Ndi-Hibru Chapter 13

For English

Read Ndi-Hibru Chapter 13 Online

Read Ndi-Hibru Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Hibru and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ndi-Hibru 13

Isi 13

1. Ka ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ nādigide.

2. Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.

3. Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru.

4. Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.

5. Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.

6. Ya mere ayi were obi-ike si, Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka; Gini ka madu gēmem?

7. Nēchetanu ndi-isi-unu, bú madu ndi gwara unu okwu Chineke; nēkiri-kwa-nu ọpupu nke ibi-obi-ha, nēṅomi-kwa-nu okwukwe-ha.

8. Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi.

9. Unu ekwela ka ewere ozizí di iche iche nke si kwa n'ebe ọzọ puta duhie unu: n'ihi na ọ di nma ka ewere amara me ka obi-unu guzosie ike; ka aghara iwere ihe-oriri, nke ọ dighi mb͕e ha bara ndi jeghariri nime ha urù.

10. Ayi nwere ebe-ichu-àjà, nke ndi nēkpe ekpere n'ulo-ikwū Chineke nēnweghi ike iri ihe si nime ya puta.

11. N'ihi na ozu anu nile nke anēwebata ọbara-ha n'ebe nsọ site n'aka onye-isi-nchu-àjà dika àjà achuru bayere nmehie, anērechapu ozu ahu ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū.

12. N'ihi nka Jisus, ka O we site n'ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n'azu ọnu-uzọ-ama nke obodo.

13. Ya mere, ka ayi pukuru Ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya.

14. N'ihi na ayi enweghi obodo n'ebe a nke nādigide, kama ayi nāchọ obodo ahu nke gaje ibia.

15. Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.

16. Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.

17. Nēkweyenu ndi-isi-unu, nēdo-kwa-nu onwe-unu n'okpuru ha: n'ihi na ndi ahu nāmu anya n'ihi nkpuru-obi-unu, dika ndi gāza ajuju bayere unu: ka ha we were ọṅù me nka, ghara isu udè: n'ihi na nka gābu ihe nābaghi unu urù.

18. Nēkpenu ekpere bayere ayi: n'ihi na emere ka ayi kweye na ayi nwere akọ-na-uche ọma, ebe ayi nāchọ ibi obi nke-ọma n'ihe nile.

19. Ma anamariọbiga unu ókè kari ime nka, ka ewe werem nyeghachi unu ọsọsọ kari.

20. Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus,

21. Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

22. Ma ariọm unu, umu-nnam, nānagidenu okwu aririọ a: n'ihi na anamewere okwu ole-na-ole degara unu akwukwọ-ozi.

23. Maranu na arapuwo nwa-nna-ayi Timọti ka ọ la; ọ buru kwa na ọ gābia na mb͕e ntà, mu na Ya gāhu unu anya.

24. Kelenu ndi-isi-unu nile na ndi nsọ nile. Ndi Itali nēkele unu.

25. Ka amara diyere unu nile. Amen.

About Ndi-Hibru Chapter 13

Read Ndi-Hibru Chapter 13 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ndi-Hibru
Chapter: 13
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Hibru. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ndi-Hibru Chapter 13 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ndi-Hibru Chapter 13?

Ndi-Hibru Chapter 13 is part of the Book of Ndi-Hibru in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ndi-Hibru Chapter 13 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 7

Explore More from ndi-hibru

  1. Ndi-Hibru Chapter 12
  2. Ndi-Hibru Chapter 11
  3. Ndi-Hibru Chapter 7
  4. Ndi-Hibru Chapter 5
  5. Ndi-Hibru Chapter 6
  6. Ndi-Hibru Chapter 10
  7. Ndi-Hibru Chapter 8

Related Chapters & Readings

  1. Joshua Chapter 22
  2. I. Ndi Kọrint Chapter 11
  3. Abù Ọma Chapter 54
  4. Luk Chapter 2
  5. Matiu Chapter 9
  6. Ezra Chapter 3
  7. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 26
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *