Read I. Ndi Kọrint Chapter 8 Online
Read I. Ndi Kọrint Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Kọrint in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Ndi Kọrint and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
I. Ndi Kọrint 8
Isi 8
1. Ma okwu bayere ihe achuru n'àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n'anya nēwuli elu dika ulo.
2. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya mara ihe ọ bula, ọ kāmaghi dika ọ nāghaghi ima;
3. ma ọ buru na onye ọ bula nāhu Chineke n'anya, onye ahu ka Chineke mara.
4. Ya mere okwu bayere iri ihe achuru n'àjà nye arusi, ayi matara na ọ dighi arusi ọ bula bu ihe n'uwa, ayi mata-kwa-ra na ọ dighi Chineke ọzọ ma-ọbughi otù.
5. N'ihi na asi na ọ bu kwa ezie na ndi anākpọ chi di, ma ọ bu n'elu-igwe ma-ọbu n'elu uwa; dika ọtutu chi na ọtutu ndi-nwe-madu di;
6. ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya.
7. Otú ọ di ọ bughi nime madu nile ka ọmuma-ihe ahu di: kama ufọdu, ebe arusi bu ihe anēme n'ala-ha rue ub͕u a, ha nēri ihe ahu dika ihe achuru n'àjà nye arusi; anēmeru kwa akọ-na-uche-ha, ebe ọ nādighi ike.
8. Ma ihe-oriri agaghi-eche ayi n'iru Chineke: ma asi na ayi erighi, ọ dighi ihe fọduru ayi inwe; ma asi kwa na ayi nēri, ayi ababigaghi ókè.
9. Ma lezienu anya ka ike-unu nka ghara isi n'uzọ ọ bula ghọ ihe gēme ka ndi nādighi ike su ngọngọ.
10. N'ihi na asi na onye ọ bula ahú gi, bú onye nwere ihe-ọmuma, ka i nānọdu na nri nime ulo arusi, akọ-na-uche-ya, ma ọ buru na ọ dighi ike, àgaghi-ewuli ya elu dika ulo iri ihe achuru n'àjà nye arusi?
11. N'ihi na site n'ihe-ọmuma-gi onye ahu nke nādighi ike nāla n'iyì, bú nwa-nna-gi nke Kraist nwuru n'ihi ya.
12. Ma otú a, mb͕e unu nēmehie megide umu-nna-unu, nētib͕u kwa akọ-na-uche-ha mb͕e ọ nādighi ike, unu nēmehie megide Kraist.
13. N'ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n'ọnyà, m'gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m'ghara ime ka nwa-nnam ma n'ọnyà.
About I. Ndi Kọrint Chapter 8
Read I. Ndi Kọrint Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Kọrint in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: I. Ndi Kọrint
Chapter: 8
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Ndi Kọrint. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading I. Ndi Kọrint Chapter 8 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is I. Ndi Kọrint Chapter 8?
I. Ndi Kọrint Chapter 8 is part of the Book of I. Ndi Kọrint in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete I. Ndi Kọrint Chapter 8 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6
Explore More from i-ndi-kọrint
- I. Ndi Kọrint Chapter 7
- I. Ndi Kọrint Chapter 1
- I. Ndi Kọrint Chapter 16
- I. Ndi Kọrint Chapter 11
- I. Ndi Kọrint Chapter 6
- I. Ndi Kọrint Chapter 2
- I. Ndi Kọrint Chapter 3