Jenesis Chapter 11

For English

Read Jenesis Chapter 11 Online

Read Jenesis Chapter 11 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jenesis and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Jenesis 11

Isi 11

1. Uwa nile we nwe otù asusu na otù uzọ okwu.

2. O rue, mb͕e ha buliri ije n'Iru-anyanwu, na ha chọtara ala di lari n'ala Shaina; ha we biri n'ebe ahu.

3. Ha we sirita ibe-ha, Ngwa, ka ayi kpua brick, kpọ ha ọku nke-ọma. Ha we nwe "brick'' n'ọnọdu nkume, ọ bu kwa bitumen ka ha nwere n'ọnọdu urọ.

4. Ha we si, Ngwa, ka ayi wuere onwe-ayi obodo, na ulo-elu, nke elu-ya gēru n'elu-igwe, ka ayi mekwara onwe-ayi aha; ka ayi we ghara ib͕asa n'elu uwa nile.

5. Jehova we ridata ihu obodo ahu na ulo-elu ahu, nke umu madu wuru.

6. Jehova we si, Le, ha bu otù ndi, ọ bu kwa otù asusu ka ha nile nwere; nka bu kwa ihe ha nāmalite ime: ub͕u a agaghi-eb͕ochiri ha ihe ọ bula nke ha nēzube ime.

7. Ngwa, ka ayi rida, ghagbue asusu-ha n'ebe ahu, ka ha we ghara inurita asusu ibe-ha.

8. Jehova we me ka ha si n'ebe ahu b͕asa n'elu uwa nile: ha we rapu iwu obodo ahu.

9. N'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Bebel; n'ihi na n'ebe ahu ka Jehova ghab͕uru asusu uwa nile: ọ bu kwa n'ebe ahu ka Jehova mere ka ha si b͕asa n'elu uwa nile.

10. Ndia bu usoro-ọmumu Shem. Shem b͕ara ọgu arọ ise, mua Apakshad arọ abua ka iju-miri ahu gasiri:

11. Shem di ndu, mb͕e ọ musiri Apakshad, nnù arọ na ọgu ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

12. Apakshad di ndu orú arọ na iri na ise, mua Shela:

13. Apakshad di ndu, mb͕e ọ musiri Shela, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

14. Shela di ndu orú arọ na iri, mua Iba:

15. Shela di ndu, mb͕e ọ musiri Iba, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

16. Iba di ndu orú arọ na iri na anọ, mua Peleg:

17. Iba di ndu, mb͕e ọ musiri Peleg, nnù arọ na orú na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

18. Peleg di ndu orú arọ na iri, mua Reu:

19. Peleg di ndu, mb͕e ọ musiri Reu, ọgu arọ iri na arọ iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

20. Reu di ndu orú arọ na iri na abua, mua Serug:

21. Reu di ndu, mb͕e ọ musiri Serug, ọgu arọ iri na arọ asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

22. Serug di ndu orú arọ na iri, mua Nehoa:

23. Serug di ndu, mb͕e ọ musiri Nehoa, ọgu arọ iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

24. Nehoa di ndu orú arọ na iteghete, mua Tira:

25. Nehoa di ndu, mb͕e ọ musiri Tira, ọgu arọ ise na iri na iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

26. Tira di ndu ọgu arọ atọ na iri, mua Abram, na Nehoa, na Heran.

27. Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot.

28. Heran we nwua n'iru nna-ya Tira n'ala amuru ya, n'Ua nke ndi Kaldea.

29. Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska.

30. Ma Serai bu nwayi-àgà; ọ dighi nwa ọ nwere.

31. Tira we chiri Abram, bú nwa-ya nwoke, na Lot, bú nwa-nwoke nke Heran, ya bu nwa nwa-ya, na Serai, bú nwunye nwa-ya, bú nwunye Abram nwa-ya nwoke; ha na ha we si n'Ua nke ndi Kaldea pua, ije ala Kenean; ha biarue Heran, biri n'ebe ahu.

32. Ubọchi nile nke Tira we buru ọgu arọ iri na arọ ise: Tira we nwua nime Heran.

About Jenesis Chapter 11

Read Jenesis Chapter 11 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Jenesis
Chapter: 11
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jenesis. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Jenesis Chapter 11 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Jenesis Chapter 11?

Jenesis Chapter 11 is part of the Book of Jenesis in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Jenesis Chapter 11 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from Jenesis

  1. Jenesis Chapter 42
  2. Jenesis Chapter 5
  3. Jenesis Chapter 41
  4. Jenesis Chapter 30
  5. Jenesis Chapter 3
  6. Jenesis Chapter 33
  7. Jenesis Chapter 32

Related Chapters & Readings

  1. I. Samuel Chapter 8
  2. Abù Ọma Chapter 118
  3. Ndi Rom Chapter 5
  4. Nehemaia Chapter 6
  5. Matiu Chapter 15
  6. Ndi-Ikpe Chapter 18
  7. Jenesis Chapter 39
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *