Joshua Chapter 23

For English

Read Joshua Chapter 23 Online

Read Joshua Chapter 23 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Joshua and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Joshua 23

Isi 23

1. O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri site na mb͕e Jehova mere ka Israel zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha nile buruburu, mb͕e Joshua ghọrọ agadi, mb͕e ubọchi ndu-ya nāgwu,

2. na Joshua kpọrọ Israel nile, bú ndi-okenye-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha, si ha, Mu onwem aghọwo agadi, ubọchi ndum nāgwu:

3. unu onwe-unu ahuwo kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, meworo mba ndia nile n'ihi unu; n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù.

4. Lenu, emewom ka mba ndia nke fọduru dayere unu n'ihe-nketa diri ebo nile unu, site na Jọdan, ha na mba ahu nile ndi m'bipuworo, we rue oké osimiri uku ahu n'ọdida anyanwu.

5. Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya gākwapu kwa ha n'iru unu, napu kwa ha ala-ha n'iru unu; unu gēnweta kwa ala-ha, dika Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu okwu.

6. Di-kwa-nu ike nke-uku idebe na ime ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu Moses, ka unu ghara isi nime ya wezuga onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe;

7. ka unu ghara ibà nime mba ndia, ndi fọduru n'etiti unu; unu ehota-kwa-la aha chi nile ha, unu eme-kwa-la ka ewere ha ṅua iyi, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha:

8. kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gārapara n'aru, dika unu meworo rue ta.

9. Jehova nānapu kwa mba uku nke nwere ume ala-ha n'iru unu: ma unu onwe-unu, ọ dighi nwoke ọ bula guzoworo n'iru unu rue ta.

10. Otù nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgu iri: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù, dika Ọ gwara unu okwu.

11. Lezi-kwa-nu onwe-unu anya nke-ọma, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya.

12. Ma ọ buru na unu alaghachi ma-ọli, we rapara n'aru ndi fọduru nke mba ndia, bú ndia fọduru n'etiti unu, unu na ha ewe lurita nwunye, unu ewe bakuru ha, ha ewe bakuru kwa unu:

13. maranu nke-ọma na Jehova, bú Chineke-unu, agaghi-anapu kwa mba ndia ala-ha ọzọ n'iru unu, kama ha gāburu unu ib͕udu na ọnyà, na utari n'akuku-aru-unu, na ogwu n'anya-unu, rue mb͕e unu gālapu n'iyì n'ezi ala nka, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu.

14. Ma, le, mu onwem nēje n'uzọ uwa nile ta: ma unu amawo n'obi-unu nile na nime nkpuru-obi-unu nile, na ọ dighi otù ihe dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, kwuru bayere unu; ha nile emeworo unu, ọ dighi otù ihe dapuru nime ya.

15. Ọ gēru kwa, na dika ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu biakwasiworo unu, otú a ka Jehova gēme ka ihe ọjọ ahu nile biakwasi unu, rue mb͕e Ọ gēkpochapu unu n'ezi ala nka nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu.

16. Mb͕e unu gāgabiga ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, nke O nyere unu n'iwu, mb͕e unu gēje kwa fè chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha; iwe Jehova gādi kwa ọku n'aru unu, unu gālapu kwa n'iyì ngwa ngwa n'ezi ala ahu nke O nyeworo unu.

About Joshua Chapter 23

Read Joshua Chapter 23 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Joshua
Chapter: 23
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Joshua. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Joshua Chapter 23 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Joshua Chapter 23?

Joshua Chapter 23 is part of the Book of Joshua in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Joshua Chapter 23 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from joshua

  1. Joshua Chapter 21
  2. Joshua Chapter 7
  3. Joshua Chapter 10
  4. Joshua Chapter 22
  5. Joshua Chapter 3
  6. Joshua Chapter 8
  7. Joshua Chapter 14

Related Chapters & Readings

  1. I. Ndi Tesalọnaika Chapter 3
  2. Matiu Chapter 23
  3. Esta Chapter 3
  4. Abù Ọma Chapter 95
  5. Ilu Chapter 26
  6. Jenesis Chapter 46
  7. Aisaia Chapter 46
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *