Ọnu-Ọgugu Chapter 10

For English

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 10 Online

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọnu-Ọgugu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ọnu-Ọgugu 10

Isi 10

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Mere onwe-gi opì ọla ọcha abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha: ha gābu-kwa-ra gi ihe bayere nkpọkọta nzukọ Israel, na ihe bayere nbuli-ije nke omuma-ulo-ikwū nile ha.

3. Mb͕e ha gēwere ha fùa, nzukọ Israel nile gēzukọ n'ebe i nọ rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

4. Ma ọ buru na otù ka ha were fùa, ndi-isi, bú ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, gēzukọ kwa n'ebe i nọ.

5. Mb͕e unu gāfù opì ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Iru-anyanwu gēbuli kwa ije.

6. Mb͕e unu gāfù opì ub͕ò nke-abua ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Ndida gēbuli kwa ije: ha gāfù opì ka ọ we dasie uda ike bayere nbuli-ije nile ha.

7. Ma n'ikpọkọta nkpọkọta Israel unu gāfù opì, ma unu emela ka ọ dasie uda ike.

8. Ọ bu umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēwere opì abua ahu fua; ha gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu.

9. Ọzọ, mb͕e unu nēbu agha n'ala-unu megide onye-nkpab͕u nākpab͕u unu, unu gēwere opì me ka ha dasie uda ike; agēcheta kwa unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, agāzọputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu.

10. Ọ bu kwa n'ubọchi ọṅu-unu, na na mb͕e nile unu akara àkà, na nime nmalite ọnwa nile unu, ka unu gēwere opì abua ahu fùa n'elu àjà-nsure-ọku nile unu, na n'elu ihe àjà nke àjà-udo nile unu; ha gābu-kwa-ra unu ihe-ncheta n'iru Chineke-unu; Mu onwem bu Jehova, Chineke-unu.

11. O rue n'arọ nke-abua, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu, na igwe-oji ahu siri n'elu ebe-obibi nke ihe-àmà ahu rigo.

12. Umu Israel we si n'ọzara Sainai bulie ije dika nbuli-ije nile ha si di; igwe-oji ahu we nọdu n'ọzara Peran.

13. Ma ha buru uzọ bulie ije n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.

14. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

15. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Isaka bu Netanel nwa Zua.

16. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Zebulun bu Eliab nwa Hilon.

17. Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije.

18. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elizua nwa Shedeua nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

19. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Simeon bu Shelumiel nwa Zurishadai.

20. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Gad bu Eliasaf nwa Deuel.

21. Ndi Kohat we bulie ije, nēbu ebe nsọ ahu: ma ndi ọzọ guzoro ebe-obibi ahu ọtọ rue ọbibia-ha.

22. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Efraim we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elishama nwa Amihud nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

23. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Manase bu Gameliel nwa Pedahzua.

24. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Benjamin bu Abidan nwa Gideoni.

25. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

26. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Asha bu Pagiel nwa Ọkran.

27. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Naftali bu Ahira nwa Inan.

28. Ndia bu nbuli-ije nke umu Israel, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; ha we bulie ije.

29. Moses we si Hobab, nwa Reuel onye Midian, bú nna nwunye Moses, Ndi nēbuli ije ka ayi bu rue ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya, si, Nke ahu ka M'gēnye unu: soro ayi je, ayi gēme kwa gi nma: n'ihi na Jehova ekwuwo ezi ihe bayere Israel.

30. Ọ we si ya, M'gaghi-eje; kama alam na umu-nnam ka m'gālakuru.

31. Ọ we si, Biko, arapula ayi; n'ihi na i mara ọmuma-ulo-ikwū-ayi n'ọzara, i gābu-kwa-ra ayi anya.

32. O gēru kwa, mb͕e i soro ayi je, o gēru kwa, na ezi ihe ahu nke Jehova gēme ayi nma ya, ayi gēme kwa gi nma.

33. Ha we si n'ugwu Jehova bulie ije-ha je ije ubọchi atọ; ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova nēbuli kwa ije n'iru ha ije ubọchi atọ, ileputara ha ebe izu-ike

34. Igwe-oji nke Jehova we di n'elu ha n'ehihie, mb͕e ha si n'ọmuma-ulo-ikwū bulie ije.

35. O rue, nime nbuli-ije ib͕e ahu, na Moses nāsi, Bilie, Jehova, ka ndi-iro-Gi b͕asa; ka ndi nākpọ Gi asì b͕apu kwa n'iru Gi.

36. Ma mb͕e o zuru ike, ọ nāsi, Jehova, laghachikute ọtutu ìgwè madu ndia, bú usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel.

About Ọnu-Ọgugu Chapter 10

Read Ọnu-Ọgugu Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ọnu-Ọgugu
Chapter: 10
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọnu-Ọgugu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ọnu-Ọgugu Chapter 10 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ọnu-Ọgugu Chapter 10?

Ọnu-Ọgugu Chapter 10 is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ọnu-Ọgugu Chapter 10 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from ọnu ọgugu

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 16
  2. Ọnu-Ọgugu Chapter 13
  3. Ọnu-Ọgugu Chapter 7
  4. Ọnu-Ọgugu Chapter 12
  5. Ọnu-Ọgugu Chapter 11
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 6
  7. Ọnu-Ọgugu Chapter 24

Related Chapters & Readings

  1. Jeremaia Chapter 21
  2. Abù Ọma Chapter 55
  3. II. Ihe Emere Chapter 11
  4. I. Ndi-Eze Chapter 8
  5. I. Samuel Chapter 8
  6. Ndi Rom Chapter 14
  7. Luk Chapter 24
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *