Read Ndi-Hibru Chapter 8 Online
Read Ndi-Hibru Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Hibru and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ndi-Hibru 8
Isi 8
1. Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,
2. Onye nēfè òfùfè n'ebe nsọ ahu, na n'ezi ulo-ikwū ahu, nke Onye-nwe-ayi mara, ọ bughi madu.
3. N'ihi na anēdo onye-isi-nchu-àjà ọ bula iche onyinye na àjà di iche iche n'iru Chineke: o sitere na nka di nkpà ka Onye-isi-nchu-àjà nka nwe kwa ihe iche n'iru Chineke.
4. Ya mere ọ buru na Ọ nọ n'uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n'iru Chineke dika iwu si di nọ:
5. ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n'elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n'ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n'ugwu.
6. Ma otú ọ di, O ruwo n'ifè-òfùfè nke ka nma, n'uzọ ra otú Ọ bu kwa onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma, bú ọb͕ub͕a-ndu nke enyeworo n'iwu n'elu nkwa ufọdu ka nma.
7. N'ihi na asi na ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu adighi ita uta, agaghi-achọwori ebe nye ọb͕ub͕a-ndu nke-abua.
8. N'ihi na mb͕e Ọ nāta ha uta, Ọ si, Le, ubọchi nābia, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu;
9. Ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara N'ubọchi M'jidere ha n'aka isi n'ala Ijipt duputa ha; N'ihi na ha onwe-ha anọgideghi n'ọb͕ub͕a-ndum, Mu onwem lefukwara ha anya, ka Onye-nwe-ayi kwuru,
10. N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a Mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M'gētiye iwum n'uche-ha, Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ: M'gābu-kwa-ra ha Chineke, Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:
11. Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya, Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi: N'ihi na ha nile gāmatam, Site n'onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha.
12. N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere, M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.
13. Mb͕e Ọ nāsi, Ọb͕ub͕a-ndu ọhu, O mewo nke-mbu ka ọ buru ihe ochie. Ma ihe nēme ochie, nke nāka kwa nká, ga-apu-n'anya nso.
About Ndi-Hibru Chapter 8
Read Ndi-Hibru Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ndi-Hibru
Chapter: 8
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Hibru. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ndi-Hibru Chapter 8 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ndi-Hibru Chapter 8?
Ndi-Hibru Chapter 8 is part of the Book of Ndi-Hibru in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ndi-Hibru Chapter 8 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6
Explore More from ndi-hibru
- Ndi-Hibru Chapter 12
- Ndi-Hibru Chapter 13
- Ndi-Hibru Chapter 2
- Ndi-Hibru Chapter 5
- Ndi-Hibru Chapter 6
- Ndi-Hibru Chapter 3
- Ndi-Hibru Chapter 9