Read Matiu Chapter 4 Online
Read Matiu Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Matiu and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Matiu 4
Isi 4
1. Mb͕e ahu Mọ Nsọ duru Jisus rigo n'ọhia ka ekwensu we nwa Ya.
2. Mb͕e O busiri ọnu ọgu ubọchi abua ehihie na abali, emesia agu guru Ya.
3. Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha.
4. Ma Ọ zara, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Chineke puta.
5. Mb͕e ahu ekwensu kuru Ya bà n'obodo nsọ; o we guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke,
6. si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, tudà Onwe-gi n'ala: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi: Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.
7. Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.
8. Ọzọ kwa, ekwensu kuru Ya ga ugwu di oké elu, we gosi Ya ala-eze nile nke uwa, na ebube-ha;
9. o we si Ya, Ihe ndia nile ka m'gēnye Gi, ọ buru na I gādà n'ala kpọ isi ala nyem.
10. Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.
11. Mb͕e ahu ekwensu rapu Ya; ma le, ndi-mọ-ozi biakutere Ya nējere Ya ozi.
12. Ma mb͕e Ọ nuru na arara Jọn nye, O wezugara Onwe-ya je Galili;
13. O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali:
14. ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,
15. Ala Zebulun na ala Naftali, N'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan, Galili nke ndi-mba ọzọ,
16. Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiri Huru oké ìhè, Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu, Ndia ka ìhè walitere.
17. Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.
18. Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù.
19. O we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme unu ndi-ọkù nākuta madu.
20. Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya.
21. O we si n'ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha.
22. Ngwa ngwa ha we rapu ub͕ọ ahu na nna-ha, so Ya.
23. Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu.
24. Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.
25. Ọtutu ìgwè madu we si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n'ofè Jọdan so Ya.
About Matiu Chapter 4
Read Matiu Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Matiu
Chapter: 4
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Matiu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Matiu Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Matiu Chapter 4?
Matiu Chapter 4 is part of the Book of Matiu in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Matiu Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6
Explore More from matiu
- Matiu Chapter 18
- Matiu Chapter 14
- Matiu Chapter 13
- Matiu Chapter 23
- Matiu Chapter 12
- Matiu Chapter 21
- Matiu Chapter 27