Read II. Ihe Emere Chapter 16 Online
Read II. Ihe Emere Chapter 16 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ihe Emere and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
II. Ihe Emere 16
Isi 16
1. N'arọ nke-orú-na-iri-na-isi nke Esa bu eze, Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata.
2. Esa we weputa ọla-ọcha na ọla-edo n'àkù ulo Jehova na nke ulo eze, zigara Ben-hedad, bú eze Siria, onye bi na Damaskọs, si,
3. Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom i ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo.
4. Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel; ha we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-maim, na ulo-nchikọbata-ihe nile nke obodo Naftali nile.
5. O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, me ka ozi-ya ahu kwusi.
6. Ma Esa, bú eze, chiri Juda nile; ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; o we were ha wue Geba na Mizpa'
7. Ma na mb͕e ahu Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, biakutere Esa, bú eze Juda, si ya, N'ihi na i dabeworo n'eze Siria, ma i dabeghi na Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi nka usu-ndi-agha eze Siria esiwo n'aka-gi wepuga onwe-ya.
8. Ndi Etiopia na ndi-Lubim, hà abughi usu-ndi-agha n'uba, nēnwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya bara uba nke-uku? ma mb͕e i dabere na Jehova, O nyere ha n'aka-gi.
9. N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.
10. Esa we wesa onye-ọhu-uzọ ahu iwe, tiye ya n'ulo ọtọsi; n'ihi na o nēkosa ya ọnuma n'ihi ihe a. Esa we zọpia ufọdu nime ndi-ya na mb͕e ahu.
11. Ma, le, ihe nile Esa mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.
12. Esa we ria ọria n'ukwu-ya abua n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n'ọria-ya ọ chọghi Jehova, kama ọ chọrọ n'etiti ndi-dibia.
13. Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ọ nwua n'arọ nke-ọgu-abua-na-otú ọ bu eze.
14. Ha we lìe ya n'ili ya, nke o gwuwara nye onwe-ya n'obodo Devid, ha we me ka o dina n'ihe-ndina nke emejuru n'uda di iche iche na ihe di iche iche asugwara asugwa n'ọlu onye nāsugwa manu nēsì ísì utọ: ha we surere ya oké nsure-ọku di uku.
About II. Ihe Emere Chapter 16
Read II. Ihe Emere Chapter 16 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ihe Emere in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: II. Ihe Emere
Chapter: 16
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ihe Emere. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading II. Ihe Emere Chapter 16 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is II. Ihe Emere Chapter 16?
II. Ihe Emere Chapter 16 is part of the Book of II. Ihe Emere in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete II. Ihe Emere Chapter 16 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
Explore More from ii ihe emere
- II. Ihe Emere Chapter 9
- II. Ihe Emere Chapter 29
- II. Ihe Emere Chapter 14
- II. Ihe Emere Chapter 21
- II. Ihe Emere Chapter 22
- II. Ihe Emere Chapter 36
- II. Ihe Emere Chapter 8