Ezikiel Chapter 43

For English

Read Ezikiel Chapter 43 Online

Read Ezikiel Chapter 43 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ezikiel and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ezikiel 43

Isi 43

1. O we me ka m'jerue ọnu-uzọ-ama ahu, bú ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu:

2. ma le, ebube nke Chineke nke Israel si n'uzọ Iru-anyanwu bia: olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri: uwa nwu-kwa-ra enwu site n'ebube-Ya.

3. Ọ di kwa ka ọhù nke m'huru si di n'ile ya anya, dika ọhù m'huru mb͕e m'biara ibibi obodo ahu; ọhù nile di kwa ka ọhù ahu nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpuchie irum n'ala.

4. Ebube nke Jehova we bata nime ulo-Ya n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu.

5. Mọ Chineke we buliem elu, me ka m'bata n'ogige di nime; ma le, ebube nke Jehova juputara n'ulo ahu.

6. M'we nu olu otù onye nāgwam okwu site n'ulo ahu; otù nwoke nēguzo kwa n'akukum.

7. O we sim, Nwa nke madu, nka bu ebe nke oche-ezem, na ebe nke ọbu-ukwu nke ukwum abua, ebe M'gēbi n'etiti umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: ulo Israel agaghi-emeru kwa aha nsọm ọzọ, ha onwe-ha, ma-ọbu ndi-eze-ha, site n'ikwa-iko-ha, na site n'ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di elu ha;

8. mb͕e ha nētiye nbata-uzọ-ha n'akuku nbata-uzọ nkem, na akuku-ọnu-uzọ-ha n'akuku akuku-ọnu-uzọ nkem, ọ bu kwa nání mb͕idi di n'etiti mu na ha; ha emeruwo kwa aha nsọm site n'ihe-árú-ha nile nke ha meworo: M'we ripia ha n'iwem.

9. Ub͕u a ka ha wezuga ikwa-iko-ha na ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di anya n'ebe M'nọ, M'gēbi kwa n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.

10. Gi onwe-gi, nwa nke madu, gosi ulo Israel ulo a, ka ihere ajọ omume nile ha we me ha: ka ha tù kwa ọtùtù-ya.

11. Ọ buru kwa na ihere ihe nile ha meworo eme ha, gi me ka ha mara òmùmò ulo a, na ọtùtù-ya, na ọpùpù-ya nile, na nbata-ya nile, na òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, na òmùmò-ya nile, na iwu-ya nile, de kwa ha n'akwukwọ n'anya-ha: ka ha we debe òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, me ha.

12. Nka bu iwu ulo a: n'elu ugwu-ya ókè-ala-ya nile buruburu n'akuku nile di nsọ kachasi ebe nsọ nile. Le, nka bu iwu ulo a.

13. Ma ndia bu ọtùtù ebe-ichu-àjà nime cubit: (cubit ahu bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka:) ala-ya bu otù cubit, ọ bu kwa otù cubit ka obosara-ya di, ókè-ya n'ọnu-ọnu-ya buruburu bu kwa otù ntù-aka: nka bu kwa ebe-ndọkwasi ebe-ichu-àjà nka.

14. Site n'ala-ya nke di n'ala rue ngwe di ala di cubit abua, obosara-ya di kwa otù cubit; ma site na ngwe dikari ntà rue ngwe dikari uku di cubit anọ, obosara-ya di kwa otù cubit.

15. Ebe-ichu-àjà onwe-ya di kwa cubit anọ; site n'ebe-ichu-àjà we rigo ka mpi anọ di kwa.

16. Ebe-ichu-àjà di cubit iri na abua n'ogologo-ya, na cubit iri na abua n'obosara-ya, ọ rara nrata n'akuku anọ ya rara nrata.

17. Ngwe-ya di kwa cubit iri na anọ n'ogologo-ya, na cubit iri na anọ n'obosara-ya n'akuku anọ ya rara nrata, ókè nke di ya buruburu di kwa nkera cubit; ala o nwere di kwa otù cubit buruburu; ihe-nrigo-ya nēche iru n'Iru-anyanwu.

18. O we sim, Nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ndia bu ukpuru nke ebe-ichu-àjà nkem n'ubọchi ha gēme ya, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, na iwusa ọbara n'elu ya.

19. I gēnye kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai ndi sitere na nkpuru Zedok, ndi dim nso, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ijerem ozi, nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie.

20. I gēwere kwa ufọdu n'ọbara-ya, tiyekwasi na mpi anọ ya, na n'elu nkuku anọ nke ngwe-ya, na n'ókè-ya buruburu: i we wepu nmehie-ya, kpuchie nmehie-ya.

21. I gēwere kwa oke-ehi nke àjà-nmehie ahu, ọ gēsure kwa ya n'ebe eleputara eleputa nke ulo a, n'èzí ebe nsọ a.

22. Ma n'ubochi nke-abua i gēweta nkpi nke zuru okè ibu àjà-nmehie; ha gēwepu kwa nmehie nke ebe-ichu-àjà, dika ha si were oke-ehi wepu nmehie-ya.

23. Mb͕e i wepusiri nmehie-ya, i gēweta nso nwa-oke-ehi nke zuru okè, na ebulu nke zuru okè site n'ìgwè ewu na aturu-gi.

24. I gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, ndi-nchu-àjà gātusa kwa ha nnú, sure ha ọku, ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

25. Ubọchi asa ka i gēdozi otù ewu kwa-ubọchi ibu àjà-nmehie: ọ bu kwa nwa-oke-ehi, na ebulu nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, bú anu zuru okè, ka ha gēdozi.

26. Ubọchi asa ka ha gēkpuchi nmehie nke ebe-ichu-àjà, me ka ọ di ọcha; ha ewe mejue ya aka.

27. Mb͕e ha debezusiri ubọchi asa ahu, ọ gēru kwa, n'ubọchi nke-asatọ, we ga n'iru, na ndi-nchu-àjà ganēme àjà-nsure-ọku nile unu na àjà-udo nile unu n'elu ebe-ichu-àjà; ihe-unu gātọkwam utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

About Ezikiel Chapter 43

Read Ezikiel Chapter 43 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ezikiel
Chapter: 43
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ezikiel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ezikiel Chapter 43 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ezikiel Chapter 43?

Ezikiel Chapter 43 is part of the Book of Ezikiel in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ezikiel Chapter 43 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Ezikiel

  1. Ezikiel Chapter 39
  2. Ezikiel Chapter 7
  3. Ezikiel Chapter 30
  4. Ezikiel Chapter 22
  5. Ezikiel Chapter 41
  6. Ezikiel Chapter 16
  7. Ezikiel Chapter 26

Related Chapters & Readings

  1. Hosea Chapter 2
  2. Ọpupu Chapter 1
  3. Levitikọs Chapter 12
  4. Job Chapter 15
  5. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 17
  6. Levitikọs Chapter 16
  7. I. Jọn Chapter 3
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *