I. Samuel Chapter 3

For English

Read I. Samuel Chapter 3 Online

Read I. Samuel Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Samuel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Samuel and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

I. Samuel 3

Isi 3

1. Nwata ahu, bú Samuel, we nējere Jehova ozi n'iru Ilai. Okwu Jehova we di oké ọnu na mb͕e ahu; ọ dighi ọhù ekwusara.

2. O rue, n'ubọchi ahu, mb͕e Ilai nēdina ala n'ebe-ya, (ma anya-ya malitere ihu inyoghi-inyoghi, na ọ pughi ihu uzọ,)

3. mb͕e oriọna Chineke akānyughi anyu, mb͕e Samuel nēdina ala n'ulo ukwu Jehova, ebe ib͕e Chineke di;

4. na Jehova kpọrọ Samuel òkù: o we si, Lem.

5. O we b͕akuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù; jeghachi dina ala. O we je dina ala.

6. Jehova we kpọ kwa òkù ọzọ, si, Samuel. Samuel we bilie jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù, nwam; jeghachi dina ala.

7. Ma Samuel akāmaghi Jehova, akēkpugheghi kwa okwu Jehova nye ya.

8. Jehova we kpọ Samuel òkù ọzọ nke ub͕ò atọ. O we bilie, jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ilai we ghọta na Jehova nākpọ nwa-okoro ahu òkù.

9. Ilai we si Samuel, Je, dina ala: ọ gēru kwa, ọ buru na Ọ kpọ gi òkù, na i gāsi, Kwue, Jehova; n'ihi na orù-Gi nānu. Samuel we je, dina ala n'ebe-ya.

10. Jehova we bia, guzo Onwe-ya, kpọ òkù dika Ọ kpọrọ ub͕ò nile, si, Samuel, Samuel. Samuel we si, Kwue; n'ihi na orù-Gi nānu.

11. Jehova we si Samuel, Le, Mu onwem nēme ihe n'Israel, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.

12. N'ubọchi ahu M'gēme ka okwu nile M'kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu.

13. Egosiwokwam ya na Mu onwem nēkpe ulo-ya ikpe rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ajọ omume nke ọ mara, n'ihi na umu-ya ndikom nēwetara onwe-ha nkọcha, ma o b͕ochighi ha.

14. N'ihi ya M'we ṅuara ulo Ilai iyi, na agaghi-ewere àjà ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma kpuchie ajọ omume ulo Ilai rue mb͕e ebighi-ebi.

15. Samuel we dina ala rue ututu, we meghepu ọnu-uzọ ulo Jehova. Ma Samuel turu egwu igosi Ilai ọhù ahu.

16. Ilai we kpọ Samuel, si, Samuel, nwam. O we si, Lem.

17. Ọ si, Gini bu okwu ahu nke Ọ gwara gi? biko, ezonarilam ya: Chineke me gi otú a, me kwa gi ihe ọzọ otú a, ọ buru na i zonarim okwu ọ bula sitere n'okwu nile nke Ọ gwara gi.

18. Samuel we gosi ya okwu ahu nile, ọ dighi kwa ihe o zonariri ya. O we si, Jehova ka ọ bu: Ya me ihe di nma n'anya-Ya.

19. Samuel we tó, Jehova nọye-kwa-ra ya, Ọ kweghi kwa ka okwu da n'ala sitere n'okwu-ya nile.

20. Israel nile site na Dan we rue Bia-sheba we mara na emewo Samuel onye kwesiri okwukwe iburu Jehova onye-amuma.

21. Jehova we me ka ahú kwa ya anya ọzọ nime Shailo: n'ihi na Jehova kpughere Onwe-ya nye Samuel nime Shailo n'okwu Jehova.

About I. Samuel Chapter 3

Read I. Samuel Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Samuel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: I. Samuel
Chapter: 3
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Samuel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading I. Samuel Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is I. Samuel Chapter 3?

I. Samuel Chapter 3 is part of the Book of I. Samuel in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete I. Samuel Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from i Samuel

  1. I. Samuel Chapter 4
  2. I Samuel Chapter 20
  3. I Samuel Chapter 28
  4. I Samuel Chapter 10
  5. I Samuel Chapter 12
  6. I. Samuel Chapter 7
  7. I. Samuel Chapter 11

Related Chapters & Readings

  1. Jenesis Chapter 29
  2. II. Ihe Emere Chapter 33
  3. Eklisiastis Chapter 9
  4. Daniel Chapter 5
  5. Ezikiel Chapter 8
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 3
  7. Habakuk Chapter 2
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *