Ezikiel Chapter 25

For English

Read Ezikiel Chapter 25 Online

Read Ezikiel Chapter 25 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ezikiel and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ezikiel 25

Isi 25

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, che iru-gi n'ebe umu Amon nọ, bue amuma megida ha:

3. si umu Amon, Nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i siri, Ehe, megide ebe nsọm, mb͕e emere ya ka ọ ghara idi nsọ; na imegide ala Israel, mb͕e ọ tọb͕ọrọ n'efu; na imegide ulo Juda, mb͕e ha gara ije biri n'ala ọzọ:

4. n'ihi nka, le, M'gaje iwere gi nye umu Iru-anyanwu ibu ihe ha nwetara, ha gēdo kwa ebe-ulo-ikwū nile ha nime gi, me ebe-obibi nile ha nime gi; ndi ahu gēri nkpuru-gi, ọ bu kwa ndi ahu gāṅu miri-ara-ehi-gi.

5. M'gēme kwa ka Raba ghọ ebe-obibi nke camel, me kwa ka umu Amon ghọ ebe-nmakpu nke ìgwè ewu na aturu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

6. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i kuwo aka, zọ ukwu n'ala, ṅuria ọṅu na nleli-gi nile nime nkpuru-obi-gi megide ala Israel;

7. n'ihi nka, le, Mu onwem esetiwo akam n'aru gi, M'gēwere kwa gi nye ka i ghọrọ mba nile ihe-nluta-n'agha; M'gēbipu kwa gi n'aru ndi nile di iche iche, me ka i si n'ala nile la n'iyì: M'gēkpochapu gi: i we mara na Mu onwem bu Jehova.

8. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Moab na Sia nāsi, Le, ulo Juda di ka mba nile;

9. n'ihi nka, le, M'gaje imeghe akuku Moab site n'obodo ahu nile, site n'obodo-ya nile nke di na nsọtu-ala-ya, nke bu ima-nma nke ala ahu, bú Bet-jeshimot, na Beal-meon, na Kiriataim,

10. nye umu Iru-anyanwu, tiyere umu Amon, M'gēwere kwa ya nye ka ọ buru ihe ha nwetara, ka ewe ghara icheta umu Amon n'etiti mba nile:

11. ọ bu kwa Moab ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

12. Otù a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Edom emegidewo ulo Juda n'ibọ̀ ọ́bọ̀, na n'ihi na ikpe amawo ha nke-uku, ha we bọrọ onwe-ha ọbọ n'aru ha;

13. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.

14. M'gēsi kwa n'aka ndim, bú Israel, tukwasi Edom ibọ̀-ọ́bọ̀m; ha ewe me n'Edom dika iwem si di na dika ọnumam si di: ha ewe mara ibọ̀-ọ́bọ̀m; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ndi Filistia emesowo Juda n'ibọ̀-ọ́bọ̀, bọ̀ ọ́bọ̀ na nlelì nke di nime nkpuru-obi-ha ibibi ya n'iro ebighi-ebi;

16. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iseti akam n'aru ndi Filistia, bipu ndi Keret, me ka ndi ọnu-miri oké osimiri fọduru la n'iyì.

17. M'gēji kwa iba-nba nile nke ọnuma bọ̀ ha ọ́bọ̀ nile di uku; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gātukwasi ha ibọ̀-ọ́bọ̀m.

About Ezikiel Chapter 25

Read Ezikiel Chapter 25 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ezikiel
Chapter: 25
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ezikiel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ezikiel Chapter 25 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ezikiel Chapter 25?

Ezikiel Chapter 25 is part of the Book of Ezikiel in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ezikiel Chapter 25 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Job Chapter 33

Explore More from Ezikiel

  1. Ezikiel Chapter 24
  2. Ezikiel Chapter 40
  3. Ezikiel Chapter 31
  4. Ezikiel Chapter 8
  5. Ezikiel Chapter 42
  6. Ezikiel Chapter 30
  7. Ezikiel Chapter 28

Related Chapters & Readings

  1. Jeremaia Chapter 35
  2. Matiu Chapter 23
  3. I. Ndi-Eze Chapter 18
  4. Aisaia Chapter 44
  5. I. Ndi Kọrint Chapter 14
  6. Deuteronomi Chapter 22
  7. Hosea Chapter 3
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *