Read Ndi-Ikpe Chapter 15 Online
Read Ndi-Ikpe Chapter 15 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Ikpe and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ndi-Ikpe 15
Isi 15
1. O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na mb͕e obìbì ọka wheat, na Samson were nwa-ewu leta nwunye-ya; ọ si, Ka m'bakuru nwunyem n'ime-ulo. Ma nna nwunye-ya ekweghi ka ọ ba.
2. Nna-ya we si, Asirim n'ezie na i kpọrọ ya asì nke-uku; m'we nye ya nwoke-ibe-gi: nwa-nne-ya nke-ntà, ọ̀ dighi nma kari ya? biko, ka ọ nọchiri gi n'ọnọdu ya.
3. Samson we si ha, Otù ub͕ò a m'gābu onye ikpe nāmaghi kari ndi Filistia, ọ bu ezie na mu onwem nēme ha ihe ọjọ.
4. Samson we je nwude ọgu nkita-ọhia iri-na-ise, chiri ọwa, che ọdudù iru, tiye otù ọwa n'etiti ọdudù abua n'ab͕ata ha.
5. Ọ we muye ọku n'ọwa nile, zipu ha ga n'ọka guzoro eguzo nke ndi Filistia, we sure ma obo ọka ma ọka guzoro eguzo, ha na ubi-olive.
6. Ndi Filistia we si, Ònye meworo nka? Ha si, Samson, di nwa onye Timna, n'ihi na ọ narawo ya nwunye-ya, nye ya nwoke-ibe-ya. Ndi Filistia we rigo, kpọre ya na nna-ya n'ọku.
7. Samson we si ha, Ọ buru na unu eme otú a, aghaghm ibọrọ onwem ọ́bọ n'aru unu, ma emesia m'gāgha.
8. O we tib͕ue ha ntib͕u uku, ogwe-ukwu n'elu apata-ukwu: ọ we rida, nọdu nime nb͕awa nke nkume di elu, bú Itam.
9. Ndi Filistia we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Juda, b͕asa onwe-ha nime Lehi.
10. Ndikom Juda we si, N'ìhi gini ka unu rigotaworo megide ayi? Ha si, Ike Samson ab͕u ka ayi rigotaworo, ime ya dika o meworo ayi.
11. Nnù ndikom Juda asa na ọgu iri we ridarue nb͕awa nkume di elu, bú Itam, si Samson, Ì maghi na ndi Filistia bu ndi nāchi ayi? gini bu kwa nka i meworo ayi? Ọ si ha, Dika ha merem, otú a ka m'meworo ha.
12. Ha si ya, Ike gi ab͕u ka ayi ridataworo, inye gi n'aka ndi Filistia. Samson we si ha, Ṅuaranum iyi, ka unu we ghara idakwasim, unu onwe-unu.
13. Ha we gwa ya okwu, si, É-è; kama ayi gēkesi gi ab͕u ike, nye gi n'aka-ha: ma ayi agaghi-eme ka i nwua ma-ọli. Ha we chiri udọ̀ ọhu abua ke ya ab͕u, me ka o si na nkume ahu di elu rigota.
14. Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n'izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, udọ̀ abua nke di n'ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n'ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n'aka-ya abua.
15. O we huta ọkpukpu-àb͕à ọhu nke inyinya-ibu, setipu aka-ya, jide ya, were ya tib͕ue nnù ndikom abua na ọgu iri.
16. Samson we si, Ọkpukpu – àb͕à inyinya – ibu ka m'jiworo, otù obo, obo abua, Ọkpukpu – àb͕à inyinya – ibu ka m'jiworo tib͕u nnù ndikom abua na ọgu iri.
17. O rue, mb͕e o kwubìri okwu, na ọ tupuru ọkpukpu-àb͕à-anu ahu n'aka-ya; o we kpọ ebe ahu Remat-lehi.
18. Akpiri we kpọ ya nku nke-uku, o we kpọkue Jehova, si, Gi onwe-gi esiwo n'aka orù-gi nye nzọputa uku a: ma ub͕u a m'gānwu n'akpiri-ikpọ-nku, dabà n'aka nke ndia anēbìghi úgwù.
19. Chineke we b͕awa olùlù ahu nke di nime Lehi, miri we si nime ya puta; o we ṅua, mọ-ya we biaghachi, o we di ndu; n'ihi ya ọ kpọrọ aha-ya En-hakore, nke di na Lehi, rue ta.
20. Ọ we kpe Israel ikpe na mb͕e ndi Filistia orú arọ.
About Ndi-Ikpe Chapter 15
Read Ndi-Ikpe Chapter 15 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ndi-Ikpe
Chapter: 15
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Ikpe. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ndi-Ikpe Chapter 15 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ndi-Ikpe Chapter 15?
Ndi-Ikpe Chapter 15 is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ndi-Ikpe Chapter 15 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from ndi-ikpe
- Ndi-Ikpe Chapter 13
- Ndi-Ikpe Chapter 14
- Ndi-Ikpe Chapter 18
- Ndi-Ikpe Chapter 11
- Ndi-Ikpe Chapter 2
- Ndi-Ikpe Chapter 7
- Ndi-Ikpe Chapter 16