Aisaia Chapter 13

For English

Read Aisaia Chapter 13 Online

Read Aisaia Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Aisaia and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Aisaia 13

Isi 13

1. Ibu eboro Babilon, nke Aisaia nwa Emoz huru.

2. Bulienu ọkọlọtọ n'elu ugwu nke osisi nādighi, welierenu ha olu, fenu aka, ka ha we ba n'ọnu-uzọ nile nke ndi amara aha-ha.

3. Mu onwem enyewo ndim edoworo nsọ iwu, akpọwokwam ndi-dikem imezu ihe iwem chọrọ, bú ndim nāṅuri ọṅu-agha nime npako.

4. Nuru olu ìgwè n'ugwu nile, yiri nke ndi bara uba! nuru olu nkpotu ala-eze nile nke mba nile achikọtaworo! Jehova nke usu nile nke ndi-agha nāgukọta usu-ndi-agha ibu agha.

5. Ha nēsi n'ala di anya abia, na nsọtu elu-igwe, bú Jehova na ihe-agha nile nke oké iwe-Ya, emebi ala nka nile.

6. kwasienu ákwá ike; n'ihi na ubọchi Jehova di nso; dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.

7. N'ihi nke a-aka nile gākuda, obi ọ bula nke madu gālọ kwa ya miri:

8. ha gāma kwa jijiji; aru-ufu na ihe-nb͕u ka ha gēnwezu; dika nwanyi ime nēme, otú a ka ha gāb͕ali: ọ gēju ha anya, otù n'ebe ibe-ya nọ; iru nke bu nání ire-ọku ka iru-ha gābu.

9. Le, ubọchi Jehova, bú ubọchi nēnweghi obi-ebere, nābia, ya na nrubiga-ókè nke iwe na iwe di ọku; ime ka ala nka ghọ ebe tọbọrọ n'efu na ikpochapu ndi-nmehie nime ya.

10. N'ihi na kpakpando nile nke elu-igwe na Oriọna-ha nile agaghi-eme ka ìhè-ha nwue: anyanwu gāb͕a ọchichiri n'ọwuwa-ya, ọzọ, ọnwa agaghi-eme ka ìhè-ya tie.

11. M'gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M'gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M'gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala.

12. M'gēme ka madu di ukọ kari ọla-edo anuchara anucha, ọbuná madu efu kari ọla-edo ọma nke Ofia.

13. N'ihi ya ọbuná elu-igwe ka M'gēme ka ha ma jijiji, uwa gēme kwa nkpatu pua n'Ọnọdu-ya, nime nrubiga-ókè nke iwe Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na n'ubọchi iwe-Ya di ọku.

14. Ọ gēru kwa, na ha gēche iru, onye ọ bula n'ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula rue ala-ya, dika mb͕ada anāchu achu, na dika ìgwè ewu na aturu, nke ọ nādighi onye nāchikọta ha.

15. Onye ọ bula anāchọta, amapue ya; onye ọ bula anējide, ọ da site na mma-agha.

16. Agātupia kwa umu-ha nāṅu ara n'anya-ha; agāpunara ha ulo-ha, merua ndinyom-ha.

17. Le, M'nākpọte ndi Midia imegide ha, ndi nādighi-agu ọla ọcha n'ihe, ọla-edo kwa, ọ dighi-atọ ha utọ.

18. Uta-ha nātupia kwa umu-okorọbia; ha adighi-enwe kwa obi-ebere n'aru nkpuru nke afọ; anya-ha adighi-emekwara umu ebere.

19. Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.

20. Ọ gaghi-abu ebe-obibi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ebi kwa nime ya rue ọb͕ọ nile: onye Arebia agaghi-ama kwa ulo-ikwū-ya n'ebe ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-eme kwa ka aturu-ha makpue n'ebe ahu.

21. Ma anu-ọhia di iche iche bi n'ala kpọrọ nku gāmakpu n'ebe ahu; ulo-ha gējuputa kwa n'okwukwu; enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu, nkpi gāmali kwa elu n'ebe ahu.

22. Anu-ọhia nēbe ebe gāzarita kwa onwe-ha n'ulo ọma ya nile, nkita-ọhia kwa n'ulo uku nile nke ihe-utọ: mb͕e-ya di kwa nso ibia, agaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo.

About Aisaia Chapter 13

Read Aisaia Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Aisaia
Chapter: 13
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Aisaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Aisaia Chapter 13 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Aisaia Chapter 13?

Aisaia Chapter 13 is part of the Book of Aisaia in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Aisaia Chapter 13 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Job Chapter 33

Explore More from Aisaia

  1. Aisaia Chapter 61
  2. Aisaia Chapter 42
  3. Aisaia Chapter 1
  4. Aisaia Chapter 2
  5. Aisaia Chapter 26
  6. Aisaia Chapter 20
  7. Aisaia Chapter 30

Related Chapters & Readings

  1. Jenesis Chapter 13
  2. I. Samuel Chapter 25
  3. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 7
  4. Joshua Chapter 21
  5. I. Ndi Kọrint Chapter 6
  6. Aisaia Chapter 65
  7. I. Samuel Chapter 6
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *