Ezikiel Chapter 18

For English

Read Ezikiel Chapter 18 Online

Read Ezikiel Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ezikiel and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ezikiel 18

Isi 18

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Gini ka unu nēkwu, na unu onwe-unu nātu ilu a bayere ala Israel, si, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì?

3. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ay Jehova puta), n'ezie ọ gaghi-abu kwa ọlu-unu ọzọ itu ilu a n'Israel.

4. Le, nkpuru-obi nile, Mu nwe ha; dika nkpuru-obi nna si di, otú a ka nkpuru-obi nwa-ya di kwa, Mu nwe ha; nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu.

5. Ma onye ọ bula, mb͕e ọ bu onye ezi omume, nke nēme ihe ekpere n'ikpe na ezi omume,

6. asi na ọ bu onye nērighi ihe n'ugwu, nke nēwelighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, nke nēmerughi nwunye madu-ibe-ya, nke nādighi-abia nso nwanyi di na nsọ;

7. nke nādighi-eme onye ọ bula ihe-ike, nke nēnyeghachi onye-ugwọ ihe-ibe-ya, nke nādighi-apunara madu ihe n'ike, nke nēnye onye-agu nri-ya, nke nēkpuchi onye-ọtọ uwe;

8. nke nādighēnye ego ka ọ nara uma, nke nādighi-anara ọmuru-nwa, nke nēsi n'ajọ omume seghachi aka-ya, nke nēme ihe ekpere n'ezi-okwu n'etiti madu na madu,

9. nke nējeghari n'ukpurum nile, nke debeworo ikpém nile, ime ihe n'ezi-okwu; onye ezi omume ka onye ahu bu, ọ ghaghi idi ndu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

10. Asi na ọ muwo nwa nke bu onye nke nēme ihe-ike, onye nāwusi ọbara, nke nēme otù ihe ọ bula n'ihe ndia,

11. ma ezi ihe ndia nile ka ọ nēmeghi, n'ihi na ọbuná n'ugwu ka o riworo ihe, ọ bu kwa nwunye madu-ibe-ya ka o meruworo,

12. onye ewedara n'ala na ob͕eye ka o meworo ihe-ike, ọ punarawo madu ihe n'ike, ọ dighi-enyeghachi ihe-ibe, ọ bu kwa arusi nile ka o weliworo anya-ya abua le, ihe-árú ka o meworo,

13. n'uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n'isi.

14. Ma, le, asi na ọ muwo nwa, o we hu nmehie nile nke nna-ya, nke o meworo, o we tua egwu, ghara ime ihe dika ihe ndia,

15. o righi ihe n'elu ugwu, o welighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, o merughi nwunye madu-ibe-ya,

16. o meghi onye ọ bula ihe-ike, ọ naraghi ihe-ibe, ọ punaraghi madu ihe n'ike, nri-ya ka o nyeworo onye-agu, onye-ọtọ ka o kpuchiworo uwe,

17. o siwo n'aru onye ewedara n'ala seghachi aka-ya, uma na ọmuru-nwa ka ọ nānaraghi, ikpém nile ka o meworo, n'ukpurum nile ka o jeghariworo; onye ahu agaghi-anwu n'ihi ajọ omume nke nna-ya, ọ ghaghi idi ndu.

18. Ma nna-ya, n'ihi na ọ meb͕uru nke-uku, punara nwa-nne-ya ihe n'ike, me ihe nke nādighi nma n'etiti ndi-ya, le, ọ gānwu kwa n'ajọ omume-ya.

19. Ma unu asiwo, Gini mere nwa nējighi ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya? Mb͕e nwa ahu meworo ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, debe ukpurum nile, me ha, ọ ghaghi idi ndu.

20. Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya.

21. Ma onye nēmebi iwu, mb͕e ọ gēsi na nmehie-ya nile nke o meworo chigharia, debe ukpurum nile, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.

22. Njehie-ya nile nke o meworo, agaghi-echeta ha megide ya: n'ezi omume-ya nke o meworo ka ọ gādi ndu.

23. Ọ̀ nātọm utọ ma-ọli, bú ọnwu nke onye nēmebi iwu? (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ̀ dighi-atọm utọ mb͕e o si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu?

24. ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.

25. Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Biko nurunu, ulo Israel: Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule?

26. Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, nwua n'ihi ha, n'ajọ omume-ya nke o meworo ka ọ gānwu.

27. Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya nke o meworo chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ya onwe-ya gēme ka nkpuru-obi-ya di ndu.

28. O we hu, si na njehie-ya nile o meworo; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.

29. Ma ulo Israel asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. Ọ̀ bu uzọm ka anādighi-atule, ulo Israel? ọ̀ bughi uzọ nile nke unu ka anādighi-atule?

30. N'ihi nka ka M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. Latanu, sinu na njehie nile unu chigharia; ajọ omume ewe ghara ighọrọ unu ihe-isu-ngọngọ.

31. Tupunu n'aru unu njehie nile unu nke unu jehieworo nime ha; mere onwe-unu obi ọhu na mọ ọhu: ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?

32. N'ihi na ọnwu nke onye nānwu anwu adighi-atọm utọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ya bu chigharianu, we di ndu.

About Ezikiel Chapter 18

Read Ezikiel Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ezikiel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ezikiel
Chapter: 18
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ezikiel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ezikiel Chapter 18 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ezikiel Chapter 18?

Ezikiel Chapter 18 is part of the Book of Ezikiel in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ezikiel Chapter 18 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Esta Chapter 1
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Esta Chapter 5
  5. Esta Chapter 4
  6. Esta Chapter 7
  7. Ilu Chapter 1

Explore More from Ezikiel

  1. Ezikiel Chapter 6
  2. Ezikiel Chapter 11
  3. Ezikiel Chapter 36
  4. Ezikiel Chapter 17
  5. Ezikiel Chapter 9
  6. Ezikiel Chapter 28
  7. Ezikiel Chapter 2

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 28
  2. Aisaia Chapter 1
  3. Ezikiel Chapter 45
  4. Eklisiastis Chapter 5
  5. Joel Chapter 2
  6. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 26
  7. Ezikiel Chapter 20
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *