Read Joshua Chapter 5 Online
Read Joshua Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Joshua and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Joshua 5
Isi 5
1. O rue, mb͕e eze nile nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan n'akuku ọdida-anyanwu, na eze nile nke ndi Kenean, ndi bi n'akuku oké osimiri, nuru na Jehova mereri ka miri Jọdan takọrọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gabigasiri, na obi lọrọ ha miri, mọ adighi kwa nime ha ọzọ, n'ihi umu Israel.
2. Na mb͕e ahu Jehova siri Joshua, Mere onwe-gi mma ọ́mú, bìe umu Israel úgwù ọzọ nke ub͕ò abua.
3. Joshua we mere onwe-ya mma ọ́mu, bìe umu Israel úgwù na Gibeat-ha-aralot.
4. Nka bu kwa ihe kpatara Joshua ji bìe úgwù: ndi Israel nile ndi nēsi n'Ijipt puta, ndi bu ndikom, bú ndikom agha nile, nwuru n'ọzara n'uzọ, mb͕e ha siri n'Ijipt puta.
5. N'ihi na ndi ebìri úgwù ka ha bu, bú ndi nile putara n'Ijipt: ma ndi nile amuru n'ọzara n'uzo mb͕e ha siri n'Ijipt puta, ha ebìghi ha úgwù.
6. N'ihi na ọgu arọ abua ka umu Israel jere ije n'ọzara, rue mb͕e mba ahu nile gwusiri, bú ndikom agha ahu ndi nēsi n'Ijipt puta, n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ndi Jehova ṅuru iyi na Ọ gaghi-ekwe ka ha hu ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi na Ọ gēnye ayi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.
7. Ma umu-ha, ndi O mere ka ha bilie n'ọnọdu ha, ndi ahu ka Joshua biri úgwù: n'ihi na ndi anēbighi úgwù ka ha bu, n'ihi na ha ebìghi ha úgwù n'uzọ.
8. O rue, mb͕e ha bìzuru mba ahu nile úgwù, na ha nọduru n'ọnọdu-ha n'ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e aru-ha di ike.
9. Jehova we si Joshua, Ta ka M'kpochapuworo ihe-ita-uta nke Ijipt n'aru unu. Ewe kpọ aha ebe ahu Gilgal, rue ta.
10. Umu Israel we ma ulo-ikwū-ha na Gilgal; ha we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, n'ala ihe nādighi nke Jeriko.
11. Ha we rie ufọdu nime ihe mìrì n'ala ahu n'echi nke ngabiga ahu, bú achicha ekoghi-eko na ọka aṅara n'ọku, n'otù ubọchi ahu.
12. Manna we kwusi n'echi-ya, mb͕e ha riri ufọdu nime ihe mìrì n'ala ahu; umu Israel enweghi kwa manna ọzọ; ha we rie ihe-ọmume ala Kenean n'arọ ahu.
13. O rue, mb͕e Joshua nọ n'akuku Jeriko, na o weliri anya-ya abua, we hu, ma, le, otù nwoke nēguzo na ncherita-iru ya, mma-agha-ya amiputara amiputa di n'aka-ya: Joshua we jekuru ya, si ya, Ọ̀ bu ayi ka i diri ma-ọbu ndi nēmegide ayi?
14. Ọ si, É-è; kama mu onwem bu onye-isi usu-ndi-agha Jehova; ub͕u a ka m'biaworo. Joshua we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si ya, Gini ka onye-nwem nāgwa orù-ya?
15. Onye-isi usu-ndi-agha Jehova we si Joshua, Yipu akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi; n'ihi na ebe nke gi onwe-gi nēguzo n'elu ya, nsọ ka ọ di. Joshua we me otú a.
About Joshua Chapter 5
Read Joshua Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Joshua in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Joshua
Chapter: 5
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Joshua. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Joshua Chapter 5 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Joshua Chapter 5?
Joshua Chapter 5 is part of the Book of Joshua in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Joshua Chapter 5 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from joshua
- Joshua Chapter 17
- Joshua Chapter 1
- Joshua Chapter 7
- Joshua Chapter 14
- Joshua Chapter 22
- Joshua Chapter 10
- Joshua Chapter 20