Read Ndi-Hibru Chapter 5 Online
Read Ndi-Hibru Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Hibru and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ndi-Hibru 5
Isi 5
1. N'ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, esi n'etiti madu weputa ya, ọ bu n'ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n'ihe diri Chineke, ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n'ihi nmehie n'iru Chineke:
2. ọ bu kwa onye puru iwere nwayọ nēmeso ndi nāmaghi ihe ndi nējehie kwa ejehie, n'ihi na adighi-ike di kwa ya onwe-ya gburugburu;
3. n'ihi nka o ji kwa ugwọ iche àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, dika ọ nēchere ndi Israel, otú ahu ọ nēche-kwa-ra onwe-ya.
4. Ọ dighi kwa onye ọ bula nānara nsọpuru a n'onwe-ya, kama mb͕e Chineke nākpọ ya, ọbuná dika Ọ kpọ-kwa-ra Eron.
5. Otú a Kraist enyeghi kwa Onwe-ya otuto ka ewe me Ya onye-isi-nchu-àjà, kama ọ bu Onye siri Ya, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta:
6. dika O si kwu kwa n'ebe di iche, si, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di.
7. Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,
8. ọ bu ezie na Ọ bu Ọkpara, ma Ọ mutara iṅa-nti-Ya site n'ahuhu nile Ọ huru;
9. ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi;
10. Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.
11. Onye okwu ayi nwere ikwu bayere ya di uku, di kwa ike isughari asusu, ebe unu ghọworo ndi nwere nti ike.
12. N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike.
13. N'ihi na onye ọ bula nke nēketa miri-ara bu onye akānwaghi ya n'okwu ezi omume; n'ihi na ọ bu nwa ọhu.
14. Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n'ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.
About Ndi-Hibru Chapter 5
Read Ndi-Hibru Chapter 5 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ndi-Hibru
Chapter: 5
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Hibru. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ndi-Hibru Chapter 5 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ndi-Hibru Chapter 5?
Ndi-Hibru Chapter 5 is part of the Book of Ndi-Hibru in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ndi-Hibru Chapter 5 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Nkpugh Chapter 4
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 6
- Nkpugh Chapter 7
Explore More from ndi-hibru
- Ndi-Hibru Chapter 1
- Ndi-Hibru Chapter 2
- Ndi-Hibru Chapter 6
- Ndi-Hibru Chapter 9
- Ndi-Hibru Chapter 3
- Ndi-Hibru Chapter 8
- Ndi-Hibru Chapter 10