I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4

For English

Read I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4 Online

Read I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Tesalọnaika in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Ndi Tesalọnaika and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

I. Ndi Tesalọnaika 4

Isi 4

1. Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n'aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari.

2. N'ihi na unu matara iwu nile ayi nyere unu site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus.

3. N'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko;

4. ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n'odido-nsọ na nsọpuru,

5. ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke;

6. ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.

7. N'ihi na Chineke akpọghi ayi ka ayi buru ndi nādighi ọcha, kama n'odido-nsọ.

8. Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.

9. Ma ọ dighi unu nkpà ka madu degara unu akwukwọ bayere ihunanya n'ebe umu-nna-unu nọ: n'ihi na unu onwe-unu bu ndi Chineke zíworo ihurita ibe-unu n'anya;

10. n'ihi na unu nēme ya n'ezie n'ebe umu-nna-ayi nile ndi bi na Masedọnia dum nọ. Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari;

11. ka unu nējisi kwa ike inọdu nwayọ, na ime ihe nile nke aka unu, na iji aka-unu lu ọlu, dika ayi nyere unu iwu;

12. ka unu we nējeghari dika o kwesiri unu n'ebe ha nọ, bú ndi nọ n'èzí, ka ihe ọ bula ghara kwa ikpa unu.

13. Ma ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere ndi nāda n'ura ọnwu, umu-nna-ayi; ka o we ghara iwuta unu, ọbuná dika ọ nēwuta ndi fọduru, ndi nēnweghi olile-anya.

14. N'ihi na asi na ayi kwere na Jisus nwuru si kwa n'ọnwu bilie, otú a ndi emere ka ha da n'ura ọnwu site n'aka Jisus, ọ bu ndia ka Chineke gēkuru ka ha so Ya bia.

15. N'ihi na nka ka ayi nāgwa unu n'okwu Onye-nwe-ayi, na ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi, na ayi agaghi-eburu ndi dara n'ura onwu uzọ ma-ọli.

16. N'ihi na Onye-nwe-ayi onwe-ya gēwere oké ikpọ-òkù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opì nke Chineke, si n'elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n'ọnwu bilie:

17. mb͕e ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n'igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mb͕e nile.

18. Ya mere werenu okwu ndia nākasirita ibe-unu obi.

About I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4

Read I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Tesalọnaika in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: I. Ndi Tesalọnaika
Chapter: 4
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Ndi Tesalọnaika. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4?

I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4 is part of the Book of I. Ndi Tesalọnaika in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete I. Ndi Tesalọnaika Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 7

Explore More from i-ndi-tesalọnaika

  1. I. Ndi Tesalọnaika Chapter 2
  2. I. Ndi Tesalọnaika Chapter 3
  3. I. Ndi Tesalọnaika Chapter 1
  4. I. Ndi Tesalọnaika Chapter 5

Related Chapters & Readings

  1. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 7
  2. Nkpugh Chapter 19
  3. Joshua Chapter 17
  4. Job Chapter 23
  5. Joel Chapter 1
  6. I. Ihe Emere Chapter 25
  7. II. Samuel Chapter 20
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *