Jenesis Chapter 32

For English

Read Jenesis Chapter 32 Online

Read Jenesis Chapter 32 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Jenesis and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Jenesis 32

Isi 32

1. Ma Jekob jere n'uzọ-ya, ndi-mọ-ozi nke Chineke we zute ya.

2. mb͕e ọ huru ha Jekob siri, Ọmuma-ulo-ikwū Chineke ka nka bu: ọ we kpọ aha ebe ahu Mahanaim.

3. Jekob we zie ndi-ozi n'iru ya jekuru Isọ nwa-nne-ya rue ala Sia, bú ọhia Edom.

4. Ọ nye ha iwu, si Otú a ka unu gāsi onye-nwem Isọ; Otú a ka orù-gi Jekob siri, N'ulo Leban ka m'nọworo dika ọbìa, nọgide rue ub͕u a:

5. enwekwara m ehi, na inyinya-ibu, na ìgwè ewu na aturu, na orù-ndikom, na ndinyom nēje ozi: m'we zìe igosi onye-nwem, ihuta amara n'iru gi.

6. Ndi-ozi ahu we laghachikute Jekob, si, Ayi biakutere nwa-nne-gi Isọ, ọzọ kwa, ọ nābia izute gi, ya na nnù ndikom.

7. Jekob we tua egwu nke-uku, obi lọbakwara ya miri: ọ we kera ndi ya na ha nọ, na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na kamel, n'-omuma-ulo-ikwū abua;

8. ọ si, Ọ buru na Isọ abiarue otù ọmuma-ulo-ikwū, tib͕ue ya, ọmuma-ulo-ikwū nke fọduru gābu ndi b͕apuru ab͕apu.

9. Jekob we si, Chineke nke nnam Abraham, na Chineke nke nnam Aisak, Jehova, Nke nāsim, Laghachi n'ala-gi, laghachikuru umu-nna-gi, M'gēme kwa gi nma:

10. ekwe-sighm ebere nile, na ezi-okwu nile, nke I meworo orù-Gi: n'ihi na nkpa-n'akam ka m'were gabiga Jọdan nka; ma ub͕u a aghọwom ọmuma-ulo-ikwū abua.

11. Biko, naputam n'aka nwa-nnem, n'aka Isọ: n'ihi na mu onwem nātu egwu ya, ma eleghi anya ọ gābia, tib͕ue m, tib͕ukwa nne tinyere umu-ya.

12. Ma Gi onwe-gi siri, Aghaghm ime gi nma, M'gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájá nke oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu n'ihi ọtutu ọ di.

13. O we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu abali ahu; o were kwa ufọdu nime ihe batara n'aka-ya ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma inye Isọ nwa-nne-ya;

14. ọgu nne-ewu iri na orú nkpi, ọgu nne-aturu iri na orú ebulu,

15. orú camel na iri nēnye umu ara na umu-ha, ọgu nne-ehi abua na oké-ehi iri, orú nne-inyinya-ibu na umu-inyinya-ibu iri.

16. Ọ nye ha n'aka ndi-orù-ya, n'ìgwè ichè; ọ si ndi-orù-ya, Gabiganu n'irum, me kwa mbara n'etiti ìgwè na ìgwè.

17. Ọ we nye onye mbu iwu, si, Mb͕e Isọ, bú nwa-nnem, gēzute gi, jua gi, si, Ònye nwe gi? òle ebe i nēje kwa? ọ̀ bu kwa onye nwe ihe ndia di n'iru gi?

18. I gāsi kwa, Orù-gi Jekob nwe ha; onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu ezitere onye-nwem Isọ: ma, le, ya onwe-ya nọ kwa n'azu ayi.

19. Ọ nye kwa onye nke-abua, na onye nke-atọ, na ndi nile nēso ìgwè nile, iwu, si, Dika okwu a si di ka unu gāgwa Isọ, mb͕e unu huru ya;

20. unu gāsi kwa, Ọzọ, le, orù-gi Jekob nọ n'azu ayi. N'ihi na ọ siri, Ka m'were onyinye-inata-iru-ọma nka nke nāga n'irum kpuchie anya-ya, emesia m'gāhu iru-ya; eleghi anya ọ gāhum iru-ọma.

21. Onyinye ahu inata iru-ọma we gabiga n'iru ya: ma ya onwe-ya nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū-ya abali ahu.

22. Ọ we bilie n'abali ahu, chiri nwunye-ya abua, na ndinyom abua nējere ya ozi, na umu-ya iri na otù, gabiga ngabiga-miri Jakob.

23. O we chiri ha, me ka ha gabiga miri-iyi ahu, me kwa ka ihe o nwere gabiga.

24. O we fọdu Jekob nání ya; otú nwoke we so ya nāb͕a nb͕a rue chi-ọbubọ.

25. Mb͕e ọ huru na ọ pughi ijide ya, o metu isi-ọsu-ya; isi-ọsu Jekob we pua n'ọnọdu-ya, mb͕e ya na ya nab͕a nb͕a.

26. Ọ si Gham ka m'la, n'ihi na chi nābọ. Ọ si, M'gaghi-agha gi ka i la, ma ọ buru na i gọzighim.

27. Ọ si ya, Gini bu aha-gi? Ọ si, Jekob.

28. Ọ si, Ọ bughi Jekob ka agākpọ aha-gi ọzọ, kama Israel: n'ihi na i jisiwo ike n'ebe Chineke nọ na n'ebe madu nọ, i we nwe ike.

29. Jekob we jua ya, si Biko, gosim aha-gi. Ọ si N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham? Ọ gọzie ya n'ebe ahu.

30. Jekob we kpọ aha ebe ahu Peniel: n'ihi na ahuwom Chineke iru na iru, ka o kwuru, ewe naputa ndum.

31. Anyanwu we wa-kwasi ya mb͕e ọ gabigara Penuel, ya onwe-ya we nēje nsukwara-achi.

32. N'ihi nka umu Israel adighi-eri akwara nke ọkpukpu-ukwu nke di n'isi-ọsu, rue ta: n'ihi na o meturu isi-ọsu Jekob n'akwara nke ọkpukpu-ukwu.

About Jenesis Chapter 32

Read Jenesis Chapter 32 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Jenesis in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Jenesis
Chapter: 32
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Jenesis. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Jenesis Chapter 32 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Jenesis Chapter 32?

Jenesis Chapter 32 is part of the Book of Jenesis in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Jenesis Chapter 32 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 7
  6. Esta Chapter 4
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Jenesis

  1. Jenesis Chapter 35
  2. Jenesis Chapter 21
  3. Jenesis Chapter 28
  4. Jenesis Chapter 2
  5. Jenesis Chapter 22
  6. Jenesis Chapter 39
  7. Jenesis Chapter 44

Related Chapters & Readings

  1. Zekaraia Chapter 4
  2. Aisaia Chapter 50
  3. Hosea Chapter 12
  4. II. Ndi-Eze Chapter 10
  5. Hagai Chapter 1
  6. Abù Ọma Chapter 140
  7. Abù Ọma Chapter 123
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *