Read Jọn Chapter 17 Online
Read Jọn Chapter 17 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jọn and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Jọn 17
Isi 17
1. Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto:
2. dika I nyere Ya ike n'ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi.
3. Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist.
4. Mu onwem nyere Gi otuto n'elu uwa, ebe M'luzuru ọlu I nyeworom ka M'lua.
5. Nna, Gi onwe-gi were kwa otuto nke M'nwere n'ebe I nọ mb͕e uwa akādighi nyem otuto ub͕u a nebe Gi onwe-Gi nọ.
6. Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site 'uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi.
7. Ha mara ub͕u a na ihe nile, ka ha ra, bú nke I nyeworom, si n'ebe I nọ puta:
8. n'ihi na okwu I nyerem ka M'nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n'ezie na esim n'ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem.
9. Mu onwem nēkpe ekpere bayere ha: ọ bughi uwa ka M'nēkpe ekpere bayere ya, kama anamekpe ekpere bayere ndi I nyeworom; n'ihi na ha bu nke Gi:
10. ihe nile nke bu nkem bu kwa nke Gi, nke Gi bu kwa nkem: enyewokwam otuto nime ha.
11. Anọkwaghm n'uwa ọzọ, ma ndia nọ n'uwa, Mu onwem nābiakute kwa Gi. Nna di nsọ, nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom, ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu.
12. Mb͕e Mu na ha nọri, Mu onwem nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom: eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n'iyì, ma-ọbughi nwa nke ila-n'iyì ahu; ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.
13. Ma anamabiakute Gi ub͕u a; okwu ndia ka M'nēkwu kwa nuwa, ka ha we nwe ọṅùm ka o zuworo nime onwe-ha.
14. Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n'ihi na ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa.
15. Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n'uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n'aka ajọ onye ahu.
16. Ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa.
17. Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu.
18. Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa.
19. N'ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n'ezi-okwu.
20. Ọ bughi kwa nání ndia ka M'nēkpe ekpere bayere ha, kama anamekpe kwa ekpere bayere ndi kwere na Mu site n'okwu-ha;
21. ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem.
22. Otuto nke I nyeworom ka Mu onwem nyewo-kwa-ra ha; ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu otù;
23. Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n'anya, dika I hurum n'anya.
24. Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.
25. Nna Nke bu Onye ezi omume, uwa amaghi Gi, ma Mu onwem mara Gi; ndia ndia ma-kwara na Gi onwe-gi ziterem;
26. eme-kwa-ram ka ha mara aha-Gi, M'gēme kwa ka ha mara ya; ka ihu-n'anya I ji hum we di nime ha, Mu onwem kwa nime ha.
About Jọn Chapter 17
Read Jọn Chapter 17 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Jọn
Chapter: 17
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jọn. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Jọn Chapter 17 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Jọn Chapter 17?
Jọn Chapter 17 is part of the Book of Jọn in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Jọn Chapter 17 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6