Read Levitikọs Chapter 19 Online
Read Levitikọs Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Levitikọs in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Levitikọs and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Levitikọs 19
Isi 19
1. Jehova we gwa Moses okwu, si,
2. Gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si ha, Nsọ ka unu gādi: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, Chineke-unu, di.
3. Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
4. Unu echela ihe-efu ọ bula iru, unu eme-kwa-lara onwe-unu chi ọ bula awuru awu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
5. Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà nké àjà-udo, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.
6. N'ubọchi unu churu ya ka agēri ya, ya na echi-ya: ma nke fọduru rue ubọchi nke-atọ, n'ọku ka agēsure ya.
7. Ma ọ buru na erie ya ma-ọli n'ubọchi nke-atọ, ihe-árú ka ọ bu; ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ:
8. ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n'ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya.
9. Ma mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu, ewesila ihe di n'akuku ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru
10. Atutukọ-kwa-la nkpuru ubi-vine-gi fọduru, achikota-kwa-la nkpuru dara ada n'ubi-vine-gi; ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
11. Unu ezula ori; unu aghọ-kwa-la aghughọ, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha, otù n'ebe ibe-ya nọ.
12. Unu ewe-kwa-la aham ṅu iyi n'okwu-ugha, we me ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.
13. Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n'ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n'aka-gi ogologo abali nile rue ututu.
14. Akọchala onye nti chiri, etiye-kwa-la ihe-isu-ngọngọ n'iru onye-ìsì, ma tua egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.
15. Unu emela ajọ omume n'ikpé: ahụla onye nēnweghi ike ikpemara iru ọma, asọpuru-kwa-la iru nke onye uku: n'ezi omume ka i gēkpe madu-ibe-gi ikpe.
16. Ejegharila n'etiti umu-nna-gi dika onye nāb͕a àmà ọjọ: eguzola imegide ọbara madu-ibe-gi: Mu onwem bu Jehova.
17. Akpọla nwa-nne-gi asi n'obi-gi: i ghaghi ibara madu-ibe-gi nba, ghara ibu nmehie bayere ya.
18. Abọla ọ́bọ̀, edebe-kwa-la iwe megide umu ndi-gi, ma hu madu-ibe-gi n'anya dika onwe-gi: Mu onwem bu Jehova.
19. Unu gēdebe ukpurum nile. Emela ka anu-ulo-gi di iche iche nāb͕a onwe-ha: aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-gi: uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta agaghi-abia n'aru-gi.
20. Ma mb͕e nwoke soro nwayi dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ma nwayi ahu bu nwayi nēje ozi, nke nwoke kwere ilu, nke anāb͕aputaghi ma-ọli, nke anēmeghi kwa ka ọ nwere onwe-ya: nchọputa okwu ahu gādi; agaghi-eme ka ha nwua, n'ihi na emeghi ka nwayi ahu nwere onwe-ya.
21. O gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, bú ebulu ibu àjà-ikpe-ọmuma.
22. Onye-nchu-àjà gēwere kwa ebulu àjà-ikpe-ọmuma ahu kpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova bayere nmehie-ya nke o mehieworo: agāb͕aghara kwa ya nmehie-ya nke o mehieworo.
23. Ma mb͕e unu gābà n'ala ahu, mb͕e unu gākuwori osisi nile ọ bula ibu ihe-oriri, unu gāgu kwa nkpuru-ya n'ebighi-úgwù-ya: arọ atọ ka ọ gāburu unu ihe anēbighi úgwù; agaghi-eri ya.
24. Ma n'arọ nke-anọ nkpuru-ya nile gādi nsọ, otuto anēto Jehova.
25. Ma n'arọ nke-ise unu gēri nkpuru-ya, ka ọ we mikwasiri unu ihe ọmume-ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
26. Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ.
27. Unu akọpula usọ isi-unu buruburu, ebibi-kwa-la usọ afu-ọnu-gi.
28. Unu eb͕ula eb͕ub͕u n'anu-aru-unu n'ihi nkpuru-obi madu, unu etiye-kwa-la ihe-odide, bú eb͕ub͕u-ọku, n'aru unu: Mu onwem bu Jehova.
29. Emela ka nwa-gi nwayi ghara idi nsọ, ime ka ọ ghọ nwayi nākwa iko; ka ala-gi we ghara ikwa iko, ka ala-gi we ghara kwa ijuputa na nzube ọjọ.
30. Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova.
31. Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
32. I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.
33. Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n'ala-unu, unu emela ya ihe-ike.
34. Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
35. Unu emela ajọ omume-n'ikpé, ma-ọbu n'itù ihe, ma-ọbu n'isi ihe, ma-ọbu n'itù ihe di miri miri.
36. Ihe-osìsì ziri ezi, na nkume isì-ihe ziri ezi na ephah ziri ezi, na hin ziri ezi, ka unu gēnwe: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta.
37. Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, me kwa ha: Mu onwem bu Jehova.
About Levitikọs Chapter 19
Read Levitikọs Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Levitikọs in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Levitikọs
Chapter: 19
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Levitikọs. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Levitikọs Chapter 19 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Levitikọs Chapter 19?
Levitikọs Chapter 19 is part of the Book of Levitikọs in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Levitikọs Chapter 19 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from levitikọs
- Levitikọs Chapter 10
- Levitikọs Chapter 24
- Levitikọs Chapter 7
- Levitikọs Chapter 27
- Levitikọs Chapter 5
- Levitikọs Chapter 25
- Levitikọs Chapter 6