Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14

For English

Read Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14 Online

Read Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọlu Ndi-Ozi in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọlu Ndi-Ozi and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ọlu Ndi-Ozi 14

Isi 14

1. O we rue n'Aikọniọm, na ha abua bàkọrọ n'ulo-nzukọ nke ndi-Ju, we kwue okwu n'uzọ nke mere ka oké ìgwe madu, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, kwere na Jisus.

2. Ma ndi-Ju ndi nēkweyeghi kpaliri nkpuru-obi ndi mba ọzọ, me ka ha jọ njọ n'ebe umu-nna nime Kraist nọ.

3. Ya mere ha nọgidere n'ebe ahu oge di anya, nēkwuwa okwu nime Onye-nwe-ayi, Onye nāb͕ara okwu amara-Ya àmà, ebe Ọ nēnye ka eme ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche site n'aka-ha.

4. Ma ọra obodo ahu kewara: ufọdu we nọ n'akuku ndi-Ju, ufọdu nọ kwa n'akuku ndi-ozi Jisus.

5. Mb͕e ndi mba ọzọ na ndi-Ju kwa, ha na ndi-isi-ha, nukọtara ime ha ihe-ihere, na itu ha nkume,

6. ha we mata, b͕alaga n'obodo nke Laikaọnia, bú Listra na Dabe, na ala di ha buruburu:

7. n'ebe ahu ka ha nēzisa kwa ozi ọma.

8. Ma na Listra otù nwoke nānọdu ala, nke ukwu-ya abua nēnweghi ike, bú onye-ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ọ dighi mb͕e ọ bula o jereri ije.

9. Onye a nuru Pọl ka o nēkwu: onye, ebe o legidere ya anya, ebe ọ hu-kwa-ra na o nwere okwukwe agēji zọputa ya,

10. o were oké olu si, Bilie, guzo ọtọ n'ukwu-gi abua. O we wulie je kwa ije.

11. Mb͕e ìgwè madu nile huru ihe Pọl mere, ha welie olu-ha, nāsi n'asusu Laikaọnia, Chi-ayi ridatakuru ayi n'oyiyi madu.

12. Ha we kpọ Banabas, Jupita; kpọ kwa Pọl, Makuri, ebe ya onwe-ya bu onye-isi nēkwu okwu.

13. Onye-nchu-àjà nke Jupita, nke ulo nsọ ya di n'iru obodo ahu, we sekputa ehi weta kwa okoko-osisi n'ọnu-uzọ-ama obodo, ya na ìgwè madu ahu we chọ ichu àjà.

14. Ma mb͕e ndi-ozi ahu, bú Banabas na Pọl, nuru ya, ha dọwa uwe-ha, we pua b͕abà n'etiti ìgwè madu ahu, nēti nkpu,

15. nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:

16. Onye n'ọb͕ọ nile gara aga kwere ka mba nile nāga n'uzọ nile nke aka ha.

17. Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù.

18. Ma n'ikwu okwu ndia ọ di ha ike ib͕ochi ìgwè madu nile ka ha ghara ichu àjà nye ha.

19. Ma ndi-Ju siri n'Antiọk na Aikọniọm bia rue ebe ahu: mb͕e ha rafusiri ìgwè madu nile, ha tua Pọl nkume, dọkpupu ya n'azu abodo, nēchè na ọ nwuru anwu.

20. Ma mb͕e ndi nēso uzọ Jisus guzoro ya buruburu, o bilie, ba nime obodo: n'echi-ya ya na Banabas we pua ga Dabe.

21. Mb͕e ha zisasiri ozi ọma gwa ndi obodo ahu, me kwa ọtutu madu ka ha buru ndi nēso uzọ Jisus, ha laghachi na Listra, na Aikọniọm, na Antiọk,

22. nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.

23. Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n'otù n'otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n'aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya.

24. Ha we gabiga n'etiti Pisidia, bia rue Pamfilia.

25. Mb͕e ha kwusiri okwu Chineke na Paga, ha ridata n'Atalaia;

26. ha we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n'amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru.

27. Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ.

28. Ha na ndi nēso uzọ Jisus we nọgide ọ bughi nwa oge.

About Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14

Read Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọlu Ndi-Ozi in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ọlu Ndi-Ozi
Chapter: 14
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọlu Ndi-Ozi. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14?

Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14 is part of the Book of Ọlu Ndi-Ozi in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 13

Explore More from ọlu-ndi-ozi

  1. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 27
  2. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 13
  3. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 8
  4. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 11
  5. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 25
  6. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 4
  7. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 12

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 87
  2. Eklisiastis Chapter 4
  3. Abù Nke Abù Chapter 3
  4. I. Pita Chapter 5
  5. Aisaia Chapter 39
  6. Daniel Chapter 3
  7. Jeremaia Chapter 25
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *