Read Jọn Chapter 9 Online
Read Jọn Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jọn and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Jọn 9
Isi 9
1. Mb͕e Ọ nāgabiga, Ọ hu otù nwoke nke kpuru ìsì site n'ọmumu-ya.
2. Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Rabai, ònye mehiere, onye a, ma-ọbu ndi muru ya, nke mere ka amua ya n'ìsì?
3. Jisus zara, si, Onye a emehieghi, ndi muru ya emehieghi kwa: kama ka ọlu Chineke we puta ìhè n'aru ya.
4. Ayi aghaghi ilu ọlu Onye ziterem, mb͕e ubọchi fọduru: abali nābia, mb͕e ọ dighi onye ọ bula puru ilu ọlu.
5. Mb͕e ọ bula M'nọ n'uwa, abum Ìhè nke uwa.
6. Mb͕e O kwusiri ihe ndia, Ọ bua ọnu-miri n'ala, were ọnu-miri ahu gwọ ájá, were ájá ahu te n'anya-ya abua,
7. si ya, Je sa miri n'ọdọ-miri ntà nke Sailoam (nke bu, ma asugharia ya, Onye eziteworo). Ya mere O jere, sa miri, bia kwa nāhu uzọ.
8. Ya mere ndi-ab͕ata-obi-ya, na ndi nāhu ya-ri n'oge gara aga, na ọ bu onye-aririọ, ha nāsi, Onye a, ọ̀ bughi onye nānọ ala nāriọ kwa aririọ?
9. Ndi ọzọ nāsi, Ọ bu ya; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama o yiri ya. Ya onwe-ya siri, Mu onwem bu ya.
10. Ya mere ha nāsi ya, Èsi kwa aṅa meghe anya-gi?
11. Onye ahu zara, si, Nwoke ahu anākpọ Jisus gwọrọ ájá, te kwa ya n'anyam abua, sim, Je Sailoam, sa miri: ya mere ejerem, sa miri, ewe me ka M'hu uzọ.
12. Ha si ya, Òle ebe Onye ahu nọ? Ọ si, Amataghm.
13. Ha kutara ndi-Farisi onye ahu nke kpuru ìsì n'oge gara aga.
14. Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi Jisus gwọrọ ájá, we meghe anya-ya.
15. Ya mere ndi-Farisi ju-kwa-ra ya ọzọ otú emere ọ hu uzọ. Ọ si ha, Ọ tukwasiri ájá n'anyam abua, m'we sa miri, nāhu kwa uzọ.
16. Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha.
17. Ya mere ha si onye-ìsì ahu ọzọ, Gini ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ya, n'ihi na O meghere anya-gi? Ọ si, Ọ bu onye-amuma.
18. Ya mere ndi-Ju ekweghi okwu bayere ya, na o kpururi ìsì, na eme-kwa-ra ya ka ọ hu uzọ, rue mb͕e ha kpọrọ ndi muru onye ahu emere ka ọ hu uzọ,
19. we jua ha, si, Onye a, ọ̀ bu nwa-unu, onye unu nāsi na amuru ya n'ìsì? ò si kwa aṅa hu uzọ ub͕u a?
20. Ndi muru ya zara, si, Ayi matara na onye a bu nwa-ayi, na amu-kwa-ra ya n'ìsì:
21. ma otú ọ nāhu uzọ ub͕u a, ayi amataghi; ma-ọbu onye meghere anya-ya, ayi onwe-ayi amatagh: juana ya; o ruwo dìnkpà; ya onwe-ya gēkwuru onwe-ya.
22. Ihe ndia ka ndi muru ya kwuru, n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na ndi-Ju kwekọrọri n'etiti onwe-ha ub͕u a, ka esi n'ulo-nzukọ chupu onye ọ bula, ma ọ buru na ọ gēkwuputa na Ọ bu Kraist.
23. N'ihi nka ndi muru ya siri, O ruwo dìnkpà; juana ya.
24. Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie.
25. Ya mere onye ahu zara, si, Ma Ọ bu onye-nmehie, amataghm: otù ihe ka m'matara, na, ebe m'kpururi ìsì, ub͕u a anamahu uzọ.
26. ya mere ha siri ya, Gini ka O mere gi? Ò si aṅa meghe anya-gi?
27. Ọ zara ha, si, Agwaram unu ọbuná ub͕u a, ma unu anugh: gini mere unu nāchọ inu ya ọzọ? ùnu onwe-unu nāchọ kwa ighọ ndi nēso uzọ-Ya?
28. Ha we kwutọ ya, si, Gi onwe-gi bu onye nēso uzọ Onye ahu; ma ayi onwe-ayi bu ndi nēso uzọ Moses.
29. Ayi onwe-ayi matara na Chineke agwawo Moses okwu: ma Onye a, ayi amataghi ebe O si puta.
30. Nwoke ahu zara, si ha, Ekwula, n'ihi na ihe-ebube di na nka, na unu onwe-unu amataghi ebe O si puta, ma Ọ meghere anyam.
31. Ayi matara na Chineke adighi-anu olu ndi-nmehie: kama ọ buru na onye ọ bula bu onye nēbi isi ala nye Chineke, nēme kwa ihe Ọ nāchọ, onye ahu ka Ọ nānu.
32. Site na nmalite oge a ọ dighi mb͕e anuru na onye ọ bula meghere anya onye amuru n'ìsì.
33. Ọ buru na Onye a esiteghi n'ebe Chineke nọ, Ọ pughi ime ihe ọ bula.
34. Ha zara, si ya, Amuru gi onwe-gi nime nmehie, ọ̀ bu gi onwe-gi nēzí kwa ayi ihe? Ha we chupu ya n'èzí.
35. Jisus nuru na ha chupuru ya-ri n'èzí; O we chọta ya, si, Gì onwe-gi kwere n'Ọkpara Chineke?
36. Onye ahu zara, si, Ọ̀ bu kwa onye, Onye-nwe-ayi, ka m'we kwere na Ya?
37. Jisus siri ya, I huwo Ya, Onye gi na Ya nēkwu okwu bu kwa Onye ahu.
38. O we si, Onye-nwe-ayi, ekwem. O we kpọ isi ala nye Ya.
39. Jisus we si, Ọ bu ikpé ka Mu onwem ji bia n'uwa nka, ka ndi nāhughi uzọ we hu; ka ndi huru uzọ we ghọ kwa ndi-ìsì.
40. Ndi di n'etiti ndi-Farisi ndi ha na Ya nọ nuru ihe ndia, ha we si Ya, Àyi onwe-ayi kpu-kwa-ra?
41. Jisus siri ha, Ọ buru na unu kpuru ìsì, unu agaghi-enwe nmehie: ma ub͕u a unu nāsi, Ayi nāhu uzọ: nmehie-unu nānọgide.
About Jọn Chapter 9
Read Jọn Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jọn in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Jọn
Chapter: 9
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jọn. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Jọn Chapter 9 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Jọn Chapter 9?
Jọn Chapter 9 is part of the Book of Jọn in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Jọn Chapter 9 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6