Jeremaia Chapter 52

For English

Read Jeremaia Chapter 52 Online

Read Jeremaia Chapter 52 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jeremaia and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Jeremaia 52

Isi 52

1. Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.

2. O mee ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoiakim mere.

3. N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.

4. O rue, n'arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadreza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ha we ma ulo-ikwū-ha megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu.

5. Ewe nānọchigide obodo ahu n'agha rue arọ nke-iri-na-otù nke eze, bú Zedekaia.

6. N'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.

7. Ewe tipue obodo, ndi-agha nile we b͕apu, pua n'obodo n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige; (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) ha we je n'uzọ Araba.

8. Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n'azu, rue Zedekaia aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko; ma usu-ndi-agha-ya nile siri n'ebe ọ nọ b͕asasia.

9. Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla n'ala Hemat; o we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.

10. Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, ọ bu kwa ndi-isi nile nke Juda ka o b͕uru na Ribla.

11. O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua; eze Babilon we were ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, me ka ọ ba na Babilon, tiye ya n'ulo-ndebe rue ubọchi ọnwu-ya.

12. Ma n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadreza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, onye guzoro n'iru eze Babilon, batara na Jerusalem:

13. o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.

14. Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.

15. Ma ufọdu nime ndi Israel nēnweghi ike, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi gbapuru agbapu, bú ndi gbapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti ìgwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ.

16. Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka Nebuzaradan, onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlu-ubi.

17. Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha nile je Babilon.

18. Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.

19. Ọkwa nile kwa, na ihe-igu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ite nile, na ihe-idọba-oriọna nile, na ngaji nile, na iko nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.

20. Ogidi abua ahu, na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua nke ọla nke di n'okpuru ihe-ndọkwasi-ya nile, nke eze, bú Solomon, mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.

21. Ma ogidi abua ahu, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di; ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ya buruburu; ib͕idi-ya di nkpisi-aka anọ: ọ di oghere n'ime-ya.

22. Isi nke di n'elu ya bu kwa ọla; idi-elu otù isi ahu di cubit ise; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n'isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na pomegranate.

23. Ma pomegranate ahu di ọgu anọ na iri na isi n'akuku ọ bula; pomegranate nile di ọgu ise n'elu ihe-ọkpukpa buruburu.

24. Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:

25. o si-kwa-ra n'obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha; na ndikom asa nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n'obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n'etiti obodo.

26. Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon, rue Ribla.

27. Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Ewe me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.

28. Nka bu ndi ahu nke Nebukadreza mere ka ha je biri n'ala ọzọ; n'arọ nke-asa nnù ndi-Ju asa na ọgu iri-na-otù na atọ:

29. n'arọ nke-iri-na-asatọ nke Nebukadreza ka o mere ka nnù madu abua na orú na iri na abua si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ:

30. n'arọ nke-orú-na-atọ nke Nebukadreza ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ndi-Ju ufọdu, bú nnù madu na ọgu iri-na-asa na ise, je biri n'ala ọzọ: madu nile di nnù iri na otù na ọgu iri.

31. O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o weliri isi Jehoiakin, bú eze Juda, me ka o si n'ulo-nkpọrọ puta;

32. o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon.

33. O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, o we nēri nri n'iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya.

34. Anēnye kwa ya òkè-ihe-oriri-ya, bú òkè-ihe-oriri mb͕e nile, site n'aka eze Babilon, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya rue ubọchi ọnwu-ya, ubọchi nile nke ndu-ya.

About Jeremaia Chapter 52

Read Jeremaia Chapter 52 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Jeremaia
Chapter: 52
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jeremaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Jeremaia Chapter 52 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Jeremaia Chapter 52?

Jeremaia Chapter 52 is part of the Book of Jeremaia in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Jeremaia Chapter 52 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Jeremaia

  1. Jeremaia Chapter 50
  2. Jeremaia Chapter 48
  3. Jeremaia Chapter 4
  4. Jeremaia Chapter 5
  5. Jeremaia Chapter 23
  6. Jeremaia Chapter 40
  7. Jeremaia Chapter 32

Related Chapters & Readings

  1. Ọpupu Chapter 7
  2. Abù Ọma Chapter 90
  3. I. Ndi Kọrint Chapter 16
  4. Daniel Chapter 3
  5. I. Timọti Chapter 3
  6. Nehemaia Chapter 12
  7. Aisaia Chapter 20
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *