Read Jeremaia Chapter 12 Online
Read Jeremaia Chapter 12 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jeremaia and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Jeremaia 12
Isi 12
1. Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m'gēkwu n'ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n'udo?
2. I kuwo ha dika osisi, e, ha ab͕awo nkpọrọgwu; ha nētó, e, ha amiwo nkpuru: nso ka I nọ n'ọnu-ha, ma I nọ akuru-ha n'ebe di anya.
3. Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n'ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.
4. Rùe ole mb͕e ka ala gēru újú? rùe ole mb͕e ka ihe-ọkukú nke ubi nile gākpọnwu? site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya ekpochapuwo anu-ulo nile na anu-ufe; n'ihi na ha siri, Ọ gaghi-ahu ikpe-azu-ayi.
5. Asi na i so ndi ji ukwu eje b͕a ọsọ, ha we me ka ike gwu gi, ì gēsi kwa aṅa nu ọku n'obi ib͕akari inyinya? ọ bu kwa n'ala udo ka i nọ na ntukwasi-obi, ma ì gēsi aṅa me na nbili-elu nke Jọdan?
6. N'ihi na ọbuná umu-nne-gi, na ulo nna-gi, ọbuná ha onwe-ha aghọb͕uwo gi; ọbuná ha onwe-ha akpọzuwo nkpu n'azu gi: ekwela ha, mb͕e ha gāgwa gi ezi ihe.
7. Arapuwom ulom, ajuwom ihe-nketam; ewerewom nwayi nke ihe-ya nātọ nkpuru-obim utọ nke-uku nye n'ọbu-aka ndi-iro-ya.
8. Ihe-nketam aghọworom ihe dika ọdum n'oké ọhia: o mewo ka olu-ya da megidem; n'ihi nka ka M'kpọworo ya asì.
9. Ọ̀ bu udele turu agwa ka ihe-nketam dirim? udele, hà nọ ya buruburu nēmegide ya? jenu, chikọta anu ọhia nile, me ka ha bia iri ihe.
10. Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n'efu.
11. O mewo ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; o nēru újú n'ebe m'nọ, ebe ọ tọb͕ọrọ n'efu; ebe tọb͕ọrọ n'efu ka ala nka nile bu, n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n'obi.
12. N'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi nke di n'ọzara ka ndi nāpunara madu ihe biaworo: n'ihi na mma-agha Jehova nwere nēripia site n'otù nsọtu nke ala we rue nsọtu ọzọ nke ala: ọ dighi udo anu-aru ọ bula, bú madu, nwere.
13. Ha aghawo ọka wheat, ma ogwu bu ihe-ubi ha wereworo; ha aghọwo ndi-ọria, ma ọ dighi-abara ha urù: ka ihere ihe-omume nile unu me kwa unu, sita n'iwe di ọku nke Jehova.
14. Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M'meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M'gaje iropu ha n'elu ala-ha, ulo Juda ka M'gēropu kwa n'etiti ha.
15. O gēru kwa, mb͕e M'ropusiri ha, na M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha ọzọ; M'gēme kwa ka ha lata, onye ọ bula n'ihe-nketa-ya, na onye ọ bula n'ala-ya.
16. Ọ gēru kwa, ọ buru na ha amuta uzọ nile nke ndim nke-ọma, iji aham ṅu iyi, si, Jehova nādi ndu; dika ha zíri ndim iji Beal ṅu iyi; agēwuli kwa ha dika ulo n'etiti ndim.
17. Ma ọ buru na ha anughi, M'gēropu kwa mba ahu, nēropu ya nēme kwa ka ọ la n'iyì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
About Jeremaia Chapter 12
Read Jeremaia Chapter 12 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jeremaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Jeremaia
Chapter: 12
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jeremaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Jeremaia Chapter 12 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Jeremaia Chapter 12?
Jeremaia Chapter 12 is part of the Book of Jeremaia in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Jeremaia Chapter 12 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from Jeremaia
- Jeremaia Chapter 40
- Jeremaia Chapter 30
- Jeremaia Chapter 47
- Jeremaia Chapter 41
- Jeremaia Chapter 27
- Jeremaia Chapter 21
- Jeremaia Chapter 25