Jọn Chapter 2

For English

Read Jọn Chapter 2 Online

Read Jọn Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jọn and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Jọn 2

Isi 2

1. N'ubọchi nke-atọ ọlulu-nwunye di na Kena nke Galili; nne Jisus nọ kwa n'ebe ahu:

2. ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n'ọlulu-nwunye ahu.

3. Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine.

4. Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi.

5. Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya.

6. Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù.

7. Jisus si ha, Were miri b͕ajue ite-miri ndia. Ha we b͕ajupu ha n'ọnu.

8. O we si ha, Kuputanu ub͕u a, bugara onye-isi oriri. Ha we būru ya.

9. Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu,

10. si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a.

11. Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.

12. Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi.

13. Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem.

14. Ọ we hu n'ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala:

15. O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n'ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru;

16. Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n'ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia.

17. Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n'akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam.

18. Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia?

19. Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu.

20. Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n'ubọchi atọ?

21. Ma Ya onwe-ya nēkwu okwu bayere ulo nsọ nke bu aru-Ya.

22. Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru.

23. Ma mb͕e Ọ nọ na Jerusalem n'ememe ngabiga, n'ememe ahu, ọtutu madu kwere n'aha-Ya, n'ihi na ha nāhu ihe-iriba-ama-Ya nile nke Ọ nēme.

24. Ma Jisus onwe-ya araraghi Onwe-ya nye n'aka-ha na ntukwasi-obi, n'ihi na Ọ mara madu nile,

25. ya na n'ihi na ọ dighi Ya nkpà ka onye ọ bula b͕ara madu àmà; n'ihi na Ya onwe-ya mara ihe di nime madu.

About Jọn Chapter 2

Read Jọn Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Jọn
Chapter: 2
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jọn. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Jọn Chapter 2 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Jọn Chapter 2?

Jọn Chapter 2 is part of the Book of Jọn in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Jọn Chapter 2 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 1
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from jọn

  1. Jọn Chapter 15
  2. Jọn Chapter 18
  3. Jọn Chapter 9
  4. Jọn Chapter 16
  5. Jọn Chapter 13
  6. Jọn Chapter 11
  7. Jọn Chapter 6

Related Chapters & Readings

  1. II. Samuel Chapter 9
  2. II. Ndi Tesalọnaika Chapter 3
  3. Aisaia Chapter 20
  4. I. Samuel Chapter 8
  5. Jenesis Chapter 9
  6. Rut Chapter 3
  7. II. Timọti Chapter 1
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *