Read I. Ndi Kọrint Chapter 6 Online
Read I. Ndi Kọrint Chapter 6 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Kọrint in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Ndi Kọrint and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
I. Ndi Kọrint 6
Isi 6
1. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu, ma asi na o nwere okwu megide ibe-ya, nwere anya-ike ije ikpé n'iru ndi ajọ omume, ma ọ bughi n'iru ndi nsọ?
2. Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi nsọ gēkpe uwa ikpé? ọ buru kwa na agaje ikpe uwa n'iru unu, ùnu ekwesighi inọ dika ndi-ikpé n'ulo-ikpé dikarisiri ntà?
3. Ùnu amataghi na ayi gēkpe ndi-mọ-ozi ikpé? àyi gēsi aṅa ghara inwe ike ikpe ihe nke ndu a?
4. Ya mere asi na unu nwere ulo-ikpé diri ndu a n'ezie, menu ka ndi ahu nọdu dika ndi-ikpé, bú ndi anākpọ ihe-efu n'etiti nzukọ Kraist.
5. Anamekwu nka ka m'me unu ihe-ihere n'iru. Ọ̀ di otú a, na ọ dighi otù onye mara ihe nọ n'etiti unu, onye gāpu ikpe ikpé n'etiti nwa-nna-ya na ibe-ya,
6. kama nwa-nna nēwere nwa-nna-ya je ikpé, nka bu kwa n'iru ndi nēkweghi ekwe?
7. Ezie ọ bu nọ̄ ila-ala n'ebe unu nọ ọbuná ub͕u a, na unu nwere okwu ikpé n'etiti onwe-unu. Kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emegide unu ajọ omume? kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emeb͕ue unu?
8. É-è, kama unu onwe-unu nēme ajọ omume, nēmeb͕u kwa, nka ka unu nēme kwa umu-nna-unu.
9. Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,
10. ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.
11. Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.
12. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem.
13. Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi:
14. ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie.
15. Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela.
16. Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru.
17. Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.
18. B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.
19. Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;
20. n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.
About I. Ndi Kọrint Chapter 6
Read I. Ndi Kọrint Chapter 6 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Kọrint in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: I. Ndi Kọrint
Chapter: 6
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Ndi Kọrint. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading I. Ndi Kọrint Chapter 6 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is I. Ndi Kọrint Chapter 6?
I. Ndi Kọrint Chapter 6 is part of the Book of I. Ndi Kọrint in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete I. Ndi Kọrint Chapter 6 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6
Explore More from i-ndi-kọrint
- I. Ndi Kọrint Chapter 15
- I. Ndi Kọrint Chapter 1
- I. Ndi Kọrint Chapter 7
- I. Ndi Kọrint Chapter 3
- I. Ndi Kọrint Chapter 12
- I. Ndi Kọrint Chapter 8
- I. Ndi Kọrint Chapter 11