Job Chapter 42

For English

Read Job Chapter 42 Online

Read Job Chapter 42 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Job and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Job 42

Isi 42

1. Job we za Jehova, si,

2. Amawom na I puru ime ihe nile, Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi.

3. Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n'enweghi ọmuma-ihe? N'ihi ya ka m'gosiworo ihe nke m'nādighi-aghọta, Ihe dikaririm ebube, nke m'nādighi-amata.

4. Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa; M'gāju Gi, Gi me kwa ka m'mara.

5. Site n'ọnunu nti ka m'nuru Gi; Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi.

6. N'ihi nka ka m'nāju onwem aju, we chègharia N'elu ájá na ntu.

7. O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo.

8. Ma ub͕u a, chirinu n'onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n'ihi na n'ezie ọ bu ya ka M'gāhu iru-ọma, ka M'ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru.

9. Elifaz, bú onye Timan, na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama, we je, me dika Jehova gwara ha: Jehova we hu Job iru-ọma.

10. Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n'agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n'ihe nile Job nwere okpùkpù abua.

11. Umu-nne-ya ndikom nile, na umu-nne-ya ndinyom nile, na ndi nile mara ya na mb͕e gara aga, we biakute ya, so ya rie nri n'ulo-ya: ha we gosi ya ebere ha ji n'aru ya, kasi kwa ya obi bayere ihe ọjọ ahu nile nke Jehova mere ka ọ biakwasi ya: ha we nye ya, nwoke ọ bula otù iberibe ego, na nwoke ọ bula otù nb͕a-aka ọla-edo.

12. Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.

13. O nwe-kwa-ra umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.

14. O we kpọ aha nwayi mbu, Jemaima; na aha nwayi nke-abua, Kezaia; na aha nwayi nke-atọ, Keren-hapuk.

15. Ma ahughi ndinyom, mara nma dika umu-ndinyom Job n'ala ahu nile: nna-ha we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne-ha ndikom.

16. Job we di ndu mb͕e ihe a gasiri ọgu arọ asa, o we hu umu-ya, na umu umu-ya, bú ọb͕ọ anọ.

17. Job we nwua, buru agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ.

About Job Chapter 42

Read Job Chapter 42 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Job in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Job
Chapter: 42
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Job. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Job Chapter 42 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Job Chapter 42?

Job Chapter 42 is part of the Book of Job in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Job Chapter 42 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 7
  6. Esta Chapter 4
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Job

  1. Job Chapter 20
  2. Jób Chapter 14
  3. Job Chapter 33
  4. Jób Chapter 8
  5. Job Chapter 5
  6. Job Chapter 15
  7. Job Chapter 40

Related Chapters & Readings

  1. Emos Chapter 6
  2. Deuteronomi Chapter 19
  3. Ezikiel Chapter 45
  4. Aisaia Chapter 27
  5. Taitọs Chapter 2
  6. Abù Ọma Chapter 124
  7. Luk Chapter 5
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *