Read II. Ndi Kọrint Chapter 2 Online
Read II. Ndi Kọrint Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ndi Kọrint and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
II. Ndi Kọrint 2
Isi 2
1. Ma ezuputaram onwem nka, na m'gaghi-abiakute unu ọzọ n'ihe-nwuta.
2. N'ihi na asi na mu onwem eme ka o wuta unu, ònye bu kwa onye gēme ka obi tọm utọ, ma-ọbughi onye ahu nke anēme ka o wuta ya site na mu onwem?
3. Ede-kwa-ram otù ihe nka n'akwukwọ, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta mb͕e m'biara n'aka ndi o kwesiri ka m'ṅuria ọṅu n'aru ha; ebe m'tukwasiworo obi n'ebe unu nile nọ, na ọṅùm bu ọṅù nke unu nile.
4. N'ihi na m'sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n'anya nke m'hubigara unu ókè kari.
5. Ma ọ buru na onye ọ bula emewo ka o wuta ayi, ọ bughi mu onwem, kama, n'otù akuku (ka m'ghara idọb͕u unu nke-uku) ọ bu unu nile ka o meworo ka o wuta.
6. O zuworo madu di otú a, bú nba nka nke ndi ka n'ọnu-ọgugu nime unu bara ya;
7. ya mere, kama ibara ya nba ọzọ anamachọ ka unu were amara b͕aghara ya kasi kwa ya obi, ka aghara iji ihe-nwuta nke nēwutabiga ya ókè loda madu di otú a n'uzọ ọ bula.
8. N'ihi nka ariọm unu ka unu me ka ihu-n'anya unu huru ya buru ihe di itukwasi obi.
9. N'ihi na ihe mere m'degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m'we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile.
10. Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n'ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n'ihi unu ka m'meworo ya n'iru Kraist;
11. ka Setan we ghara irib͕u ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa.
12. Ma mb͕e m'biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem,
13. mọm adighi nfé ma-ọli, n'ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia.
14. Ma ekele diri Chineke, Onye nēdughari ayi n'ọṅù-agha nime Kraist mb͕e nile, nēsite kwa n'aka-ayi egosi isìsì nke ọmuma-Ya n'ebe nile.
15. N'ihi na ayi bu isìsì utọ nke Kraist n'ebe Chineke nọ, n'etiti ndi anāzọputa, na n'etiti ndi nāla n'iyì;
16. n'ebe ndia nọ ọ bu isìsì nke sitere n'ọnwu we dubà n'ọnwu; n'ebe ndi ahu anāzọputa nọ ọ bu isìsì nke sitere na ndu we dubà na ndu. Ma ònye ruru ime ihe ndia?
17. N'ihi na ayi adighi ka ọra madu, ndi were ihe nādighi nma nētigwa n'okwu Chineke: kama dika ndi sitere n'idi-ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bu n'iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu.
About II. Ndi Kọrint Chapter 2
Read II. Ndi Kọrint Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: II. Ndi Kọrint
Chapter: 2
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ndi Kọrint. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
- 📱 Hindi Android Bible App
- 📱 Hindi Christian Songs from waytochurch
- 📖 Read on Malayalam Christian Songs – madely
Continue Reading the Bible
Continue reading II. Ndi Kọrint Chapter 2 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is II. Ndi Kọrint Chapter 2?
II. Ndi Kọrint Chapter 2 is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete II. Ndi Kọrint Chapter 2 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 4
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 6
- Nkpugh Chapter 7
Explore More from ii-ndi-kọrint
- II. Ndi Kọrint Chapter 9
- II. Ndi Kọrint Chapter 3
- II. Ndi Kọrint Chapter 8
- II. Ndi Kọrint Chapter 10
- II. Ndi Kọrint Chapter 12
- II. Ndi Kọrint Chapter 1
- II. Ndi Kọrint Chapter 5