Daniel Chapter 8

For English

Read Daniel Chapter 8 Online

Read Daniel Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Daniel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Daniel and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Daniel 8

Isi 8

1. N'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Belshaza, bú eze, emere ka m'hu ọhù, bú mu onwem Daniel, mb͕e ọhù ahu nke emere ka m'hu ya n'isi-nmalite gasiri.

2. M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.

3. M'we welie anyam, hu, ma, le, otù ebulu nēguzo n'iru osimiri ahu nke nwere mpi abua: mpi abua ahu di kwa elu, ma otù di elu kari ibe-ya: ma nke ka elu kpe azu pute.

4. Ahurum ebulu ahu ka ọ nāsọ mpi n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida; ma ọ dighi anu ọ bula nēguzo n'iru ya, ọ dighi kwa onye nānaputa ihe n'aka-ya; ma ọ neme dika ọ tọrọ ya utọ, me onwe-ya uku.

5. Ma mu onwem nọ nāchighari uchem, ma, le, otù nkpi siri n'Ọdida-anyanwu bia n'elu uwa nile, ma ọ dighi-emetu ala ma-ọli: nkpi ahu nwe-kwa-ra mpi juru anya n'olile n'etiti anya-ya abua.

6. O we biakute ebulu ahu nke nwere mpi abua, nke m'huru ka ọ nēguzo n'iru osimiri ahu, o we b͕akwasi ya ọsọ n'ọnuma nke ike-ya.

7. M'we hu ya ka ọ nābiarutu ebulu ahu nso, o we wesa ya iwe di ilu, tib͕ue ebulu ahu, sọjie mpi-ya abua; ike adighi kwa ebulu ahu iguzo n'iru ya, o we tuda ya n'ala, zọda ya ukwu; ọ dighi kwa onye nānaputa ebulu n'aka-ya.

8. Nkpi ahu we me onwe-ya uku ri nne: ma mb͕e o nwere ume, ab͕ajiri mpi uku ya; mpi anọ nke juru anya n'olile we pute n'ọnọdu ya chere iru n'ifufe anọ nke elu-igwe.

9. Ma otù nime ha ka otù mpi ntà siri puta, o we dikarisiri uku, n'uzọ Ndida, na n'uzọ Ọwuwa-anyanwu, na n'uzọ ala ahu mara nma.

10. O we di uku rue usu ihe nile nke elu-igwe; o we me ka ufọdu nime usu ihe nile nke elu-igwe na nime kpakpando da n'ala, o we zọda ha ukwu.

11. Ọbuná rue Onye-isi nke usu ahu ka o mere onwe-ya uku;ọ bu kwa n'aka-Ya ka ọ napuru àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, atuba-kwa-ra ọnọdu nke ebe nsọ Ya.

12. Anēnye kwa ya usu-ndi-agha imegide àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum n'ihi nmehie; o we tuda ezi-okwu n'ala, me ihe, ihe ga-kwa-ra ya.

13. M'we nu otù onye nsọ ka ọ nēkwu, otù onye nsọ we si onye ahu nke nēkwu okwu, Rùe ole mb͕e ka ọhù a gādi, bú nke àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na njehie ahu nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, inye ma ebe nsọ ma usu-ndi-agha ka azọda ha ukwu?

14. O we sim, Rue nnù anyasi na ututu ise na ọgu iri-na-ise; ewe gua ebe nsọ n'ebe ezi omume.

15. O rue, mb͕e m'huru ọhù ahu, ọbuná mu onwem, bú Daniel, na m'chọrọ nghọta; ma, le, ihe di ka nwoke di ike n'ile ya anya nēguzo n'irum.

16. M'we nu olu madu n'etiti Ulai, o we kpọ, si, Gebriel, me ka onye a ghọta ọhùa.

17. O we bia nso n'ebe m'nēguzo; ma mb͕e ọ biara, m'we tua egwu nke-uku, da kpue irum n'ala: o we sim, Ghọta, gi nwa nke madu; n'ihi na mb͕e nke ọgwugwu ihe nile ka ọhù a diri.

18. Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we di n'oké ura da kpue irum n'ala: o we metum aka, me ka m'guzo ọtọ n'ebe m'nēguzo.

19. O we si, Le, m'gaje ime ka i mara ihe ahu nke gādi n'ikpe-azu nke oké iwe a: n'ihi na ọ diri mb͕e akara àkà nke ọgwugwu ihe nile.

20. Ebulu ahu nke i huru, nke nwere mpi abua, ha bu eze nke Midia na Peasia.

21. Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.

22. Ma mpi ahu, nke b͕ajiri ab͕aji, nke mpi anọ guzoro n'ọnọdu-ya, ala-eze anọ gēsi na mba ahu guzo, ma ọ bughi n'ike-ya.

23. Ma na mb͕e ikpe-azu nke ala-eze-ha, mb͕e ndi-njehie gējehiezuwori, otù eze gēguzo ọtọ, nke nwere iru di ike, ọ bu kwa onye nāghọta okwu-omimi di iche iche.

24. Ike-ya gēsi kwa ike, ma ọ bughi n'ike nke aka ya; ọ gēbibi kwa n'uzọ di ebube, ihe gāga-kwa-ra ya nke-ọma, ọ gēme kwa ihe: ọ gēbibi kwa ndi nwere ume na ndi ahu, bú ndi nsọ.

25. Ọ gēsite kwa n'ezi uche-ya me ka aghughọ ga nke-ọma n'aka-ya; ọ bu kwa n'obi-ya ka ọ gēme onwe-ya uku; ọ bu kwa na mb͕e udo-ha ka ọ gēbibi ọtutu madu: ọ bu kwa imegide onye-isi nke ndi-isi ka ọ gēguzo; ma agāb͕aji ya nējighi aka.

26. Ma ọhù ahu nke anyasi na ututu nke ekwuworo, ezi-okwu ka ọ bu: ma gi onwe-gi zobe ọhù ahu; n'ihi na ọ diri ọtutu ubọchi di n'iru.

27. Ma mu onwem, bú Daniel, ike gwurum, m'we ria ọria ubọchi ufọdu; m'we bilie, je ozi eze: ọhù ahu ju-kwa-ram anya, ma ọ dighi onye nāghọta ya.

About Daniel Chapter 8

Read Daniel Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Daniel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Daniel
Chapter: 8
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Daniel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Daniel Chapter 8 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Daniel Chapter 8?

Daniel Chapter 8 is part of the Book of Daniel in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Daniel Chapter 8 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from Daniel

  1. Daniel Chapter 1
  2. Daniel Chapter 4
  3. Daniel Chapter 8
  4. Daniel Chapter 7
  5. Daniel Chapter 9
  6. Daniel Chapter 12
  7. Daniel Chapter 10

Related Chapters & Readings

  1. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 18
  2. Abù Ọma Chapter 50
  3. Jeremaia Chapter 50
  4. I. Ihe Emere Chapter 24
  5. Abù Ọma Chapter 107
  6. Ezikiel Chapter 28
  7. Ndi Efesọs Chapter 4
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *