Aisaia Chapter 38

For English

Read Aisaia Chapter 38 Online

Read Aisaia Chapter 38 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Aisaia and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Aisaia 38

Isi 38

1. Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu.

2. Hezekaia we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova,

3. si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.

4. Okwu Jehova we rue Aisaia nti, si,

5. Je, si Hezekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nātukwasi arọ iri na ise n'ubọchi-gi.

6. M'gānaputa kwa gi na obodo a n'ọbu-aka eze Asiria, b͕ochi kwa obodo a.

7. Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama sitere n'aka Jehova, na Jehova gēme ihe a nke O kwuru:

8. le, M'nēme ka onyinyo nke di n'ebe-nrigo, nke ridaworo n'ebe-nrigo Ehaz site n'anyanwu, ka ọ la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. Anyanwu we la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri n'ebe-nrigo ahu nke ọ ridaworo n'elu ya.

9. Odide-akwukwọ nke Hezekaia eze Juda, mb͕e ọ riara ọria, o we puta N'ọrìa-ya nwe aru-ike.

10. Mu onwem siri, Ọ bu n'idi-jū nke ubọchim nile ka m'ghaghi ila n'ọnu-uzọ-ama nke ala-mọ. Anapuwom arọm fọduru afọdu.

11. Asirim, M'gaghi-ahu Ja, ọbuná Ja n'ala ndi di ndu: M'gaghi-elegide kwa madu anya ọzọ n'etiti ndi bi n'ala ọgwugwu-ndu.

12. Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n'ebe m'nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu: Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum: Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.

13. Edozirim nkpuru-obim rue ututu; dika ọdum, otú a ka Ọ nānyaji ọkpukpum nile: Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.

14. Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe; Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu; Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.

15. Gini ka m'gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya: M'ganēje nwayọ arọm nile n'ihi idi-ilu nke nkpuru-obim.

16. Onye-nwe-ayi, ihe ndia ka madu ji adi ndu, Ọ bu kwa nime ha ka ndu mọm dichasi: I gēme kwa ka aru dim ike; Gi me kwa ka m'di ndu.

17. Le, ihe m'ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m'we nata udo: Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n'anya si-ike, we si n'olùlù nke itọb͕orọ-n'efu dọputam: N'ihi na I tufuru nmehiem nile n'azu Gi.

18. N'ihi na ala-mọ adighi-ekele Gi, ọnwu adighi-eto Gi: Ndi nārida n'olùlù adighi-ele anya ezi-okwu-Gi.

19. Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta: Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi.

20. Jehova ejikerewo izọputam: Ubọ-akwaram nile ka ayi ganākpọ Ubọchi nile nke ndu-ayi n'ulo Jehova.

21. Aisaia we si, Ka ha were mbadamba fig, makwasi ya n'elu ihe-ofifi ahu, ọ gādiri ndu.

22. Hezekaia we si, Gini gābu ihe-iriba-ama na m'gārigoru ulo Jehova n'ubọchi nke-atọ?

About Aisaia Chapter 38

Read Aisaia Chapter 38 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Aisaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Aisaia
Chapter: 38
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Aisaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Aisaia Chapter 38 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Aisaia Chapter 38?

Aisaia Chapter 38 is part of the Book of Aisaia in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Aisaia Chapter 38 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Job Chapter 33

Explore More from Aisaia

  1. Aisaia Chapter 59
  2. Aisaia Chapter 64
  3. Aisaia Chapter 60
  4. Aisaia Chapter 33
  5. Aisaia Chapter 45
  6. Aisaia Chapter 14
  7. Aisaia Chapter 42

Related Chapters & Readings

  1. Ilu Chapter 26
  2. Levitikọs Chapter 16
  3. II. Ndi Kọrint Chapter 1
  4. Jeremaia Chapter 29
  5. Jeremaia Chapter 52
  6. Abù Ọma Chapter 107
  7. II. Samuel Chapter 15
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *