Read Nehemaia Chapter 4 Online
Read Nehemaia Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Nehemaia in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Nehemaia and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Nehemaia 4
Isi 4
1. O rue, mb͕e Sanbalat nuru na ayi onwe-ayi nālu mb͕idi, na iwe-ya di ọku, ewe kpasue ya iwe, o we chìa ndi-Ju ọchì.
2. O kwue okwu n'iru umu-nne-ya na usu-ndi-agha Sameria, si, Gini ka ndi-Ju ndia ndi nāta aru nēme? hà gārapuru onwe-ha ihe? hà gāchu àjà? hà gēme ka ọlu-ha gwusia n'otù ubọchi? hà gēsi n'obo ájá me ka nkume di adi ọzọ, ebe nkume ahu nile bu ihe akpọworo ọku?
3. Tobaia, bú onye Amon, nọ kwa n'akuku ya, ọ si, Ọzọ, mb͕idi nke ndi ahu nālu, ọ buru na nkita-ọhia arigo n'elu ya, o gētipú kwa mb͕idi-nkume-ha.
4. Nuru, Chineke-ayi; n'ihi na ayi bu ndi eledaworo anya: Gi me kwa ka ita-uta-ha laghachi n'isi-ha, Gi rara kwa ha nye ibu ihe-nluta-n'agha n'ala ndọta-n'agha:
5. ekpuchi-kwa-la ajọ omume-ha, ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie-ha n'iru Gi: n'ihi na ha akpasuwo Gi iwe n'iru ndi nālu mb͕idi.
6. Ayi we lua mb͕idi ahu; ewe lukọta mb͕idi nile rue nkera idi-elu-ya: n'ihi na ndi-Ju nwere obi ilu ọlu.
7. O rue na, mb͕e Sanbalat na Tobaia na ndi Arebia na ndi Amon na ndi Ashdod nuru na anāluzu mb͕idi Jerusalem nile, na amalitere ituchi ntipú-ya nile, iwe-ha we di ọku nke-uku;
8. ha we kekọta onwe-ha, ha nile n'otù, ibia ibuso Jerusalem agha, na ikpatara ya ihe-njehie.
9. Ayi we kpere Chineke-ayi, guzo ndi-nche megide ha ehihie na abali, n'ihi ha.
10. Juda we si, Ike nke ndi-ibu ebilatawo, ma nkpọnkpọ-ihe riri nne; ayi onwe-ayi apughi kwa ilu mb͕idi.
11. Ndi nākpab͕u ayi we si, Ha agaghi-ama, ha agaghi-ahu kwa, rue mb͕e ayi batara n'etiti ha, b͕ue ha, me ka ije-ozi ahu kwusi.
12. O rue, mb͕e ndi-Ju ndi bi n'akuku ha biara, na ha siri ayi ub͕ò iri site n'ebe ahu nile, Unu gēchigharikute ayi.
13. M'we guzo ndi-ayi n'ebe nile dikarisiri ala nke ebe di nime mb͕idi, n'ebe nile sara mbara, m'we guzo ndi-ayi dika ab͕uru nile ha si di, ha na mma-agha-ha, na ube-ha, na uta-ha.
14. M'we hu, bilie, si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Unu atula egwu ha: chetanu Onye-nwe-ayi, Nke di uku di kwa egwu, bu-kwa-ranu umu-nne-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na ndinyom-unu, na ulo-unu, agha.
15. O rue na, mb͕e ndi-iro-ayi nuru na ayi mara ya, na Chineke mebi-kwa-ra ndum-ọdu ha duritara onwe-ha, ayi nile we laghachi na mb͕idi, nwoke ọ bula ije ozi-ya.
16. O rue, site n'ubọchi ahu, na nkera ndi nējerem ozi nālu ọlu n'ije-ozi ahu, ma nkera nime ha nēji ube na ọta na uta na uwe-agha; ndi-isi nọ kwa n'azu ulo Juda nile.
17. Ndi nālu mb͕idi n'elu mb͕idi ahu na ndi nēbu ibu nēbo onwe-ha ibu, nwoke ọ bula nēwere otù aka-ya lu ọlu n'ije-ozi ahu, ma otù aka-ya nēji ihe-agha-ya;
18. ndi nālu mb͕idi kwa, nwoke ọ bula na mma-agha-ya ekeworo n'úkwù-ya nọ, ha we nālu mb͕idi otú a. Onye nāfù opì-ike nọ kwa n'akukum.
19. M'we si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Ije-ozi a riri nne, sa kwa mbara, ayi onwe-ayi ekewawo n'elu mb͕idi, ayi we nọ n'ebe di anya, otù nwoke n'aru nwa-nne-ya.
20. N'ebe ọ bula unu nuru olu opì-ike, n'ebe ahu ka unu gāchikọta onwe-unu n'ebe ayi nọ; Chineke-ayi gēburu ayi agha.
21. Ayi onwe-ayi we nālu ọlu n'ije-ozi ahu: ma nkera-ha nēji ube site na chi-ọbubọ rue mb͕e kpakpando putara.
22. Ọzọ, na mb͕e ahu m'siri ndi-ayi, Ka nwoke ọ bula na onye nējere ya ozi nọ ọnọdu-abali n'etiti Jerusalem, ka ha we buru ayi ndi-nche n'abali, je kwa ozi n'ehihie.
23. Ma ọ dighi onye ọ bula, ma ọ bu mu onwem, ma-ọbu umu-nnem, ma-ọbu ndi nējerem ozi, ma-ọbu ndikom nche ndi nēsom, ọ dighi onye n'etiti ayi nēyipu uwe-ya, nwoke ọ bula were ihe-agha-ya je miri.
About Nehemaia Chapter 4
Read Nehemaia Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Nehemaia in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Nehemaia
Chapter: 4
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Nehemaia. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Nehemaia Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Nehemaia Chapter 4?
Nehemaia Chapter 4 is part of the Book of Nehemaia in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Nehemaia Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
Explore More from nehemaia
- Nehemaia Chapter 1
- Nehemaia Chapter 9
- Nehemaia Chapter 2
- Nehemaia Chapter 5
- Nehemaia Chapter 7
- Nehemaia Chapter 8
- Nehemaia Chapter 13