Matiu Chapter 19

For English

Read Matiu Chapter 19 Online

Read Matiu Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Matiu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Matiu 19

Isi 19

1. O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, O si na Galili zọlie, bia n'ókè-ala Judia n'ofè Jọdan;

2. oké ìgwè madu we so Ya; O we me ka aru-ha di ike n'ebe ahu.

3. Ndi-Farisi we biakute Ya, nānwa Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya n'ihi ihe nile ọ bula?

4. O we za, si, Ùnu agughi na Onye kère ha site na nmalite mere ha nwoke na nwayi,

5. we si, N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru?

6. Ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala.

7. Ha si Ya, Gini kwa ka Moses ji nye iwu inye akwukwọ nkewa, na irapu ya?

8. Ọ si ha, Ọ bu n'ihi obi-etili-unu ka Moses kwere ka unu rapu nwunye-unu: ma site na nmalite adighi-eme otú a.

9. Ma asim unu, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko: onye nke gālu nwanyi ahu mb͕e arapuworo ya nākwa kwa iko.

10. Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Ọ buru na okwu di otú a n'etiti nwoke na nwunye-ya, ọ baghi urù ilu nwunye.

11. Ma Ọ siri ha, Ọ bughi madu nile nānagide okwu a, kama ọ bu ndi enyeworo ya.

12. N'ihi na ndi-onozi di, ndi amuru otú a site n'afọ nne-ha: ndi-onozi di kwa, ndi emere onozi site n'aka madu: ndi-onozi di kwa, ndi mere onwe-ha onozi n'ihi ala-eze elu-igwe. Onye puru inagide ya, ya nagide.

13. Mb͕e ahu ekutara Ya umu-ntakiri, ka O we bikwasi ha aka-Ya abua, kpe kwa ekpere: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba.

14. Ma Jisus siri, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi di otú a.

15. O we bikwasi ha aka-Ya abua, si n'ebe ahu pua.

16. Ma le, otù onye biakutere Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu ezi ihe gini ka m'gēme, ka m'we nwe ndu ebighi-ebi?

17. Ma Ọ siri ya, Gini mere i nājum ajuju bayere nke bu ezi ihe? Otù Onye di Nke bu ezi Onye: ma ọ buru na i nāchọ ibà nime ndu ahu, debe ihe nile enyere n'iwu.

18. Ọ si Ya, Òle? Jisus we si, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha,

19. Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.

20. Nwa-okorọbia ahu si Ya, Ihe ndia nile ka m'ribara ama: gini fọdurum ọzọ ime?

21. Jisus siri ya, Ọ buru na i nāchọ ka i zue okè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.

22. Ma mb͕e nwa-okorọbia ahu nuru okwu a, ọ lara na nwuta: n'ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne.

23. Jisus we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ezie asim unu, Ọ diri ọgaranya ike ibà n'ala-eze elu-igwe.

24. Ọzọ kwa, asim unu, Ọ dikarari camel nfé igabiga n'anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke.

25. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ibobo nwuru ha n'aru ri nne, ha si, Ònye kwa ka apuru izọputa?

26. Ma Jisus lere ha anya, si ha, N'ebe madu nọ nka bu ihe anāpughi ime; ma apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ.

27. Mb͕e ahu Pita zara, si Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, we so Gi; gini kwa ka ayi gēnwe?

28. Jisus we si ha, N'ezie asim unu, na unu onwe-unu ndi sorom, n'imu-ọzọ ahu, mb͕e ọ bula Nwa nke madu gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya, unu onwe-unu gānọkwasi kwa n'oche-eze iri na abua, nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.

29. Ọzọ, onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne ndikom, ma-ọbu umu-nne ndinyom, ma-ọbu nna, ma-ọbu nne, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihi aham, ọ gānata ọgu ise ọgu ise, keta kwa ndu ebighi-ebi.

30. Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ.

About Matiu Chapter 19

Read Matiu Chapter 19 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Matiu
Chapter: 19
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Matiu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Matiu Chapter 19 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Matiu Chapter 19?

Matiu Chapter 19 is part of the Book of Matiu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Matiu Chapter 19 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from matiu

  1. Matiu Chapter 27
  2. Matiu Chapter 4
  3. Matiu Chapter 3
  4. Matiu Chapter 22
  5. Matiu Chapter 23
  6. Matiu Chapter 2
  7. Matiu Chapter 12

Related Chapters & Readings

  1. I. Ndi-Eze Chapter 10
  2. I. Ihe Emere Chapter 9
  3. Matiu Chapter 10
  4. Job Chapter 1
  5. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 12
  6. Abù Ọma Chapter 43
  7. Aisaia Chapter 52
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *