II. Ndi Kọrint Chapter 7

For English

Read II. Ndi Kọrint Chapter 7 Online

Read II. Ndi Kọrint Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ndi Kọrint and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

II. Ndi Kọrint 7

Isi 7

1. Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.

2. Nyenu ayi uzọ n'obi-unu; ayi emeghi onye ọ bula ajọ omume, ayi emebighi onye ọ bula, ayi erib͕ughi onye ọ bula.

3. Ọ bughi ima unu ikpé ka m'nēkwu ya: n'ihi na ekwuwom ya na mbu, na unu di ayi n'obi inwukọ ọnwu na idikọ ndu.

4. Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m'ji agwa unu okwu, inya-isim n'ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile.

5. N'ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n'akuku nile; ilu-ọ̀gù di n'èzí, egwu di nime.

6. Otú ọ di, Onye ahu Nke nākasi ndi di ala obi, bú Chineke, were ọbibia Taitọs kasi ayi obi;

7. ọ bighi kwa nání ọbibia-ya, kama O were kwa nkasi-obi nke ejiri kasi ya obi n'aru unu we kasi ayi obi, mb͕e ọ nākọrọ ayi ọgugu m'gusiri unu ike, iru-újú-unu, ekworo unu kworom; ya mere m'ṅuriri ọṅu kari.

8. N'ihi na asi na ọ bu ezie na ejim akwukwọ-ozim me ka o wuta unu, akwaghm uta, asi na ọ bu ezie na anamakwari uta; n'ihi na anamahu na akwukwọ-ozi ahu mere ka o wuta unu, ma asi na ọ bu ezie na ọ bu nání otù oge hour ka o wutara unu.

9. Ub͕u a anamaṅuri ọṅu, ọ bughi na emere ka ihe wuta unu, kama na emere ka o wuta unu rue nchèghari: n'ihi na emere ka o wuta unu dika Chineke chọrọ, ka unu we ghara isite n'ayi yi iyì n'ihe ọ bula.

10. N'ihi na nwuta dika Chineke chọrọ nālu ọlu nchèghari rue nzọputa, bú nchèghari nke anāpughi ikwa uta bayere ya: ma nwuta nke uwa nāluputa ọnwu.

11. N'ihi na le, otù ihe a, na emere ka ihe wuta unu dika Chineke chọrọ, le ka ọ ra, bú inu-ọku-n'obi ọ luputara nime unu, e, le ka ngọpu ra, e, le ka iwe uku ra, e, le ka egwu ra, e, le ka ọgugu m'gusiri unu ike ra, e, le ka ekworo ra, e, le ka nkpeputa ra! N'ihe nile ọ bula unu mere ka amara unu na unu di ọcha n'okwu ahu.

12. Ya mere asi na ọ bu ezie na edegaram unu akwukwọ, ọ bughi n'ihi onye ahu mere ajọ omume ka m'dere ya, ọ bughi kwa n'ihi onye ahu emere ajọ omume megide ya, kama ka ewe me ka inu-ọku-n'obi unu nānu n'ihi ayi putara unu ìhè n'iru Chineke.

13. N'ihi nka akasiwo ayi obi: ma na nkasi-obi-ayi ayi ṅuribigara ókè nke-uku kari n'ihi ọṅù Taitọs, n'ihi na emewo ka mọ-ya zuru ike site n'ebe unu nile nọ.

14. N'ihi na asi na ọ di ihe m'nyaworo ya isi bayere unu, emeghi ka ihere mem; kama dika ayi gwara unu ihe nile n'ezi-okwu, otú a ka esi hu kwa na inya-isi-ayi, nke m'nyara n'iru Taitọs, bu ezi-okwu.

15. Obi-ya dibigara ókè n'ebe unu nọ, mb͕e ọ nēcheta iṅa-nti nke unu nile, otú unu were egwu na ima-jijiji nara ya nke-ọma.

16. Anamaṅuri ọṅu na enwerem obi-ike n'ihe nile n'aru unu.

About II. Ndi Kọrint Chapter 7

Read II. Ndi Kọrint Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: II. Ndi Kọrint
Chapter: 7
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ndi Kọrint. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading II. Ndi Kọrint Chapter 7 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is II. Ndi Kọrint Chapter 7?

II. Ndi Kọrint Chapter 7 is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete II. Ndi Kọrint Chapter 7 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from ii-ndi-kọrint

  1. II. Ndi Kọrint Chapter 11
  2. II. Ndi Kọrint Chapter 12
  3. II. Ndi Kọrint Chapter 1
  4. II. Ndi Kọrint Chapter 3
  5. II. Ndi Kọrint Chapter 5
  6. II. Ndi Kọrint Chapter 10
  7. II. Ndi Kọrint Chapter 2

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 82
  2. Job Chapter 14
  3. Jeremaia Chapter 2
  4. Jọn Chapter 18
  5. Jọn Chapter 7
  6. Aisaia Chapter 21
  7. Ndi Rom Chapter 10
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *