uzọ, ha adighi-ama kwa; ka ihere we me ha.

10. Ònye kpuworo chi, ma-ọbu wua arusi apiri api nke nābaghi urù ma-ọli?

11. Le, ihere gēme ndi ejikọtara ya na ha; ndi-ọ̀kà kwa, ha onwe-ha bu ihe zara madu: ka ha chikọta onwe-ha, ha nile, ka ha ọtọ; ha gātu oké egwu, ihere gēme ha n'otù.

12. Uzú nākpu ihe-ọlu, o were icheku alu, were kwa otùtù-ya nile akpu ya, were kwa ogwe-aka-ya di ike alu ya: ọzọ, agu nāgu ya, ike we ghara idi; ọ ṅughi miri, o we da #mbà.

13. Onye-ọ̀kà n'osisi nēseti eriri; ọ nēwere pencil kà ya; o were nkpu-ya nile akpucha ya, were kwa compass-ya kà ya, o we me ya ka ọ di ka ihe-atù nwoke, dika ima-nma nke madu, ibi n'ulo.

14. Ọ nēb͕uturu onwe-ya osisi cedar di iche iche, were kwa osisi holm na osisi oak, ọ nēme-kwa-ra onwe-ya otù osisi nētiti osisi nile nke oké ọhia ka o nwe ume: ọ kuwo osisi fir, miri-ozuzo nēme kwa ka o bùe ibù.

15. Ọ gābu-kwa-ra madu ihe isure ọku; o we were ufọdu nime ha, nya ọku; e, ọ funwue ya, we sie achicha: e, ọ nāpi chi, we kpọ isi ala nye ya; o mewo ya arusi apiri api, we da kpue iru n'ala n'iru ya.

16. Nkera-ya ka o sureworo n'ọku; o ji nkera-ya eri anu; ọ nāru anu-ọruru, we rijue afọ: e, ọ nānya ọku we si, Ehe, aru ekpowom ọku, ahuwom ọku:

17. ma nke fọduru nime ya ka o meworo ka ọ ghọ chi, ọbuná arusi ya-akiri-api: ọ nāda kpu iru n'ala n'iru ya, nākpọ kwa isi ala, nēkpere ya, si Naputam; n'ihi na chim ka i bu.

18. Ha amaghi, ha adighi-aghọta kwa: n'ihi na O techiwo anya-ha, ha we ghara ihu uzọ; O techiwo obi-ha, ha we ghara inwe uche.

19. Ọ dighi kwa onye nēchetara obi-ya, ọ dighi kwa ihe-ọmuma maọbu nghọta di isi, Nkera-ya ka m'sureworo n'ọku; ọzọ kwa, esiwom achicha n'elu icheku-ọku-ya nēre ere; anamaru anu rie: #m'gēme kwa nke fọduru nime ya ka ọ ghọ ihe-árú? ọ̀ bu n'iru ogwe osisi ka m'gāda kpue iru n'ala?

20. Ọ bu onye ji ntu azù onwe-ya: obi akwara emò ewezugawo ya, o we ghara inaputa nkpuru-obi-ya, ma ọbu isi, Ọ̀ bughi okwu-ugha, bú ihe di n'aka-nrim?

21. Cheta ihe ndia, Jekob; gi Israel kwa, n'ihi na orùm ka i bu: akpuwom i; orù M'nwere ka i bu: Israel, M'gaghi-echezọ gi.

22. Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i.

23. Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe, n'ihi na Jehova emewo ya; tienu nkpu, unu ebe nile di ala nke uwa; unu ugwu, tibenu nkpu ọṅù, gi oké ọhia, na osisi ọ bula di nime ya: n'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, ọ bu kwa n'Israel ka Ọ gēme Onwe-ya ka Ọ ma nma.

24. Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye kpuworo gi site n'afọ nne-gi: Mu onwem bú Jehova, Onye nēme ihe nile; Onye náním nēseti elu-igwe; Onye nāb͕asa uwa; ọ̀ bu onye ka Mu na ya nọ?

25. abum Onye nēmebi ihe-iriba-ama nile nke ndi-ekwukwu, M'nēme kwa ka ndi nāju ase wi ara; abum Onye nēme ka ndi mara ihe laghachi azu, M'nēme kwa ka ihe-ọmuma-ha ghọ ihe-nzuzu:

26. abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M'gēwuli kwa:

27. Onye ahu Nke nāsi ob͕u-miri, Takọ; osimiri-gi nile ka M'gēme kwa ka ha tachasia:

28. Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n'ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n'isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.

About Aisaia Chapter 44

Read Aisaia Chapter 44 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Aisaia
Chapter: 44
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Aisaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Aisaia Chapter 44 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Aisaia Chapter 44?

Aisaia Chapter 44 is part of the Book of Aisaia in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Aisaia Chapter 44 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Aisaia

  1. Aisaia Chapter 3
  2. Aisaia Chapter 20
  3. Aisaia Chapter 12
  4. Aisaia Chapter 47
  5. Aisaia Chapter 54
  6. Aisaia Chapter 5
  7. Aisaia Chapter 57

Related Chapters & Readings

  1. Levitikọs Chapter 27
  2. Hosea Chapter 3
  3. Aisaia Chapter 50
  4. Job Chapter 28
  5. Jeremaia Chapter 16
  6. Ilu Chapter 30
  7. Esta Chapter 6
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *