II. Samuel Chapter 1

For English

Read II. Samuel Chapter 1 Online

Read II. Samuel Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Samuel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Samuel and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

II. Samuel 1

Isi 1

1. O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua;

2. o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala.

3. Devid we si ya, Òle ebe i si bia? Ọ si ya, N'ọmuma-ulo-ikwū Israel ka m'wepugara onwem.

4. Devid we si ya, Gini bu ihe emere? biko, gosim. Ọ si, Na ndi Israel esiwo n'agha b͕alaga, ọzọ kwa, ọtutu nime ndi Israel adawo nwua; ọzọ kwa, Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu.

5. Devid we si nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya, Ì si aṅa mara na Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu?

6. Nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya we si, Ọ dabataram inọ n'ugwu Gilboa, ma, le, Sọl nādabere n'ube-ya; ma, le, ub͕o-ala na ndi-nwe inyinya sosiri ya ike.

7. o we gha anya n'azu, hum, we kpọm òkù. M'we si, Lem.

8. Ọ sim, Ònye ka i bu? M'we si ya, Onye Amalek ka m'bu.

9. Ọ sim, Biko, guzo n'akukum, me ka m'nwua, n'ihi na anya-ajù ejidewom: n'ihi na ndum nile dizu nimem.

10. M'we guzo n'akuku ya, me ka ọ nwua, n'ihi na amaram na ọ gaghi-adi ndu mb͕e ọ dasiri: m'were okpu-eze nke di n'isi-ya, na ọla-aka nke di n'ogwe-aka-ya, we chitara ha onye-nwem n'ebe a.

11. Devid we jide uwe-ya, dọwa ha; otú a ka ndikom nile ya na ha nọ me-kwa-ra.

12. Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha.

13. Devid we si nwa-okorọbia nēgosi ya, Òle ebe i si bia? Ọ si Nwa ọbìa, bú onye Amalek, ka m'bu.

14. Devid we si ya, Ì si aṅa ghara itu egwu iseti aka-gi ibibi onye Jehova etere manu?

15. Devid we kpọ otù nime umu-okorọbia, si, Jerue nso, dakwasi ya. O we tib͕ue ya, o we nwua.

16. Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.

17. Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya:

18. Ọ we si ha zi umu Juda abù uta: le, edewo ya n'akwukwọ Jasha.

19. Israel, eb͕uwo nmá-gi n'elu ebe di elu gi! Ndi-dike esiwo aṅa da!

20. Unu egosila ya nime Gat, Unu ezisala ozi-ya n'èzí nile nke Ashkelon; Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu, Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha.

21. Unu ugwu Gilboa, Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli: N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi, Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.

22. Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike, Uta Jonatan esighi na ha la azu, Mma-agha Sọl esighi kwa lata n'efu.

23. Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha, Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha; Ha di garagara kari ugo, Ha di ike kari ọdum.

24. Umu-ndinyom Israel, kwaranu Sọl ákwá, Onye nēyibe unu uwe uhie, ya na ihe-utọ di iche iche, Onye nātukwasi ihe-ichọ-nma ọla-edo n'uwe-unu.

25. Ndi-dike esiwo aṅa da n'etiti agha ahu! Jonatan, n'elu ebe-gi di elu ka i buru onye eb͕uru eb͕u.

26. Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan: I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ: Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube, Kari ihu-n'anya ndinyom.

27. Ndi-dike esiwo aṅa da! Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!

About II. Samuel Chapter 1

Read II. Samuel Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Samuel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: II. Samuel
Chapter: 1
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Samuel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading II. Samuel Chapter 1 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is II. Samuel Chapter 1?

II. Samuel Chapter 1 is part of the Book of II. Samuel in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete II. Samuel Chapter 1 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from ii Samuel

  1. II Samuel Chapter 21
  2. II. Samuel Chapter 22
  3. II. Samuel Chapter 4
  4. II Samuel Chapter 10
  5. II. Samuel Chapter 9
  6. II Samuel Chapter 23
  7. II. Samuel Chapter 3

Related Chapters & Readings

  1. Luk Chapter 18
  2. Abù Ọma Chapter 40
  3. II. Ndi Kọrint Chapter 2
  4. Abù Ọma Chapter 118
  5. Jọn Chapter 20
  6. Rut Chapter 4
  7. Abù Ọma Chapter 108
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *