Read Ọnu-Ọgugu Chapter 8 Online
Read Ọnu-Ọgugu Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọnu-Ọgugu and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ọnu-Ọgugu 8
Isi 8
1. Jehova we gwa Moses okwu, si,
2. Gwa Eron okwu, si ya, Mb͕e i nēweli oriọna asa ahu, na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ka oriọna asa ahu gēnye ìhè.
3. Eron we me otú a; na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ahu ka o weliri oriọna-ya nile, dika Jehova nyere Moses iwu.
4. Nka bu otú emere ihe-idọba-oriọna ahu, ihe akpuru akpu nke ọla-edo ka ọ bu; rue ukwu-ala-ya, ru kwa okoko-ya nile, ihe akpuru akpu ka ọ bu: dika ihe-ile-anya ahu si di nke Jehova mere ka Moses hu, otú a ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu.
5. Jehova we gwa Moses okwu, si,
6. Weputa ndi Livai n'etiti umu Israel, me ka ha di ọcha.
7. Otú a ka i gēme ha, ime ka ha di ọcha: fesa ha miri nāsachapu nmehie, ka ha me kwa ka aguba gabiga n'anu-aru-ha nile, ka ha su kwa uwe-ha, me kwa onwe-ha ka ha di ọcha.
8. Ka ha were kwa nwa-oke ehi, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, bú utu ọka flour agwara manu, nwa-oke-ehi ọzọ ka i gēwere kwa iji chu àjà-nmehie.
9. I gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru ulo-ikwū nzute: i gākpọkọta kwa nzukọ nile nke umu Israel:
10. i gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru Jehova: umu Israel gēbikwasi ndi Livai aka-ha:
11. Eron gēfé ndi Livai n'iru Jehova ibu àjà-ofufé sitere n'umu Israel, ka ha we buru ndi gēfè òfùfè nke Jehova.
12. Ndi Livai gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi abua ahu: gi me otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ichuru Jehova, ikpuchiri ndi Livai nmehie-ha.
13. I gēguzo ndi Livai n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé ichuru Jehova.
14. I gēkewaputa kwa ndi Livai n'etiti umu Israel, ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere.
15. Emesia ndi Livai gābà ifè ulo-ikwū nzute òfùfè: i gēme ka ha di ọcha, fé kwa ha ibu àjà-ofufé.
16. N'ihi na ndi enyesiworom ha nile ka ha bu site n'etiti umu Israel; n'ọnọdu umu nile ọ bula meghere àkpà-nwa, bú umu eburu uzọ muru madu nile nke umu Israel, ka M'wereworo ha n'Onwem.
17. N'ihi na Mu nwe umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, ma n'etiti mmadu ma n'etiti anu-ulo: n'ubọchi m'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro ha nsọ nye Onwem.
18. Ewerewokwam ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel.
19. Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n'etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n'ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti umu Israel, n'ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm.
20. Moses, na Eron, na nzukọ nile nke umu Israel, we me ndi Livai otú a: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere ndi Livai, otú a ka umu Israel mere ha.
21. Ndi Livai we wepu nmehie n'onwe-ha, su uwe-ha; Eron we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; Eron we kpuchiere ha nmehie-ha ime ka ha di ọcha.
22. Emesia ndi Livai we ba ifè òfùfè-ha n'ulo-ikwū nzute n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom: dika Jehova nyere Moses iwu bayere ndi Livai, otú a ka ha mere ha.
23. Jehova we gwa Moses okwu, si
24. Nka bu nke ndi Livai nwere: site n'onye b͕ara orú arọ na ise we gaba n'iru ha gābà ibu agha n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute:
25. ma site n'onye b͕ara ọgu arọ abua na iri we gaba n'iru ha gēsi n'ibu-agha nke òfùfè ahu laghachi, ha agaghi-efè ọzọ;
26. ma ha gēso umu-nne-ha je ozi n'ulo-ikwū nzute, idebe ihe-ndebe, ma ọ dighi òfùfè ha gēfè. Otú a ka i gēme ndi Livai n'ihe-ndebe-ha.
About Ọnu-Ọgugu Chapter 8
Read Ọnu-Ọgugu Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ọnu-Ọgugu
Chapter: 8
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọnu-Ọgugu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ọnu-Ọgugu Chapter 8 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ọnu-Ọgugu Chapter 8?
Ọnu-Ọgugu Chapter 8 is part of the Book of Ọnu-Ọgugu in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ọnu-Ọgugu Chapter 8 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from ọnu ọgugu
- Ọnu-Ọgugu Chapter 30
- Ọnu-Ọgugu Chapter 34
- Ọnu-Ọgugu Chapter 14
- Ọnu-Ọgugu Chapter 24
- Ọnu-Ọgugu Chapter 18
- Ọnu-Ọgugu Chapter 12
- Ọnu-Ọgugu Chapter 6