Jọn Chapter 8

For English

Read Jọn Chapter 8 Online

Read Jọn Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jọn and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Jọn 8

Isi 8

1. ma Jisus gara ugwu Olive.

2. O we bia kwa ọzọ n'isi-ututu n'ulo uku Chineke, ndi-Ju nile we biakute Ya; O we nọdu ala, we nēzí ha ihe.

3. Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we kuta otù nwanyi nke ejidereri n'ikwa-iko; mb͕e ha guzosiri ya n'etiti,

4. ha we si Ya, Onye-ozizí, ejidewo nwanyi a n'ikwa-iko, mb͕e ọ nēme ihe ahu.

5. Ma n'iwu-ayi Moses nyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya?

6. Ma nka ka ha nēkwu inwa Ya, ka ha we nwe ihe ha gēji bo Ya ebubo. Ma Jisus ruru ala, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala.

7. Ma mb͕e ha nọgidere nāju Ya, O welie Onwe-ya elu, si ha, Onye akēmehieghi n'etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume.

8. O we ruru kwa ala ọzọ, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala.

9. Ma mb͕e ha nuru ya ha pua n'otù n'otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpe-azu: ewe rapu nání Jisus, Ya na nwanyi ahu, ebe o guzoro, n'etiti.

10. Jisus we welie Onwe-ya elu, si ya, Nwanyi, òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé?

11. O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n'ub͕u a adila nēmehie ọzọ.

12. Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n'ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu.

13. Ya mere ndi-Farisi siri Ya, Gi onwe-gi nāb͕ara Onwe-gi àmà; àmà nke Gi abughi ezie.

14. Jisus zara, si ha, Asi kwa na Mu onwem b͕ara Onwem àmà, àmà nkem bu ezie; n'ihi na amataram ebe M'siri bia, na ebe M'nāla; ma unu onwe-unu amataghi ebe M'si bia, ma-ọbu ebe M'nāla.

15. Unu onwe-unu nēkpe dika anu-aru si di; Mu onwem ekpeghi onye ọ bula.

16. Ma ọ buru na mu onwem ekpe kwa ikpé, ikpém bu ezie; n'ihi na ọ bughi nání Mu nọ, kama ọ bu Mu onwem na Nna Nke ziterem.

17. Ma edewo kwa n'akwukwọ iwu-unu, na àmà nke madu abua bu ezie.

18. Mu onwem bu onye nāb͕ara Onwem àmà, Nna Nke ziterem nāb͕a-kwa-ram àmà.

19. Ya mere ha si Ya, Òle ebe Nna-Gi di? Jisus zara, si, Unu amataghi m, unu amataghi kwa Nnam: ọ buru na unu mataram, unu gāmata-kwa-ri Nnam.

20. Okwu ndia ka O kwuru n'ebe anēdebe ùtú anātu, mb͕e Ọ nēzí ihe n'ulo uku Chineke: ọ dighi kwa onye ọ bula jidere Ya; n'ihi na oge hour Ya akābiarughi.

21. Ya mere Ọ siri ha ọzọ, Mu onwem nāla, unu gāchọkwam, unu gānwu kwa na nmehie-unu: ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia.

22. Ya mere ndi-Ju nāsi, Ò gēb͕u Onwe-ya, na Ọ nāsi, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia?

23. O we si ha, Unu onwe-unu si n'ebe di ala puta; Mu onwem si n'ebe di elu puta: unu onwe-unu si n'uwa nka puta; Mu onwem esighi n'uwa nka puta.

24. Ya mere M'siri unu, na unu gānwu na nmehie nile unu: n'ihi na ọ buru na unu ekweghi na Mu onwem bu Ya, unu gānwu na nmehie nile unu.

25. Ya mere ha nāsi Ya, Gì onwe-gi bu onye? Jisus siri ha, Ọbuná ihe M'nāgwa kwa unu site na mbu.

26. Enwerem ọtutu ihe M'gēkwu nke M'gēkpe kwa bayere unu: ma Onye ziterem bu ezie; ihe Mu onwem nu-kwa-ra n'ọnu Ya, ihe ndia ka M'nāgwa uwa.

27. Ha amaghi na Ọ nāgwa ha okwu bayere Nna-Ya.

28. Ya mere Jisus siri, Mb͕e ọ bula unu gēweliwori Nwa nke madu elu, mb͕e ahu ka unu gāmara na Mu onwem bu Ya, na ọ dighi kwa ihe M'nēme n'Onwem, kama dika Nnam zírim, otú a ka m'nēkwu ihe ndia.

29. Mu na Onye ziterem nọ kwa; Ọ rapughi nání Mu; n'ihi na Mu onwem nēme ihe nātọ Ya utọ mb͕e nile.

30. Mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, ọtutu madu kwere na Ya.

31. Ya mere Jisus nāsi ndi-Ju ndi kwere-Ya-ri, Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n'okwum, unu bu ndi nēso uzọm n'ezie;

32. unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n'orù.

33. Ha zara Ya, si, Ayi bu nkpuru Abraham, ọ kādighi kwa mb͕e ọ bula ayi bu orù onye ọ bula: Gì onwe-gi si aṅa kwu, Agēme ka unu pua n'orù?

34. Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye ọ bula nke nēmehie bu orù nmehie.

35. Ma orù adighi-anọgide n'ulo rue mb͕e ebighi-ebi: nwa nānọgide ebighi-ebi.

36. Ya mere ọ buru na Ọkpara gēme ka unu pua n'orù, unu gābu ndi puworo n'orù n'ezie.

37. Amataram na unu bu nkpuru Abraham; ma unu nāchọ uzọ ib͕um, n'ihi na okwum enweghi ọnọdu nime unu.

38. Anamekwu ihe Mu onwem huworo n'ebe Nnam nọ: ya mere unu onwe-unu nēme kwa ihe unu nuru n'ọnu nna-unu.

39. Ha zara, si Ya, Nna-ayi bu Abraham. Jisus si ha, Ọ buru na unu bu umu Abraham, unu gālu ọlu Abraham.

40. Ma ub͕u a unu nāchọ uzọ ib͕um, bú Madu Nke gwaworo unu ezi-okwu, nke M'nuru n'ọnu Chineke: nka ka Abraham nēmeghi.

41. Unu onwe-unu nālu ọlu nna-unu. Ha siri Ya, Amughi ayi onwe-ayi site n'ikwa-iko otù Nna ka ayi nwere, bú Chineke.

42. Jisus siri ha, Ọ buru na Chineke bu Nna-unu, unu gāhum n'anya: n'ihi na Mu onwem siri n'ebe Chineke nọ puta we bia; n'ihi na abiaghm n'Onwem, kama Ya onwe-ya ziterem.

43. N'ìhi gini ka unu nāmaghi ihe M'nēkwu? Ọ bu n'ihi na unu apughi inu okwum.

44. Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.

45. Ma n'ihi na Mu onwem nēkwu ezi-okwu, unu ekweghm.

46. Ònye nime unu turum nmehie n'anya? Ọ buru na M'nēkwu ezi-okwu, n'ìhi gini ka unu onwe-unu nēkweghm?

47. Onye sitere na Chineke nānu okwu Chineke: n'ihi nka ka unu onwe-unu nānughi ha, n'ihi na unu esiteghi na Chineke.

48. Ndi-Ju zara, si Ya, Àyi onwe-ayi ekwughi nke-ọma, si na Gi onwe-Gi bu Onye Sameria, I nwe-kwa-ra mọ ọjọ?

49. Jisus zara, si, Mu onwem enweghi mọ ọjọ; kama anamasọpuru Nnam, unu onwe-unu nēmekwam ihe-ihere.

50. Ma Mu onwem achọghi otuto nkem: otù Onye di Nke nāchọ nēkpe kwa ikpé.

51. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-ahu ọnwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.

52. Ndi-Ju siri Ya, Ub͕u a ka ayi mara na I nwere mọ ọjọ. Abraham nwuru, na ndi-amuma; ma Gi onwe-gi nāsi, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.

53. Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Abraham uku, onye nwuru anwu? ndi-amuma nwu-kwa-ra: ònye ka I nēme Onwe-gi?

54. Jisus zara, si, Ọ buru na Mu onwem enye Onwem otuto, otuto nkem bu ihe-efu: Nnam bu Onye nēnyem otuto; Onye unu onwe-unu nāsi, na Ọ bu Chineke-unu;

55. unu amaghi kwa Ya; ma Mu onwem matara Ya; ọ buru kwa na agamasi, Amataghm Ya, M'gēyi unu, buru onye-ugha: ma amataram Ya, nēdebe kwa okwu-Ya.

56. Obi tọrọ nna-unu Abraham utọ nke-uku ihu ub͕ọchim; o we hu ya, ṅuri kwa ọṅu.

57. Ya mere ndi-Ju siri Ya, I kāb͕aghi ọgu arọ abua na iri, Ì huwo kwa Abraham?

58. Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mb͕e akāmughi Abraham Mu onwem di.

59. Ya mere ha tuturu nkume itu Ya: ma Jisus zobere Onwe-ya, we si n'ulo uku Chineke pua.

About Jọn Chapter 8

Read Jọn Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Jọn
Chapter: 8
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jọn. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Jọn Chapter 8 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Jọn Chapter 8?

Jọn Chapter 8 is part of the Book of Jọn in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Jọn Chapter 8 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from jọn

  1. Jọn Chapter 9
  2. Jọn Chapter 21
  3. Jọn Chapter 3
  4. Jọn Chapter 20
  5. Jọn Chapter 16
  6. Jọn Chapter 5
  7. Jọn Chapter 6

Related Chapters & Readings

  1. II. Ihe Emere Chapter 10
  2. Luk Chapter 16
  3. Nkpugh Chapter 3
  4. Ezikiel Chapter 31
  5. Ndi Efesọs Chapter 2
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 23
  7. Ọpupu Chapter 27
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *