Read Ndi-Ikpe Chapter 13 Online
Read Ndi-Ikpe Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Ikpe and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ndi-Ikpe 13
Isi 13
1. Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ; Jehova we nye ha n'aka ndi Filistia ọgu arọ abua.
2. Ma otù nwoke nke Zọra di, sitere n'ab͕uru ndi Dan, aha-ya bu Manoa; ma nwunye-ya bu nwanyi-àgà, ọ mughi kwa nwa.
3. Mọ ozi nke Jehova we me ka nwayi ahu hu ya anya, si ya, Biko, le, gi onwe-gi bu nwayi-àgà, i mughi kwa nwa: ma i gāturu ime, mua nwa-nwoke.
4. Ma ub͕u a, biko, lezie anya, aṅu-kwa-la manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú:
5. n'ihi na, le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke: aguba agaghi-aga n'elu isi-ya: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ: ya onwe-ya gāmalite kwa izọputa Israel n'aka ndi Filistia.
6. Nwayi ahu we bia, gwa di-ya, si, Onye nke Chineke biakuterem, n'ile ya anya ọ di kwa ka mọ-ozi nke Chineke n'ile ya anya, ọ di itu egwu nke-uku; ma ajughm ya ebe o si bia, o gosighkwam aha-ya:
7. o we sim, Le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke; ma ub͕u a aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ rue ubọchi ọnwu-ya.
8. Manoa we riọ Jehova aririọ, si, Biko, Onye-nwe-ayi, ka onye nke Chineke ahu nke I zitere biaghachikute ayi ọzọ, ariọm I, ka o zí kwa ayi ihe ayi gēme nwata ahu nke agāmu.
9. Chineke we ge nti olu Manoa; mọ-ozi nke Chineke we biakute nwayi ahu ọzọ ka ya onwe-ya nānọdu n'ubi: ma Manoa, bú di-ya, anọyeghi ya.
10. Nwayi ahu we me ngwa, b͕a ọsọ, gosi di-ya, si ya, Le, nwoke ahu nke biakuterem ubọchi a emewo ka m'hu ya anya ọzọ.
11. Manoa we bilie, jeso nwunye-ya, biakute nwoke ahu, si ya, Gi onwe-gi, ì bu nwoke ahu nke gwara nwayi a okwu? O we si, Mu ka ọ bu.
12. Manoa we si, Ub͕u a ka okwu-gi nile rè: gini gābu ikpé bayere nwata ahu, gini gābu kwa omume-ya?
13. Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, N'ihe nile nke m'siri nwayi a ya lezie anya.
14. Ọ gaghi-eri ihe sitere n'ihe ọ bula nke nēsi n'osisi vine nke manya-vine puta, ya aṅu-kwa-la manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ya eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú; ihe nile nke m'nyere ya n'iwu ka ọ gēdebe.
15. Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Biko, kwe ka ayi b͕ochie gi, ka ayi we dozie nwa-ewu n'iru gi.
16. Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, Ọ buru na i b͕ochiem, m'gaghi-eri nime nri-gi: ọ buru kwa na i me àjà-nsure-ọku, ọ bu Jehova ka i gēsurere ya. N'ihi na Manoa amaghi na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.
17. Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Gini bu aha-gi, ka ayi we sọpuru gi mb͕e okwu-gi nile gēre?
18. Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham, ebe aha ahu di ebube?
19. Manoa we were nwa-ewu ahu na onyinye-inata-iru-ọma, surere ya Jehova ọku n'elu oké nkume: mọ-ozi nālu kwa oké ọlu, ma Manoa na nwunye-ya nēle ya anya.
20. O rue, mb͕e ire-ọku nēsi n'ebe-ichu-àjà ahu rigo n'elu-igwe, na mọ-ozi nke Jehova rigoro nime ire-ọku nke ebe-ichu-àjà ahu: Manoa na nwunye-ya nēle kwa ya anya; ha we da kpue iru-ha n'ala.
21. Ma mọ-ozi ahu emeghi ka Manoa na nwunye-ya hu kwa ya anya ọzọ. Mb͕e ahu Manoa mara na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.
22. Manoa we si nwunye-ya, Ayi aghaghi inwu, n'ihi na ọ bu Chineke ka ayi huworo.
23. Nwunye-ya we si ya, Ọ buru na ọ tọrọ Jehova uto ime ka ayi nwua, Ọ gaghi-anarawori àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ayi, Ọ gaghi-eme kwa ka ayi hu ihe ndia nile, Ọ gaghi-eme kwa ayi nu ihe di otú a dika na mb͕e a.
24. Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Samson: nwata ahu we tó etó, Jehova we gọzie ya.
25. Mọ nke Jehova we malite ikwali obi-ya na Mahane-dan, n'etiti Zọra na Eshtaol.
About Ndi-Ikpe Chapter 13
Read Ndi-Ikpe Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ndi-Ikpe
Chapter: 13
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Ikpe. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ndi-Ikpe Chapter 13 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ndi-Ikpe Chapter 13?
Ndi-Ikpe Chapter 13 is part of the Book of Ndi-Ikpe in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ndi-Ikpe Chapter 13 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Esta Chapter 1
- Aisaia Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Esta Chapter 5
- Esta Chapter 4
- Esta Chapter 7
- Job Chapter 33
Explore More from ndi-ikpe
- Ndi-Ikpe Chapter 18
- Ndi-Ikpe Chapter 21
- Ndi-Ikpe Chapter 20
- Ndi-Ikpe Chapter 14
- Ndi-Ikpe Chapter 2
- Ndi-Ikpe Chapter 17
- Ndi-Ikpe Chapter 9