Read Ọlu Ndi-Ozi Chapter 5 Online
Read Ọlu Ndi-Ozi Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọlu Ndi-Ozi in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọlu Ndi-Ozi and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ọlu Ndi-Ozi 5
Isi 5
1. Ma otù nwoke nke anākpọ aha-ya Ananaias, ya na Safaira nwunye-ya, rere otù ihe o nwere,
2. we debere onwe-ya ufọdu nime ọnu-ahia-ya, nwunye-ya ma-kwa-ra, o we weta otù òkè, tọb͕ọ ya n'ukwu ndi-ozi.
3. Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi?
4. Mb͕e ọ nānọ, ọ̀ nọgideghi n'aka-gi? mb͕e eresiri ya, ọ̀ dighi kwa n'ike-gi? Gini mere i ji tiye ihe a n'obi-gi? Ọ bughi madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke.
5. Ma mb͕e Ananaias nuru okwu ndia ọ da n'ala, kubìe ume: ndi nile nke nuru ya we tua oké egwu.
6. Ndi bu umu-okorọbia nime ha we bilie, ke ya ákwà, ha we bupu ya lìe ya.
7. Ma ihe ra ka oge hour atọ gasiri, mb͕e nwunye-ya batara nime, nāmataghi ihe emereri.
8. Pita we za ya, si, Gwam, ọ̀ bu ihe ra otú a ka unu rere iberibe ala unu? Ọ si, E, ihe ra otú a.
9. Ma Pita siri ya, Gini mere unu nwere otù olu inwa Mọ nke Onye-nwe-ayi? le, ukwu nke ndi lìri di-gi di n'ọnu-uzọ, ha gēbupu kwa gi.
10. O we da n'ala ngwa ngwa n'ukwu-ya, kubìe ume: umu-okorọbia ahu we bata, hu ya ka ọ nwuru, ha we bupu ya, lìe ya n'akuku di-ya.
11. Nzukọ Kraist dum we tua oké egwu, ha na ndi nile ndi nuru ihe ndia.
12. Ma emere ọtutu ihe-iriba-ama na ọlu-ebube n'etiti ndi-Ju site n'aka ndi-ozi; ha nile were kwa otù obi nọ n'ìbà Solomon.
13. Ma nime ndi fọduru ọ dighi onye ọ bula nwere anya-ike iwere onwe-ya rapara ha n'aru: otú ọ di, ndi-Ju nēme ka ha di uku;
14. ewe tukwasi kari nye Onwe-nye-ayi ndi kwere na Ya, ìgwè madu ma ndkom ma ndinyom;
15. nke mere ka ha nēkupu ọbuná ndi aru nādighi ike, nēdebe ha n'amá, tọb͕ọ ha n'ihe-ndina na ute, ka, mb͕e Pita nāga, ka ọbuná nání onyinyo-ya we kpuchie otù onye nime ha.
16. Ọra madu nke obodo nile di Jerusalem buruburu we nāb͕akọ kwa, nēkuta ndi aru nādighi ike, na ndi ndi-mọ nādighi ọcha nēsob͕u: ewe me ka aru-ha nile n'otù n'otù di ike.
17. Ma onye-isi-nchu-àjà biliri, ya na ndi nile soro ya (nke bu irọ-òtù ndi-Sadusi), ha juputa-kwa-ra n'ekworo,
18. ha we tukwasi aka-ha n'aru ndi-ozi, tubà ha n'ulo-nkpọrọ ọra madu.
19. Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi meghere ọnu-uzọ nile nke ulo-nkpọrọ ahu n'abali, we duputa ha, si,
20. Ganu, guzo, gwa kwa ndi-Ju n'ulo uku Chineke okwu nile nke Ndu a.
21. Ma mb͕e ha nuru nka, ha ba n'ulo uku Chineke mb͕e chi nābọ, we nēzí ihe. Ma onye-isi-nchu-àjà biara, ya na ndi soro ya, we kpọkọ nnọkọ-ikpé-ha, na nzukọ ndi-okenye umu Israel nile, we ziga n'ulo-nkpọrọ, ka ekuta ha.
22. Ma ndi nēje ozi ndi biara ahughi ha n'ulo-nkpọrọ; ha we laghachi, kọrọ ha,
23. si, Ayi huru ulo-nkpọrọ ka emechisiri ya ike nke-ọma, ayi hu-kwa-ra ndi-nche ka ha nēguzo n'ọnu-uzọ: ma mb͕e ayi meghere, ọ dighi onye ọ bula ayi huru nime ya.
24. Ma mb͕e ọchi-agha nke ulo Chineke na ndi-isi-nchu-àjà nuru okwu ndia, ha nwere obi abua nke-uku bayere ha ebe nka gērusi.
25. Ma otù onye biara kọrọ ha, si, Le, ndikom ahu unu tubàra n'ulo-nkpọrọ nọ n'ulo uku Chineke nēguzo nēzí kwa ndi-Ju ihe.
26. Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume.
27. Ma mb͕e ha kutasiri ha, ha guzoro ha n'etiti nnọkọ-ikpé.
28. si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n'aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n'isi.
29. Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu.
30. Chineke nke nna-ayi-hà mere ka Jisus si n'ọnwu bilie, Onye unu onwe-unu b͕uru, nākwuba Ya n'elu osisi.
31. Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndú na Onye-nzọputa, inye Israel nchèghari na nb͕aghara nmehie.
32. Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe ndia; Mọ Nsọ bu kwa onye-àmà, Onye Chineke nyere ndi nēkweyere Ya.
33. Ma mb͕e ha nuru nka, amapue ha n'obi-ha, ha we zube ib͕u ha.
34. Ma otù onye biliri na nnọkọ-ikpé ahu, bú onye-Farisi, aha-ya bu Gameliel, onye nēzí iwu Moses, onye ndi-Ju nile nāsọpuru, o we kwue ka akpọpu madu ahu n'èzí nwa oge.
35. O we si ha, Ndikom nke Israel, nēzenu onwe-unu n'ihe banyere madu ndi a, ihe unu gaje ime.
36. N'ihi na mb͕e ubọchi nda akērughi Teudas biliri, nākpọ onwe-ya ihe; onye ọnu-ọgugu ndikom, ra ka nnù madu, dayere ya: onye eb͕uru; ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya, we b͕asa, ha we ghọ ihe-efu.
37. Mb͕e onye ahu gasiri Judas onye Galili biliri n'ubọchi odide-aha, me kwa ka ufọdu n'etiti ndi-Ju so ya n'azu: onye ahu la-kwa-ra n'iyì; ewe chusa ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya.
38. M'si kwa unu ub͕u a, Wepunu aka n'aru madu ndia, rapu-kwa-nu ha: n'ihi na ọ buru na ìzù a ma-ọbu ọlu a sitere n'aka madu agākwatu ya n'ala:
39. ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya.
40. Ha we kweyere ya: mb͕e ha kpọsiri ndi-ozi biakute ha, ha pia ha ihe, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n'aha Jisus, ha we rapu ha ka ha la.
41. Ya mere ha siri n'iru nnọkọ-ikpé ahu la, nāṅuri na aguru ha na ndi kwesiri ka eme ha ihe-ihere n'ihi Aha ahu.
42. Ma kwa-ubọchi, n'ulo uku Chineke na n'ulo nke aka ha, ha adighi-arapu izí ihe na izisa ozi ọma Jisus, na Ọ bu Kraist.
About Ọlu Ndi-Ozi Chapter 5
Read Ọlu Ndi-Ozi Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọlu Ndi-Ozi in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ọlu Ndi-Ozi
Chapter: 5
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọlu Ndi-Ozi. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ọlu Ndi-Ozi Chapter 5 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ọlu Ndi-Ozi Chapter 5?
Ọlu Ndi-Ozi Chapter 5 is part of the Book of Ọlu Ndi-Ozi in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ọlu Ndi-Ozi Chapter 5 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Nkpugh Chapter 4
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 6
- Nkpugh Chapter 13
Explore More from ọlu-ndi-ozi
- Ọlu Ndi-Ozi Chapter 26
- Ọlu Ndi-Ozi Chapter 22
- Ọlu Ndi-Ozi Chapter 9
- Ọlu Ndi-Ozi Chapter 13
- Ọlu Ndi-Ozi Chapter 14
- Ọlu Ndi-Ozi Chapter 27
- Ọlu Ndi-Ozi Chapter 8