Read Deuteronomi Chapter 23 Online
Read Deuteronomi Chapter 23 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Deuteronomi in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Deuteronomi and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Deuteronomi 23
Isi 23
1. Onye emetara ọnyá site n'ichipia nkpuru-amu-ya, ma-ọbu nke ebipuru amu-ya, agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova.
2. Nwa-iko agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova; ọbuná ọb͕ọ nke-iri ya agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova.
3. Onye Amon ma-ọbu onye Moab agaghi-abà nime kpọkọta Jehova, ọbuna ọb͕ọ nke-iri ha agaghi-abà nime kpọkọta Jehova rue mb͕e ebighi-ebi:
4. n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru unu n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na n'ihi na ha gotara Belam nwa Beoa imegide gi site na Petoa nke Mesọpọtemia, ikọcha gi.
5. Ma Jehova, bú Chineke-gi, ekweghi ige Belam nti; kama Jehova, bú Chineke-gi, b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọrọ gi ngọzi, n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, huru gi n'anya.
6. Achọla udo-ha na ọdi-nma-ha ubọchi-gi nile rue mb͕e ebighi-ebi.
7. Akpọla onye Edom ihe árú; n'ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n'ihi na ọbìa ka i buri n'ala-ya.
8. Umu agāmuru ha, ọb͕ọ nke-atọ ha, gābà nime nkpọkọta Jehova.
9. Mb͕e i nāpu dika ọmuma-ulo-ikwū imegide ndi-iro-gi, i gēdebe kwa onwe-gi pua n'ihe ọjọ ọ bula.
10. Mb͕e nwoke ọ bula di n'etiti unu, nke nādighi ọcha, site n'ihe mere ya n'abali, ọ gāpu kwa je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ọ gaghi-abà n'etiti ọmuma-ulo-ikwū:
11. ma ọ gēru, mb͕e ọ nēru anyasi, na ọ gēwere miri sa aru-ya: mb͕e anyanwu nāda, ọ gābà kwa n'etiti ọmuma-ulo-ikwū.
12. I gēnwe kwa otù ebe n'azu ọmuma-ulo-ikwū ebe i ganāpu je n'ọgwe:
13. i gēnwe kwa osekè n'etiti ihe-agha-gi; ọ gēru kwa, mb͕e i nānọdu n'ọgwe, na i gēwere ya gwue ala, i we chigharia kpochie ihe si n'aru-gi puta:
14. n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nējeghari n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi, inaputa gi, na irara ndi-iro-gi nye n'iru gi; ọmuma-ulo-ikwū-gi gādi kwa nsọ: ka O we ghara ihu n'etiti gi ọtọ ihe ọ bula, we laghachi n'iso gi n'azu.
15. Emechibidola orù nye onye-nwe-ya, bú onye naputaworo onwe-ya n'aka onye-nwe-ya b͕akute gi:
16. ọ gēbiyere gi, n'etiti gi, n'ebe ahu nke ọ gārọputa n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, n'ebe di ya nma: emela ya ihe-ike.
17. Nwayi edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi n'etiti umu-ndinyom Israel, nwoke edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi kwa n'etiti umu-ndikom Israel.
18. Ewebatala onyinye enyere nwayi nākwa iko, ma-ọbu ihe eretara na nkita, n'ulo Jehova, bú Chineke-gi, imezù nkwa ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ha abua bu kwa.
19. Ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma; bú uma nke ego, ma-ọbu uma nke ihe-oriri, ma-ọbu uma nke ihe ọ bula nke anēbinye n'uma:
20. onye ala ọzọ ka i gēbinye ihe n'uma; ma ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi na nseti aka-gi nile, n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.
21. Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n'ikwughachi ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n'aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi.
22. Ma mb͕e i ghara ikwe nkwa, ọ gaghi-abu nmehie nime gi.
23. Ihe nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi puta ka i gēdebe, me kwa; dika i kweworo Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, ọ bu onyinye-afọ-ofufo, nke i kwuworo n'ọnu-gi.
24. Mb͕e ọ bula i nābà n'ubi-vine nke ab͕ata-obi-gi, i gēri kwa nkpuru-vine, dika nkpuru-obi-gi si achọ, nke gēju gi afọ; ma etiyela nkpuru ọ bula n'ihe-gi.
25. Mb͕e ọ bula i nābà n'ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi, i gāghọrọ oko ọka n'aka-gi; ma ewegharila mma-iwe-ihe-ubi n'elu ọka guzoro eguzo nke ab͕ata-obi-gi.
About Deuteronomi Chapter 23
Read Deuteronomi Chapter 23 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Deuteronomi in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Deuteronomi
Chapter: 23
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Deuteronomi. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Deuteronomi Chapter 23 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Deuteronomi Chapter 23?
Deuteronomi Chapter 23 is part of the Book of Deuteronomi in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Deuteronomi Chapter 23 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from Deuteronomi
- Deuteronomi Chapter 22
- Deuteronomi Chapter 15
- Deuteronomi Chapter 11
- Deuteronomi Chapter 21
- Deuteronomi Chapter 34
- Deuteronomi Chapter 31
- Deuteronomi Chapter 5