Ọpupu Chapter 17

For English

Read Ọpupu Chapter 17 Online

Read Ọpupu Chapter 17 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọpupu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọpupu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ọpupu 17

Isi 17

1. Nzukọ nile nke umu Israel we si n'ọzara Sin bulie ije, na nbuli-ije nile ha, n'okwu-ọnu Jehova, ha we ma ulo-ikwū-ha na Refidim: ma ọ dighi miri ndi Israel gāṅu.

2. Ndi Israel we so Moses se okwu, si, Nyenu ayi miri ka ayi ṅua. Moses we si ha, Gini mere unu som nēse okwu? gini mere unu nānwa Jehova?

3. Akpiri miri we kpọ ndi Israel nku n'ebe ahu; ndi ahu we tamu ntamu megide Moses, si, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i meworo ka ayi si n'Ijipt rigota, iwere akpiri-ikpọ-nku me ka ayi na umu-ayi na anu-ulo-ayi, nwua?

4. Moses we tikue Jehova, si, Gini ka m'gēme ndi nka? ọ fọduru ihe ntà ka ha tub͕uem na nkume.

5. Jehova we si Moses, Gabiga n'iru ndim, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye Israel ka ha so gi je; nkpa-n'aka-gi kwa, nke i ji ti osimiri Nail, were ya n'aka-gi, je.

6. Le, M'gaje iguzo n'iru gi n'ebe ahu n'elu oké nkume nime Horeb, i gēti oké nkume ahu ihe, miri gēsi kwa nime ya puta, ka ndim we ṅua. Moses we me otú a n'anya ndi-okenye Israel.

7. O we kpọ aha ebe ahu Masa, na Meriba, n'ihi ise-okwu nke umu Israel, na n'ihi na ha nwara Jehova, si, Jehova, Ọ̀ nọ n'etiti ayi, ma-ọbu na Ọ nọghi?

8. Amalek we bia, buso Israel agha nime Refidim.

9. Moses we si Joshua, Rọputara ayi ndikom, pua, buso Amalek agha; echi mu onwem ganēguzo onwem n'elu ugwu ntà nka, nējide nkpa-n'aka Chineke n'akam.

10. Joshua we me dika Moses siri ya, ibuso Amalek agha: ma Moses na Eron na Hua rigoro n'elu ugwu ntà ahu.

11. O rue, mb͕e Moses weliri aka-ya elu, na Israel kariri ike: ma mb͕e o mere ka aka-ya zuru ike, Amalek kariri ike.

12. Ma aka Moses abua di arọ́; ha we were nkume, tiye ya n'okpuru ya, ọ nọkwasi ya; Eron na Hua we jide aka-ya abua elu, otù onye n'otù akuku, ibe-ya n'akuku ọzọ; aka-ya abua we nēguzosi ike rue ọdida-anyanwu.

13. Joshua we me ka ike gwu Amalek n'ọnu mma-agha.

14. Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe.

15. Moses we wue ebe-ichu-àjà, kpọ aha-ya Jehova-nisi:

16. ọ si, Aka dikwasi oche-eze Ja, agha ka Jehova gēbuso Amalek site n'ọb͕ọ rue ọb͕ọ.

About Ọpupu Chapter 17

Read Ọpupu Chapter 17 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọpupu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ọpupu
Chapter: 17
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọpupu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ọpupu Chapter 17 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ọpupu Chapter 17?

Ọpupu Chapter 17 is part of the Book of Ọpupu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ọpupu Chapter 17 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from ọpupu

  1. Ọpupu Chapter 31
  2. Ọpupu Chapter 5
  3. Ọpupu Chapter 23
  4. Ọpupu Chapter 16
  5. Ọpupu Chapter 25
  6. Ọpupu Chapter 35
  7. Ọpupu Chapter 21

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 110
  2. Abù Ọma Chapter 122
  3. Abù Ọma Chapter 79
  4. Ọnu-Ọgugu Chapter 3
  5. Hosea Chapter 7
  6. Abù Nke Abù Chapter 6
  7. Joshua Chapter 10
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *