Matiu Chapter 11

For English

Read Matiu Chapter 11 Online

Read Matiu Chapter 11 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Matiu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Matiu 11

Isi 11

1. O rue, mb͕e Jisus nyebìri ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya iwu, O si n'ebe ahu pua izí ihe na ikwusa n'obodo nile ha.

2. Ma mb͕e Jọn nuru n'ulo-nkpọrọ ọlu nile nke Kraist ahu, o ziga ozi site n'aka ndi nēso uzọ-ya,

3. si Ya, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye di iche?

4. Jisus we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu nānu na nke unu nāhu:

5. ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi-ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma.

6. Ngọzi nādi-kwa-ra onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.

7. Ma mb͕e ndia nāla, Jisus malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n'ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n'ifufe?

8. Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ǹwoke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n'ulo ndi-eze.

9. Ma gini mere unu ji pua? ìhu onye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku.

10. Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si, Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi, Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi.

11. N'ezie asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze elu-igwe ka ya uku.

12. Site n'ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya.

13. N'ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn.

14. Ọ buru kwa na unu nāchọ inara ya nke-ọma, nwoke ahu bu Elaija, nke gaje ibia.

15. Onye nwere nti inu ihe, ya nu.

16. Ma M'gēji ọb͕ọ a tuyere gini? O yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, ndi nākpọ ibe-ha òkù,

17. si, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi aka n'obi.

18. N'ihi na Jọn biara nērighi ihe-oriri nāṅughi kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, O nwere mọ ọjọ.

19. Nwa nke madu biara nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, eyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! Agu-kwa-ra amam-ihe n'onye ezi omume site n'ọlu-ya nile.

20. Mb͕e ahu ka Ọ malitere ita obodo ahu uta, bú nke Ọ lukariri ọlu-Ya di ike nime ha, n'ihi na ha echègharighi.

21. Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga n'ákwà-nkpe na ntu.

22. Otú ọ di, asim unu, Taia na Saidon gānagide okwu n'ubọchi ikpé, kari unu.

23. Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? i gārida rue Hedis: n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Sọdọm nke aluru nime gi, ọ gānọgidewori rue ta.

24. Otú ọ di, asim unu, na ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari gi.

25. N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu:

26. e, Nna, ekelem I na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi.

27. Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.

28. Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.

29. Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu.

30. N'ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé.

About Matiu Chapter 11

Read Matiu Chapter 11 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Matiu
Chapter: 11
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Matiu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Matiu Chapter 11 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Matiu Chapter 11?

Matiu Chapter 11 is part of the Book of Matiu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Matiu Chapter 11 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from matiu

  1. Matiu Chapter 28
  2. Matiu Chapter 18
  3. Matiu Chapter 15
  4. Matiu Chapter 3
  5. Matiu Chapter 8
  6. Matiu Chapter 21
  7. Matiu Chapter 4

Related Chapters & Readings

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 18
  2. Ilu Chapter 14
  3. Nehemaia Chapter 13
  4. Ọpupu Chapter 40
  5. Ezikiel Chapter 1
  6. Job Chapter 33
  7. Esta Chapter 2
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *