Read II. Jọn Chapter 1 Online
Read II. Jọn Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Jọn in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Jọn and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
II. Jọn 1
Isi 1
1. Okenye nēdegara nwanyi-nwe-madu, bú onye arọputaworo, akwukwọ, ya na umu-ya, ndi mu onwem nāhu n'anya n'ezi-okwu; ọ bughi kwa nání mu onwem, kama ọ bu kwa ndi nile ndi maworo ezi-okwu ahu;
2. n'ihi ezi-okwu ahu nke nānọgide nime ayi, ọ gādiye-kwa-ra ayi rue mb͕e ebighi-ebi:
3. Amara, ebere, udo gādiyere ayi site n'ebe Chineke, bú Nna-ayi, nọ, site kwa n'ebe Jisus Kraist nọ, bú Ọkpara nke Nna-ayi, nime ezi-okwu na ihu-n'anya.
4. Anamaṅuri ọṅu nke-uku na ahuwom ufọdu n'etiti umu-gi ka ha nējeghari nime ezi-okwu, dika ayi natara ihe enyere n'iwu n'aka Nna-ayi.
5. Anamariọ kwa gi ub͕u a, nwanyi-nwe-madu, ọ bughi dika agāsi na anamedegara gi ihe ọhu enyere n'iwu n'akwukwọ, kama ọ bu nke ayi nwere site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya.
6. Ihu-n'anya ahu bu kwa nka, ka ayi nējeghari dika ihe nile O nyere n'iwu si di. Ihe ahu enyere n'iwu bu nka, dika unu nuru site na mbu, ka unu nējeghari nime ya.
7. N'ihi na ọtutu ndi-nduhie apuwo ba nime uwa, bú ndi nādighi-ekwuputa na Jisus Kraist nābia n'anu-aru. Nka bu onye-nduhie ahu na onye ahu nēmegide Kraist.
8. Lezienu onwe-unu anya, ka unu we ghara ila ọlu ayi luru n'iyì, kama ka unu we nata ugwọ-ọlu zuru ezù.
9. Onye ọ bula nke nāga n'iru, nke nādighi-anọgide kwa nime ozizí nke Kraist-ayi, o nweghi Chineke: onye nānọgide nime ozizí ahu, onye ahu nwere Nna ahu, Ya na Ọkpara-Ya.
10. Ọ buru na onye ọ bula abiakute unu, ma ọ wetaghi ozizí a, unu akpọbatala ya n'ulo, unu asi-kwa-la ya biri nke-ọma:
11. n'ihi na onye nāsi ya biri nke-ọma nēso ya n'inwekọ ọlu-ya nile, nke bu ajọ ọlu.
12. Ebe m'nwere ọtutu ihe idegara unu n'akwukwọ, ezubeghm iwere akwukwọ na ink de ha: kama anamele anya na m'gābiaru unu aru, were kwa ọnu gwa unu okwu, ka ewe mezu ọṅù-unu.
13. Umu nwa-nna-gi nwanyi, bú onye arọputaworo, nēkele gi.
About II. Jọn Chapter 1
Read II. Jọn Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Jọn in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: II. Jọn
Chapter: 1
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Jọn. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading II. Jọn Chapter 1 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is II. Jọn Chapter 1?
II. Jọn Chapter 1 is part of the Book of II. Jọn in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete II. Jọn Chapter 1 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Nkpugh Chapter 4
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 6
- Nkpugh Chapter 7