Read II. Ndi-Eze Chapter 15 Online
Read II. Ndi-Eze Chapter 15 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi-Eze in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ndi-Eze and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
II. Ndi-Eze 15
Isi 15
1. N'arọ nke-orú-na-asa nke Jeroboam, bú eze Israel, ka Azaraia nwa Amazaia, bú eze Juda, malitere ibu eze.
2. Arọ iri na isi ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; ọ buru eze ọgu arọ abua iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekolaia nke Jerusalem.
3. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere.
4. Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile.
5. Jehova we tie eze ahu ihe, o we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche. Ma Jotam nwa eze bu onye-isi ulo-ya, nēkpe ndi ala ahu ikpe.
6. Ma okwu Azaraia nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
7. Azaraia we so nna-ya-ha dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Jotam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
8. N'arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Azaraia, bú eze Juda, ka Zekaraia nwa Jeroboam malitere ibu eze Israel nime Sameria ọnwa isi.
9. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova dika nna-ya-hà mere: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.
10. Shalum nwa Jedesh we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya n'iru ndi Israel, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.
11. Ma ihe Zekaraia mere nke fọduru, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.
12. Nka bu okwu Jehova, nke Ọ gwara Jihu, si, Umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel. O we di otú a.
13. Shalum nwa Jebesh malitere ibu eze n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Uzaia, bú eze Juda; o we buru eze ogologo otù ọnwa nime Sameria.
14. Menahem nwa Gadi we si na Tiaza rigo, biarue Sameria, tib͕ue Shalum nwa Jebesh nime Sameria, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.
15. Ma ihe nile Shalum mere nke fọduru, na nkekọta-ya nke ọ kekọtara madu imegide eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.
16. Mb͕e ahu Menahem tib͕uru Tifsa na ndi nile nọ nime ya, na ókè-ala-ya nile, site na Tiaza: n'ihi na ha emegheghi ya uzọ, n'ihi ya ka o tib͕uru ya; ndinyom-ya nile ndi di ime, ọ b͕awara ha afọ.
17. N'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Azaraia, bú eze Juda, ka Menahem nwa Gadi malitere ibu eze Israel arọ iri nime Sameria.
18. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya ubọchi-ya nile, bú nmehie o jiri me ka Israel mehie.
19. Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n'aka-ya.
20. Menahem we naputa ego ahu n'aka Israel, bú n'aka ndi-dike n'àkù, inye eze Asiria, ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri diri otù nwoke. Eze Asiria we laghachi, o guzoghi kwa n'ebe ahu n'ala ahu.
21. Ma okwu Menahem nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
22. Menahem we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Pekahaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
23. N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri nke Azaraia, bú eze Juda, ka Pekahaia nwa Menahem malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ abua.
24. O wee me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.
25. Peka nwa Remalaia, bú onye-isi-agha-ya, we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya nime Sameria, n'ulo-elu nke ulo eze, ya na Agob na Arie; ọgu ndikom abua na iri nke umu ndi Gilead nọye-kwa-ra ya: o we me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.
26. Ma okwu Pekahaia nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.
27. N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri-na-abua nke Azaraia, bú eze Juda, ka Peka nwa Remalaia malitere ibu eze Israel nime Sameria orú arọ.
28. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.
29. N'ubọchi Peka, bú eze Israel, ka Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, biara, were Ijon, na Ebel-bet-meaka, na Janoa, na Kedesh, na Hezoa, na Gilead, na Galili, bú ala nile nke Naftali; o we me ka ha je biri n'Asiria.
30. Hoshea nwa Ila we kekọta nkekọta-madu megide Peka nwa Remalaia, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya, n'arọ nke-orú nke Jotam nwa Uzaia.
31. Ma okwu Peka nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n'akwukwọ, ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.
32. N'arọ nke-abua nke Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, ka Jotam nwa Uzaia, bú eze Juda, malitere ibu eze.
33. Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok.
34. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova: dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere, otú a ka o mere.
35. Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n'elu.
36. Ma okwu Jotam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
37. Na mb͕e ahu ka Jehova malitere izite Rezin, bú eze Siria, na Peka nwa Remalaia, imegide Juda.
38. Jotam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà, n'obodo Devid nna-ya: Ehaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
About II. Ndi-Eze Chapter 15
Read II. Ndi-Eze Chapter 15 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi-Eze in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: II. Ndi-Eze
Chapter: 15
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ndi-Eze. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading II. Ndi-Eze Chapter 15 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is II. Ndi-Eze Chapter 15?
II. Ndi-Eze Chapter 15 is part of the Book of II. Ndi-Eze in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete II. Ndi-Eze Chapter 15 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from ii-ndi-eze
- II. Ndi-Eze Chapter 23
- II. Ndi-Eze Chapter 10
- II. Ndi-Eze Chapter 14
- II. Ndi-Eze Chapter 17
- II. Ndi-Eze Chapter 13
- II. Ndi-Eze Chapter 12
- II. Ndi-Eze Chapter 20