Read Abù Ọma Chapter 73 Online
Read Abù Ọma Chapter 73 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Abù Ọma and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Abù Ọma 73
Isi 73
1. N'ezie Chineke di nma n'ebe Israel nọ, Bú n'ebe ndi di ọcha n'obi nọ.
2. Ma mu onwem, ọ fọduru nwantī ka ukwum abua wezuga onwe-ha; Nzọ-ukwum fọduru nke-ntà ka ha b͕uchapu.
3. N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo, Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu.
4. N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha: Ma aru-ha mara abuba.
5. Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ; Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile.
6. N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu; Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe.
7. Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa: Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè.
8. Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n'ihe ọjọ: Ha nēsi n'ebe di elu kwu okwu.
9. Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe, Ire-ha nējeghari kwa n'uwa.
10. N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a, Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ.
11. Ha we si, Chìneke si aṅa mara? Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu?
12. Le, ndia bu ndi nēmebi iwu; Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù.
13. Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha, N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ;
14. Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile, Onye iba-nbam di kwa-n'ututu.
15. Ọ buru na asiwom, M'gākọ akukọ otú a; Le, ọ bu ọb͕ọ nke umu-Gi ka m'gāghọb͕uwori.
16. M'we chè èchìchè imata nka, Ndọb͕u-onwem-n'ọlu ka ọ bu n'anyam;
17. Rue mb͕e m'nābà n'ebe nsọ nile nke Chineke, Ghọta ikpe-azu-ha.
18. N'ezie ọ bu n'ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha: I mewo ka ha darue ntikpọ.
19. Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya? Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche.
20. Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura; Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.
21. N'ihi na obim nāb͕ari uka, Ọ nādutukwam ogwu n'akurum abua.
22. Ma mu onwem bu anu-ọhia, amaghkwam ihe; Nání anu ka m'buworo n'iru Gi.
23. Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile: I jidewo aka-nrim.
24. I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum, Emesia I gēji kwa nsọpuru naram.
25. Ọ̀nye k m'nwere n'elu-igwe ma-ọbughi Gi? Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n'uwa.
26. Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.
27. N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko.
28. Ma mu onwem, ibiaru Chineke nso dim nma: Edowom ebe-nb͕abàm n'Onye-nwe-ayi, bú Jehova, Ka m'we kọ akukọ bayere ije-ozi-Gi nile.
About Abù Ọma Chapter 73
Read Abù Ọma Chapter 73 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Abù Ọma in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Abù Ọma
Chapter: 73
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Abù Ọma. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Abù Ọma Chapter 73 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Abù Ọma Chapter 73?
Abù Ọma Chapter 73 is part of the Book of Abù Ọma in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Abù Ọma Chapter 73 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Abù Ọma
- Abù Ọma Chapter 10
- Abù Ọma Chapter 3
- Abù Ọma Chapter 146
- Abù Ọma Chapter 98
- Abù Ọma Chapter 112
- Abù Ọma Chapter 147
- Abù Ọma Chapter 124
Explore More from Agba Ochie
- I. Samuel Chapter 26
- Jeremaia Chapter 21
- Esta Chapter 6
- Ọpupu Chapter 23
- Ọpupu Chapter 2
- Abù Ọma Chapter 87
- Ezikiel Chapter 21