Ezikiel Chapter 33

For English

Read Ezikiel Chapter 33 Online

Read Ezikiel Chapter 33 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ezikiel and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ezikiel 33

Isi 33

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, gwa umu ndi-gi okwu, si ha, Ala ọ bula, mb͕e M'nēme ka mma-agha biakwasi ya, ma ndi ala ahu eweputawo otù onye n'etiti ha, me ya ka ọ ghọrọ ha onye-nche:

3. ọ we hu mma-agha ahu ka ọ nābiakwasi ala-ya, o buru na ọ fùa opì-ike-ya, dọ ndi-ya aka na nti;

4. mb͕e ahu onye nānu ihe nke nuworo olu opì-ike ahu, ma ọ naraghi idọ-aka-na-nti-ya, ọ buru na mma-agha ahu abia wepu ya, ọbara-ya gādi n'isi-ya.

5. Olu opì-ike ahu ka ọ nuru, ma ọ naraghi idọ-aka-na-nti-ya; ọbara-ya gādikwasi ya: ma onye ahu, asi na ọ nara idọ-aka-na-nti ahu, nkpuru-obi-ya ka ọ gēmewori ka o wepuga onwe-ya.

6. Ma onye-nche ahu, mb͕e ọ gāhu mma-agha ahu ka ọ nābia, ma ọ fùghi opì-ike, ewe ghara idọ ndi-ya aka na nti, mma-agha ahu abia, wepu madu ọ bula n'etiti ha; onye ahu, n'ihi ajọ omume-ya ka ewepuworo ya, ma n'aka onye-nche ahu ka M'gājuta ọbara-ya.

7. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel; i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.

8. Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.

9. Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta ka o we si nime ya chigharia, ma o sighi n'uzọ-ya chigharia; onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya, ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.

10. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si ulo Israel: Otú a ka unu nēkwu, si, N'ezie njehie nile ayi na nmehie nile ayi di n'isi-ayi, ọ bu kwa nime ha ka ayi onwe-ayi nāta aru; àyi gēsi kwa aṅa di ndu?

11. Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?

12. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si umu ndim, Ezi omume nke onye ezi omume agaghi-anaputa ya anaputa n'ubọchi njehie-ya; ọzọ, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu, ọ gaghi-asu ngọngọ nime ya n'ubọchi o si na nmebi-iwu-ya chigharia: ọzọ kwa, onye ezi omume apughi idi ndu nime ya n'ubọchi o mehiere.

13. Mb͕e M'nāsi onye ezi omume, na ọ ghaghi idi ndu, onye ahu ewe tukwasi obi n'ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agaghi-echeta ha; ma n'ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu.

14. Ọzọ, mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; o we si na nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume;

15. asi na onye nēmebi iwu enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara madu n'ike, jegharia n'ukpuru nile nke ndu, ghara ime ajọ omume; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.

16. Nmehie-ya nile nke o mehieworo agaghi-echeta ha megide ya: ihe ekpere n'ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghi idi ndu.

17. Ma umu ndim asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi: ma ha onwe-ha, uzọ-ha ka anādighi-atule.

18. Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, ọ gānwu kwa nime ha.

19. Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, n'ihi ihe ndia ka onye ahu gādi ndu.

20. Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di.

21. O rue, n'arọ nke-iri-na-abua nke emere ka ayi je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, na otù onye nke siri na Jerusalem b͕apu biakuterem, si, Etikpọwo obodo-ayi.

22. Ma aka Jehova rurumri aru n'anyasi, tutu onye b͕apuru ab͕apu abia; O we saghe ọnum, rue mb͕e ọ biakuterem n'ututu; ewe saghe ọnum, m'we ghara ida kwa ob͕i ọzọ.

23. Okwu Jehova we ruem nti, si,

24. Nwa nke madu, ndi bi na nkpọnkpọ ebe ndia n'ala Israel nēkwu, si, Nání otù onye ka Abraham bu, o we nweta ala nka: ma ayi onwe-ayi bara uba; ayi ka enyeworo ala nka ibu ihe-nweta.

25. N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Anu na ọbara-ya ka unu nēri, unu nēweli kwa anya-unu le arusi nile unu, ọbara ka unu nāwusi kwa: ọ̀ kwa ala nka ka unu gēnweta?

26. Unu eguzowo n'elu mma-agha-unu, unu emewo ihe-árú, unu emeruwo, nwoke ọ bula o merua nwunye nke nwoke-ibe-ya: ọ̀ bu kwa ala nka ka unu gēnweta?

27. Otú a ka i gāsi ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ndi nọ na nkpọnkpọ ebe nile gāda site na mma-agha, M'gēwere kwa onye nọ n'ọhia nye anu-ọhia ka ewe ripia ya, na ndi nọ n'ebe nile ewusiri ike na n'ọb͕à nile, n'ajọ ọria nēfe efe ka ha gānwu.

28. M'gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n'efu, ghara inwe onye nāgabiga ha.

29. Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesiri ala-ha ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, n'ihi ihe-árú nile ha nke ha meworo.

30. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, umu ndi-gi ndi nēkwu okwu bayere gi n'akuku mb͕idi nile ha, na n'ọnu-uzọ nile nke ulo nile ha, ha agwaritawo onwe-ha okwu, onye ọ bula ọ gwa nwa-nne-ya, si, Biko, bianu, nuru ihe bu okwu a nke nēsi n'ọnu Jehova puta.

31. Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.

32. Ma, le, i diri ha ka abù nke ihu-n'anya riri nne, dika onye nwere olu mara nma, nke nākpọ kwa ubọ nke-ọma: n'ihi na ha anuwo okwu-gi nile, ma ha adighi-eme ha.

33. Ma mb͕e ọ gēme, (le, ọ nēme,) ha gāma kwa na onye-amuma anọwori n'etiti ha.

About Ezikiel Chapter 33

Read Ezikiel Chapter 33 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ezikiel
Chapter: 33
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ezikiel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ezikiel Chapter 33 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ezikiel Chapter 33?

Ezikiel Chapter 33 is part of the Book of Ezikiel in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ezikiel Chapter 33 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from Ezikiel

  1. Ezikiel Chapter 23
  2. Ezikiel Chapter 41
  3. Ezikiel Chapter 34
  4. Ezikiel Chapter 2
  5. Ezikiel Chapter 6
  6. Ezikiel Chapter 20
  7. Ezikiel Chapter 17

Related Chapters & Readings

  1. Jenesis Chapter 48
  2. Eklisiastis Chapter 7
  3. Malakai Chapter 4
  4. Abù Ọma Chapter 145
  5. I. Ihe Emere Chapter 17
  6. Job Chapter 28
  7. Ezra Chapter 8
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *